Iyi akpụụkwụ na-acha uhie na ajụjụ ndị ọzọ banyere ndị Popu

A na-egosipụta uwe Popu ọhụrụ a ga-ahọpụta na windo nke onye na-akwa akwa ụka n'Itali Gammarelli na Maachị 4, 2013 na Rom.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Uwe ndị Popu
    • Onye dere ya, Andrew Webb
    • Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
    • Onye dere ya, Additional reporting by David Willey
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Rome
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Ụka Katọlik ahọpụtala onyeisi ya n'ihi ọnwụ Popu Francis.

Dịka Popu ọhụrụ bụ Popu Leo were oche dịka onyeisi ụka Katọlik n'ụwa niile, akụkọ na-efegharị na-ajụkwa ma Popu ọhụrụ ọ ga-aga n'ihu n'ụzọ Popu Francis nke na-eme ihe n'ụzọ obi umeala karịa ndị bu ya ụzọ, na ịjụ ibe ndụ okomoko nke ọtụtụ ndị popu ọzọ.

Gịnị ka Popu na-eme?

Popu Francis na-efe aka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Popu Francis

Popu bụ onye ndu ime mmuọ nke ọnụ ọgụgụ mmadụ ruru otu nde na narị puku anọ ndị ụka katọlik n'ụwa niile.

Ndị ụka katolik na-ahụta ya dịka onye nọchiri anya Saint Peter, otu n'ime ndị ndu mbụ nke Nzukọ-nsọ ​​nke Ndị Kraịst.

N'okwukwe Ndị Kraịst, Jizọs Kraịst bụ Ọkpara Chineke na St Pita bụ otu n'ime ndịozi iri na abụọ ya - maọbụ ndị na-eso ụzọ ya.

Ndị ụka katọlik kwenyere na nke jikọrọ Popu na Jizọs.

Popu na-ahụ maka emume okpukperechi niile nke ụka n'ime Saint Peter, gụnyere ekeresimesi na Ista.

Popu Francis na-efere ndị ụka gbakọrọ n'ogige St. Peter aka n'oge ngọzi Angelus nke ụbọchị Sọnde n'ụbọchị ndị ntorobịa n'ụwa niile na Nọvemba 24, 2024 n'obodo Vatịkan.

Ebe foto si, Vatican Media

Nkọwa foto, Mgbe ọbụla a họpụtachara popu ọhụrụ, ha na-apụta n'ihu ọha na mbara ihu St Peter's Basịlịka dị n'obodo "Vatican City" iji kelee igwe mmadụ na inye ngọzi.

Popu ọhụrụ na-apụta na mbara ebe a nọrọ họpụta ya dịka Popu ebe ahụ ka ọ ga-anọ kwupụta ozi "Urbi Et Orbi" nke pụtara "nye obodo na ụwa" ya na ngọzị Popu na-enye ụbọchị emume pụrụiche.

Popu nwere obere ndị ọrụ na-esiri ya nri na ndị na-ehichara ya ụlọ. O nwekwara ndị na-edere ya ihe ọ na-ekwu.

Otu n'ime ọrụ popu bụ iso ndị bishọp ya karịrị 5,000 si gburugburu ụwa na-ezute ma ọ dịkarịa ala otu ugboro kwa afọ ise - ihe dịka 1,000 kwa afọ, maọbụ 20 n'izu.

Ị ga njem nleta na mba ofesi sokwa n'ọrụ Popu.

Ndị popu a na-alụ nwaanyị?

Enwebugo ndị popu lụrụ nwaanyị n'oge gara aga - St Peter bụ popu nke mbụ nwere nwunye mana ugbua, ọ dịghị ka a ga-eme onye lụrụ nwaanyị popu.

Akụkọ ihe mere eme nke ndị popu oge mbụ bụ isi iyi nke nnukwu arụmụka agụmakwụkwọ, ma amabeghị mmadụ ole, dịka St Peter, lụrụ nwunye tupu ha aghọọ popu.

Ihe oyiyi St Peter na-ele igwe mmadụ anya na Vatịkan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, St Peter, onye akpụrụ oyiyi ya na Vatịkan, bụ nwoke lụrụ nwanyị
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

E chere na ọ bụ Popu Hormisdas (514-23) bụ nna Popu Silverius bụ onye nnọchiri ya, na Popu Adrian II (867–872) ekwuru na ọ kpọọrọ nwunye ya na nwa ya nwanyị banye n'obí Lateran.

Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme kwenyere John XVII (1003) na Clement IV (1265–68) bụ ụmụ nwoke lụrụ nwaanyị mgbe ha bụrụ Popu.

Nwoke lụrụ nwanyị o nwereike ịghọ popu n'ọdịnihu dị nso? Eleghị anya.

Ka osina dị, nwoke ọ bụla e mere baptizim na Katọlik nwereike ịrụ ọrụ ahụ, mana popu ọ bụla kemgbe Urban VI na 1378 (ngụkọta 64) ka esi n'ọkwa ndị Kadịnal na-ahọpụta.

Ọ dịghị onye ọ bụla n'ime ndị na-ahọpụta ndị Kadịnal ga-abụ popu ugbu a lụrụ nwunye, iwu ụka Katọlik bụ na ndị ụkọchukwu ga-abụ ndị na-alụbeghị nwunye mgbe echiri ha echichi ụkọchukwu.

Ụka Katọlik kwenyere na ndị ụkọchukwu agaghị alụ nwaanyị enwezuga ụmụ nwoke lụrụ nwunye bụ ndị ụkọchukwu Anglịkan mgbanwere ụka ma bata Katọlik na ndị lụrụ di na nwunye n'okpukperechi Katọlik ọwụwa anyanwụ, mana ha enweghị ike ịbụ kadịnal.

