Lee etu ọchịchị Praịm Mịnịsta ọhụrụ mba Briten nwereike isi metụta Afrịka niile

Liz Truss

Ebe foto si, EPA

Dịka emere Liz Truss Praịm Mịnịsta mba Briten, ọtụtụ ndị mmadọ na-achọ ịmara etu ọchịchị ya ga-esi metụta Afrịka.

Ndị nyocha na-ekwu na ọchịchị Truss nwere ihe ndị na-echere ya aka mgba nke gụnyere akụnụba mba Briten na ndọrọndọrọ dị n'etiti otu pati Conservative nke ha sị Boris Johnson bidoro.

Truss meriri ma bụrụ onyeisi otu patị conservative nke ya na Rishi Sunak onye bụbu mịnịsta akụnụba zọrọ.

Onyeisioche nzụkọ pati conservative bụ Graham Brady kpọpụtara Truss dịka onye meriri na ntuliaka emere dịka o ritere votu 81,326 ebe Sunak ritere 60,399.

Enwere ihe Afrịka nwereike irite ugbua n'aka Truss?

Liz Truss

Ebe foto si, Reuters

Agbanyeghị na enwebeghị ihe a nụrụ maka uche Truss gbasara Afrịka, ọtụtụ na-eche na atụmatụ ụfọdụ ọ ga-ehiwe nwereike ịmetụta Afrịka.

Ọkankuzi nke Sayensi gbadoro ụkwụ na ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Eme Ekekwe na-eche na Truss ga-ebido ịhazị ihe chere mba Briten aka mgba. Ekekwe na-akọwa na agbanyeghị na ọbụghị ya kpatara ọnọdụ mba ahụ nọ na ya ugbua, kama ọdịrị ya bụ Truss ịhazị hụ na ihe dị mma.

O kwuru sị, "A na m atụanya na Truss ga-eji afọ mbụ ya hazie nsogbu Briten nwere dịka ihe ịda oke ọnụ, gasị, nsogbu dị n'etiti patị ha na ihe ndị ọzọ".

"Ọ bụ ihe ndị a ka ọ ga-ebu ụzọ tinye uchu ya. Etu ha ga-esi mee ka ndị mba Briten tụkwasị ha obi ọzọ".

Ekwekwe kwuru sị, " Afrịka chefuo ịnata ihe ọbụla n'aka mba Briten ugbua n'ihi na uche ha niile bụ ihazi onwe ha ma dozie ọnọdụ mba ha".

Ihe ọ ga-adịrị Afrịka mma n'ọchịchị Truss?

Onyeisi ọhụrụ mba Briten na-abanye n'ọchịchị ugbua, ga-etinye uchu ịhụ n'ihi isiike ndị mba ahụ na-agabiga ugbua, ọkachasị nke agha mba butere.

Onye nkuzi sayensi gbadoro ụkwụ na ndọrọndọrọọchịchị na mahadum Rịvas steeti nke dị na Naijirịa bụ Dọkịnta Anthony Egobueze, kwuru sị na Afrịka kwesịrị ịnwe mmasị maka ọchịchị Truss maka ọdịmma ha.

Iji maa atụ, Egobueze kwuru na oge Johnson bụ Praịm Mịnịsta mba Briten, na nzụkọ ọ mere n'afọ 2020 n'etiti Afrịka na mba Briten nyere aka hụ na mmekọ Afrịka na mba Briten siri ike ma dị mma.

O kwuru sị, "Mmekọ Briten n'Afrịka ga-adị mma ugbua Trus nọ n'ọchịchị n'ihi na Truss bụ onye odeakwụkwọ N'etiti Briten na mba ndị ọzọ oge Johnson nọ n'ọchịchị" .

Etu Trus siri kelee ma too Boris Johnson dịka ọ na-enye mgbasa ozi nnabata ya kwadoro ihe a Egobueze kwuru.

Ọkọwara na Briten ga-aga n'ihu na mbọ ha na-agba maka mmepe na ọdịmma Afrịka.

Kedụ ụdịrị atụmatụ a ga-ewepụta maka Afrịka?

Liz Truss

Ebe foto si, EPA

Olufemi Hassan kwuru na gọọmentị mba Britewn ga-ebu ọnụ ọgụgụ ndị Afrịka nọ na mba ha n'obi ma ọbụrụ na ha nwere atụmatụ ha chọrọ ịwepụta.

Hassan kwuru sị, "Ihe abụo ga-eme ugbua Truss bụ Praịm mịnịsta, nke mbụ bụ na Afrịka ga-etinye anya n'ọchịchị ya ebe Truss kwesịrị ibido itinye uche maka uru Briten ga-erite n'aka Afrịka".

Hassan onye na-arụ ọrụ na Hayude Consulting kwuru na ọ bụ dịka emechara Brexit ka mba Briten bidoro chọwa mmekọ ga-enye ha uru n'aka Afrịka na Yurop.

O kwuru sị," Briten kwesiri ị na-ahụ Afrịka dịka ebe ohere ọma dị kama ịhụ ya dịka mba na-emepe emepe".

Hassan kwuru na atụmatụ Africa Continental Free trade agreement bụ ohere ka mba Briten gwa ndị ụlọọrụ na ndị ojiego achụ ego mba ha ka ha bịa ritere elele n'atụmatụ azụmahịa AfCFTA.

Ebe Truss kwesịrị itinye uchu gbasara Afrịka

Dịka etu ihe sirikwụrụ ugbua, ndị ọkaibe na-atụanya na ekwesịrị ilebara ihe ndị a anya maka ọdịmma Afrịka;

  • Azụmahia enweghị ụtụisi ọbụla
  • Nchekwa - idozi esemokwu
  • Tekụnụzụ
  • ịkwalite ezi ọchịchị
  • Ikike dịịrị onye
  • Mgbanwe mbara igwe
  • okwu maka ịkwụba aka ọtọ
  • ịkwalite ndị nọ n'ụbịam

Egobueze kwuru sị, " A na m atụanya na Truss ga-akwado azụmahia enweghị ụtụịisi, ọchịchị onye kwuo uche ya na ikike dịịrị onye dịka atụmatụ iji kwalite otuto Afrịka".

Ebe Hasan kwuru sị, " Echeghịm na Truss ga-atụhapụ atụmatụ Boris Johnson hiwere maka Afrịka, kama ọ nwereike ịgbanwe ụfọdụ na ntuziaka ndị ọchịchị Afrịka".