United Nigeria Airlines : 'Ihe ọkwọụgbọelu gwara anyị mere dị iche n'ihe ụlọọrụ ha gwara ọha '- Onye njem

Ebe foto si, Salihu Tanko Yakasai
Otu onye so na njem ụgbọelu 'United Nigeria Airlines' na-aga Abuja gara daa n'ọdọụgbọelu Asaba akọwala ihe ọ ma maka ihe mere na njem ahụ.
Salihu Tanko Yakasai, onye gwara BBC Igbo n'ekwentị na ọ tụrụ ha n'anya etu ha si buru n'obi na ha na-aga Abuja ma hụ onwe ha n'Asaba, sịrị na " Okwọụgbọelu sịrị anyị na e nyere ya akwụkwọ atụmatụ ofufe (flight plan)dị iche na nke e kwesịrị inye ya."
Ụgbọelu si Legọs aga Abuja gara daa n'ọdọụgbọelu Asaba nke butere mgbakwọju anya.
Ụlọọrụ nwe ụgbọelu ahụ kwuru na ọ bụ "n'ihi ajọ ọnọdụ ihu igwe mere ka a gawa Asaba ga fetuo ụgbọelu ahụ".
Mana Yakasai, onye fere otu PRP ọkọlọtọ na Ntulaiaka ọkwa Gọvanọ e mere na Kano na nsonso a kwuru na ụlọọrụ ụgbọelu kpọrọ ha ụmụaka sị, "o nweghị ihe gosiri na ụgbọelu ahụ nwere nsogbu ihu igwe oge anyị na-efe".
"Atụghị m n'anya na ụdị ihe ahụ nwere ike ime."
"Anyị ahapụghị Legọs n'oge anyị kwesịrị. Anyị kwesịrị ịhapụ n'Elekere Abụọ mana ọ bụ n'Elekere Atọ ka anyị fepụrụ."
"Ihe nile gara nke ọma dịka o kwesịrị were rute oge ụgbọelu dara. A mara ọkwa sị, " Nnọ n'ọdọụgbọelu Nnamdi Azikiwe Abuja'."
"Efeela m ụgbọelu ụgboro ugboro iji mata n'ọdọụgbọelu ahụ abụghị nke Abuja."
"E siri m si mpịọ ụgbọelu ahụ lee anya were ghọta na ebe ahụ abụghị Abuja n'ihi etu ala (landscape) dị."
Yakasai, onye gbarụụ ihu na nkọwa nke united Nigeria Airlines nyere kwuru na ọ kara ụlọọrụ ahụ mma ịkwụsị ịkparị onwe kama ha kweta ihe mere n'ezie ma rịọ ndị njem mgbaghara.

Ebe foto si, United Nigeria Airline/Twitter
Ngalaba na-elekọta ụgbọelu na Naijiria bụ Nigeria Civil Aviation(NCAA) ekwuola na ha amalitela nnyocha ọnọdụ butere ihe dapụtara metụtara ụgbọelu United Nigeria Airline nke akara ya bụ 'Flight NUA 0506' gara Asaba na mgbakwojiu anya so ya.
Ụgbọelu si Legọs aga Abuja gara daa n'ọdọụgbọelu Asaba nke butere mgbakwọju anya nke ụlọọrụ nwe ụgbọelu ajhụ kwuru na ọ bụ n'ihi ajọ ọnọdụ ihu igwe mere ka ha gawa Asaba gafetuo ụgbọelu ahụ.
N'ozi nke onyeisi NCAA bụ Musa Nuhu binyere aka ma wepụta n'akara ozi X nke ụlọọrụ, na ha azọpụla ụfọdụ ụkwụ banyere ihe mere ganye na emechaa nnyocha zuru oke.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ozi ahụ sịrị, "Ngalaba 'Nigeria Civil Aviation(NCAA) ekwuola na ha amalitela nnyocha ọnọdụ butere ihe dapụtara metụtara ụgbọelu 'United Nigeria AirliFlight NUA 0506 gara Asaba na mgbakwoju anya so ya."
Ụfọdụ ụlọ ntaakụkọ kwuburu na NCAA nyere ntuziaka ka United Nigeria Airline kwụsị ife ụgbọelu ụlọọrụ ụgbọelu ọzọ ji aha ha efe n'ọnọdụ Bekee kpọrọ 'we-leasing'.
Gịnị bụdị 'wet-leasing'?
Wet-leasing bụ ọnọdụ nkwekọrịta dị n'etiti ụlọọrụ ụgbọelu abụọ ebe otu na-enye ibe ya ụgbọelu ya, ndị na-efe ya, ndị na-arụkwa ya ma mekwaa ịnsọransị.
Ọnọdụ ihu igwe mere ka anyị fetuo ụgbọelu na-aga Abuja n’Asaba- United Nigeria Airline

Ebe foto si, United Nigeria Airline
Ụlọọrụ ụgbọelu United Nigeria Airline arịola mgbaghara maka nghọtaghie so ụgbọelu ha na-aga Abuja nke gara daa n’Ọdọụgbọelu Asaba Ụbọchịụka.
Otu onye na ndị njem so ụgbọelu ahụ kwuru n'ọbaọzi X sị, 'Oge e ruru, otu onye ọrụ ụgbọelu mara ọkwa sị na anyị erutela Abụja".
Mana n’ozi ha wepụtara, ụlọọrụ new ụgbọelu ahụ kwuru na ọ bụ ajọ ọnọdụ ihu igwe mere ka ọkwọụgbọelu ga fetụo ụgbọelu ahụ n’Asaba, sị na onye ọrụ mara ọkwa dahiere.
Ha gara n’ihu kwuo na ụgbọelu ahụ mechara Laghachie Abuja ka ọnọdụ ihu igwe gbanwere.














