Ndị omekome awakpoola ụlọụka abụọ na Kaduna steeti

Akụkọ si Kaduna steeti apụta taa bụ ụbọchị uka bụ na ndị omekome wakporo ụlọụka abụọ na steeti ahụ.
Ha wakpokwara ndị ime obodo ebe ahụ dịka ndị uweojii si gwa BBC
Obodo anọ bụ ihe ọdachi a metụtara dịka a tọọrọ ọtụtụ mmadụ mana amabeghi ezi ọnụọgụgụ ndị atọọrọ.
Ndị uweojii kwukwara na mmadụ atọ nwụrụ ma kpọpụtakwa aha ndị merụrụ ahụ na ya.
Ihe ụlọụka Katọlik kwuru maka nke a
Diocese ụka Katọlik na steeti ahụ kwuru n'ezie na awakporo otu ụlọụka ha.
Mana Fada Onyema bụ ọnụ na-ekwuru ụlọụka ahụ na steeti ahụ kwuru na ọ ga-ewpụta ozi ga-aza ajụjụ niile n'oge adịghị anya.
Ndị uweojii kpọpụtakwara aha ndị nwụrụ dịka
- Peter Madaki
- Elisha Ezekiel
- Ali Zamani
Onye na-anọchi anya Gọvanọ steeti ahụ bụ Hadiza Subuwa Balarabe kwuru na ihe a mere gbawara ya obi.
O zigaara ezinaụlọ ndị ihe a metụtara ozi itiakanobi ma kwuo ka mkpụrụ obi ndị nwụrụ zuo ike na ndokwa.
Dịka ọ dị ugbua, ndị uweojii na-agagharịzi ebe ahụ na-emekwa nnyocha banyere ihe mere.