Popu enwere ụgwọ ọnwa?

Akụkọ kwuru na Popu Francis nyefere ụgwọ ọnwa ya maka ọrụ ebere.

Francis jụkwara ụfọdụ ihe ndị so ụlọọrụ ya wee họrọ ibi n'ụlọ ndị ọbịa dị na Vatịkan, Casa Santa Marta, kama ịnọ n'ụlọ ndị popu mara mma.

Popu Benedict XVI, Kadịnal Joseph Ratzinger nke Jamini nọ na-efere ndị mmadụ aka na mbara St. Peter's Basịlịka dị na Vatịkan oge ndị kadịnal họpụtara ya dịka popu n'Eprel 19, 2005.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Popu Benedict XVI bụ onyeisi ụka Katọlik site na 2005 ruo mgbe ọ gbara arụkwaghịm na 2013.

Benedict XVI, mere nzọụkwụ pụrụ iche nke ịla ezumike nká na 2013, na-ekwu na ọ bụ maka ahụike mana ụlọ mgbasa ozi la Stampa kwuru na ọ na-enweta ụgwọ ezumike nka .

Ogologo oge ole ka popu na-anọ ije ozi ya?

Ọtụtụ popu na-ejegịde ozi ruo n'ọnwụ dịka Popu Francis, bụ onye malitere n'afọ 2013 ruo n'afọ 2025.

Enwebeghị popu ọzọ gbara arụkwaghị kemgbe Gregory XII na 1415 na Benedict XVI bụ onye mbụ jiri aka ya gbaa arụkwaghị kemgbe oge Celestine V na 1294.

Ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme arụọla ụka popu ole gbara arụkwaghị.

  • Pontian na 235
  • Silverius na 537
  • John XVIII na 1009
  • Benedict IX na 1045
  • Celestine V na 1294
  • Gregory XII (na 1415)

Kedu ka ị ga-esi bụrụ popu?

Lee ndị nwereike ịbụ Popu dịka iwu canon siri dị:

  • "Nwoke Katọlik ọ bụla e mere baptizim na-eji uche eme ihe,
  • "Ọ bụ ezie na o ruola ihe karịrị afọ 500 kemgbe a họpụtara onye na-abụghị kadinal dịka popu, ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme nyere ohere ka a họrọ ndị ụkọchukwu ndị ọzọ maọbụ ndị nkịtị.
  • "Ọ bụrụ na onye a họpụtara abụbeghị onye bishọp, a ga-emerịrị ya bishọp ozugbo tupu ọ were ọkwa popu."
Ndị Kadịnal na-aga Mass ikpeazụ tupu ntuliaka ịhọpụta popu amalite n'ọgbakọ na Saint Peter's Basịlịka n'Eprel 18, 2005 n'Obodo Vatịkan.

Ebe foto si, Mimmo Chianura-Pool

Nkọwa foto, Ndị Kadịnal na-erubeghị afọ 80 ga-ezukọ ịhọrọ pontiff ọhụrụ n'oge Conclave e mere na nzuzo na Sistine Chapel.

Naanị ndị kadịnal erubeghị afọ 80 bụ ndị ga-esonye n'ịhọpụta onyeisi ụka Katọlik ọhụrụ bụ Popu.

Gịnị mere popu ji eyi akpụụkwụ uhie?

N'okwukwe Katọlik, ụcha uhie na-anọchi anya okwukwe na ahụhụ nke Kraịst - ahụhụ, njide, ikpe, na ịkpọgide n'obe Jizọs dịka e gosipụtara na-agba ọhụrụ.

Popu Benedict XVI na Popu ndị ọzọ bu ya ụzọ sonyere omenala iyi akpụụkwụ uhie.

Akpụụkwụ nke Popu Benedict XVI na-eyi
Nkọwa foto, Akpụụkwụ na-acha uhie uhie nke Benedict XVI bụ ihe a ma ama n'ọchịchị popu ya, nke a na-eyi dịka akara nke ike na ọkwa.

Mana, dịka popu, Francis họọrọ iyi akpụụkwụ ojii - ndị mmadụ na-ahụta ya dịka ọchịchọ ya.

Eyi nyere Popu Francis akpụụkwụ ojii n'ụkwụ ya mgbe ahụ ya dina ka ndị mmadụ bịa hụ ya.

Ụkwụ Popu Francis na akpụụkwụ ojii mgbe o dina ka ndị mmadụ bịa hụ ya.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Akpụụkwụ ojii eyi nyere n'ụkwụ Popu Francis mgbe ahụ ya dina ka ndị mmadụ bịa hụ ya.

A kọrọ na Popu John Paul II na-eyi akpụụkwụ "burgundy" mgbe ụfọdụ mana ụlọ mgbasa ozi US Esquire kwuru na o yikwara "akpụụkwụ na-acha aja aja".

Gịnị mere ụka Katọlik ji nwee popu?

Ndị Katọlik na-ele Popu anya dịka onye nọchiri St Peter, otu n'ime ndị na-eso ụzọ Jizọs.

A na-ahụta Popu dịka onye ndu, yana ntọala nke ụka Katọlik.

Ọ na-enye ndị Katọlik isi ihe ma na-adụ ọdụ ka ha ga-esi eme maka ihe ịma aka na nsogbu nke ndụ - nke ukwu na nke nta.

Ọ na-enyekwara ndị isi ụka obere aka ịchọta ntụzịaka ha ga-esi duru obodo ha banye.

Ndị na-efe ofufe na-esi na gburugburu ụwa gaa Vatịkan ka ha nụ ka Popu na-aka ụka n'ogige St Peter.

Njem nleta ya na mba ndị ọzọ na-adọta igwe mmadụ iji egosi mkpa popu dị n'ụwa niile.