Mwakpo ndị okpukpere Kraịst ọ na-arị elu na Naịjirịa?

Ebe nchụaja

Ebe foto si, SNS

Nkọwa foto, Mwakpo a wakporo ụlọụka dị na ndịda ọdịda anyanwụ Naijiria bụ otu n'ime ihe aka ebe na-egosi na ogbugbu ndị ụka Kraịst na-arị elu

Ogbugbu ọtụtụ ndị ụka Katọlịk mere na otu ụka na mpaghara ndịda anyanwụ Naịjirịa na nso nso akpalitela echiche ndị mmadụ n’okwu mwakpo a na-eme ndị okpukperechi dị ịcheịche na Naịjirịa.

Otu jịkọrọ ndị okpukperechi Kraịsti na Naịjrịa bụ Christian Association of Nigeria (CAN), ekwuola na mwakpo ụlọụka nakwa ndị okpukpechi Kraịsti arịala elu n’ike.

Ọnụ na-ekwuru CAN bụ Adebayo Oladeji kwuru sị: “Ọnọdụ a abụrụla ọnọdụ na-enweghị olileanya ma bụrụkwa ihe ekwesiri ịkatọ”

Akụkọ ndị ọzọ banyere mwakpo na nso nso a

Mwakpo ole merela?

Nke doroanya bụ na ọnụọgụgụ mwakpo ndị a arịala elu kemgbe afọ 2019.

Dịka akwụkwọ nnyocha ụlọọrụ Armed Conflict Location and Event Data Project (ACLED) si dee, enwelari mwakpo 23 n’ụlọụka dị ịcheịche na ndị arụ aka na ọ bụ mere ya bụ mwakpo.

N’afọ 2021, e mere mwakpo 31 dị etu a ebe n’afọ 2020 e mere mwakpo 18.

Mana mwakpo gbara ọkpụrụkpụ dị etu a nke ndị merela n’afọ a akpalitela echiche ndị mmadụ n’okwu n’ụzọ pụrụiche nke gunyere:

  • Mwakpo mere n’ụbọchị ise nke ọnwa Juun, n’ụka Katọlịk dị n’Owo, Ondo steeti tara isi ọpekatampe mmadụ 40
  • Ntọrọ onyeisi ụka Methodist na Naịjirịa bụ Samuel Kanu Uche n’ụbọchị 29 nke ọnwa Mee n’Abịa steeti
  • Ntọrọ ndị ụkọchukwu Katọlịk abụọ mere n’ụbọchị 25 nke ọnwa Mee na Katisna Steeti

Mana, mwakpo ndị a na-eme n’isi ndị okpukperechi Kraịsti dịka ACLED si kwuo, kwesịrị ịbụ ihe ịgba ama n’etu mwakpo si arị elu n’isi ndị nkiti na Naịjirịa kemgbe afọ 2020.

Nke a bụ ọkachasị n’akụkụ mpaghara Ugwu nakwa mpaghara Ọdịda anyanwụ Ugwu Naịjirịa ebe mwakpo nke na-abụghị onye ọnya esiri ndị okpukperechi Kraịsti na-arị elu kemgbe.

N’afọ iri gara aga, akwụkwọ gosiri na mwakpo e mere n’isi ndị ụka Kraịsti na Naịjirịa rịkwara elu dịka e deturu ọnụọgụgụ ya dịka 46 n’afọ 2012.

N’ọnwa Eprel 2012, ndị ojiegbe gbagburu ọpekatampe mmadụ 15 n’ụlọ ejije n’otu mmadụ ebe ndị okpukperechi Kraịsti na-aka ụkla na Kano steeti.

E mechara n’otu afọ ahụ, e gburu mmadụ 19 n’otu mwakpo mere n’otu ụka na mpaghara etiti Naịjirịa.

N’oge ahụ, ọtụtụ mwakpo ndị a bụ nke otu ndịagha nnupụisi Boko Haram bụ nke okpukperechi alakụba mere.

Nkọwa etu mwakpo ndị a si mee nakwa afọ ha mere
Nkọwa foto, Nkọwa etu mwakpo ndị a si mee nakwa afọ ha mere
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Akwụkwọ nnyocha ACLED gụkọrọ ozi na akụkọ si n’aka ụlọọrụ ntaakụkọ dị ịcheịche Naịjirịa. Nke a pụtara na e nwere ụfọdụ mwakpo ndị a ha agụnyeghị dịka e nwereike ụlọọrụ ntaakụkọ ndị nọ na Naịjrịa edeghị maka ya.

Ya bụ na ọ rịara ahụ ịchọpụta kpọm kwem ọnụọgụgụ ndị okpukperechi Kraịsti egburu na mwakpo ndị a.

ACLED kwusiri ike na mwakpo ndị a metụtara ndị okpukperechi Kraịsti bụ ihe ịgba ama na mwakpo na-arị elu na Naịjirịa kemgbe 2020 nke na-abụghị naanị ndị okpukperechi Kraịsti ka ha na-emetụta mana ọ bụ mmadụ niile, agbanyeghị okpukperechị ndị ahụ sonyere.

Ụfọdụ n’ime mwakpo ndị nke Boko Haram mere, danyere na mpaghara ebe ndị okpukperechi ụka alakụba bi ọkachasị n’akụkụ ebe ndị na-anaghị esonyesi iwu ya bụ okpurukperechi ike.

Ụlọakwụkwọ ebe ndị ụmụnwaanyị okpukperechi ụka alakụba na-aga sokwa n’ebe mwakpo na ntọrọ na-akache eme.

Ndị isi okpukperechi ụka alakụba ndị katọrọla mwakpo ndị a sokwa na ndị mwakpo a metụrụla n’oge gara.

Ndị ezinaụlọ na-eru uju

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụnwaanyị na-eru uju dịka a wakpochara ụlọụka n'afọ 2018 ma gbuo ndị mmadụ

A bịa n’okwu ntọrọ nakwa ofufu ndị mmadụ na Naịjịrịa, ndị ihe nke a kacha emetụta bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị nwere agba nakwa ụmụnwaanyị dịka ngụkọ akwụkwọ nnyocha ACLED si dee bido n’afọ 2018 ruo ngwụcha ọnwa Eprel, 2021.

Kedụ ndị na-eme mwakpo ndị a na nso nso a?

Gọọmentị Naịjirịa na ndị ọrụ nchekwa nke Naịjirịa ekwuola na ha na-eche na ọ bụ otu ndịagha nnupụisi nke Islamic State network mere mwakpo a e mere n’ụka Katọlịk n’Ondo steeti.

Dịka ndịagha nnupụisi nke ụka alakabụ dị ịcheịche na-akwapo ndị okpukperechị Kraịsti, otu ndị nche, ndị ojiegbe, ndị omekome na-abụghị ndị otu alakụba ndị a etinyela aka na mwakpo, ohi nakwa nzufu akụnaụba ndị mmadụ na Naịjirịa.

Ihe ọzọ kwanyere ọkụ n’ọnọdụ mwakpo ndị a bụkwa esemokwu ndị dapụtarala n’etiti ndị ọchị ehi na ndị ọrụ ugbo dịka na-azọ ala na ihe ndị ọzọ.

Oke Ọkọchị na ala ịkpọ nkụ ebutela oke ụkọ mmiri na mpaghara Ugwu. Nke a emeela ka ndị ọchịehi bụ ndị okpukperechi Alakụka tinye isi na mpaghara Ndịda, ebe ha na ndị ọrụ ugbo bụ ndị okpukpere Kraịst na-enwe nsogbu.

Na ọgbaghara ndị a na-emetụta ma ndị ụka Kraịst ma ndị Alakụba, dịka a na-ala ọtụtụ ụlọ obibi na nke okpukperechi n’iyi.

Kedụ ihe gọọmentị kwuru?

Onyeisiala Muhammadu Buhari boro ebubo na ọ bụ ndị na-achọ ikewa obodo site n’okpukperechu na-eme mwakpo ndị a.

Onyeisi ndị uweojii bụ Usman Alkali Baba, enyela iwu ka e mee nyocha tara ọchịchị maka mwkpo mere n’Owo Ondo steetị na nso nso a ma nwụchie ndị mere ya.

Otu jikọtara ndị ụka Kraịst na Naịjirịa ataala gọọmentị ụta na iwu ha mere ọnọdụ kawanye njọ.

Nwaanyị merụrụ ahụ nọ n'ụlọọgwụ
Nkọwa foto, Ndị isi okpukperechi akpọọla oku ka ndị nchekwa jide ndị kpara arụ a

Maazị Oladeji kwuru na atụmatụ ịgbaghara ndị oyi ndụ egwu ma kpọghachite ha n’obodo amịtabeghi mkpụrụ ọbụla.

Ụkọchukwu James Wuye nke ngalaba na-ahụ maka mmekọrịta okpukperechi sị na ogbugbo nsogbu bụ inwe mkparịtaụka n’etiti ndị ntoroọbịa si n’okpukperechi dị iche iche.

Ha akpọọla oku ka gọọmentị na ndị ndu okpukperechi dị iche iche rụkọọ ọrụ n’ihe banyere ịkpaoke na okwu akpọmasị.

“Iwu ga-akpachi agwa ndị ndu okpukperechi dị iche iche” bụ ndị na-akwanye ọkụ ma na-akwadọ ọgbaghara ndị a, ka Maazị Wuye kwuru.

Foto na-egosi akụkọ BBC nyochara.