Etu ọgbaaghara siri taa isi mmadụ abụọ n'Ukwa West, Abia Steeti

Aha onyonyo, Etu ọgbaaghara siri taa isi mmadụ abụọ n'Ukwa West, Abia Steeti

Mmadụ abụọ lara mmụọ n'ọgbaaghara dapụtara n'obodo Umuorie nke dị n'okpuru ọchịchị Ukwa West, Abia steeti, n'ụbọchị Mọnde, abalị iri abụọ nke ọnwa Jun afọ 2022.

Ihe butere ngagharịiwe a bụ na ndị ntorobịa obodo ahụ na-ebo ebubo na ndị ọchịehi gburu otu onye be ha aha ya bụ Israel Nwaobilor n'ụbọchị iri na asatọ nke Jun.

Akụkọ kwuru na Nwaobilor, onye na-akwọ ụgbọala 'tipper', gara ọrụ otu ụbọchị, mana ndị ekperima tọọrọ ya ma gbuo ya.

Nke a mere ka ndị ntorobịa obodo ahụ malite ịkpa aghara ma na-emebi ihe.

Ọ bụ dịka nke a na-eme ka mmadụ abụọ nwụrụ, otu onye ọkada na otu onye ọchịehi.

Ngagharịiwe
Nkọwa foto, Ndị Obodo Umorie oge ha na-eme ngagharịiwe

Oge ndị uweojii gbatara ebe ahụ, ha chọpụtara na okwu ahụ akarịala ha, nke mere ha jiri kpọọ ndị agha ngalaba 144 battalion; ọ bụ ha bịara kwụsị ya bụ ọgbaaghara.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abia Steeti bụ Geoffrey Ogbonna gwara onye ntaakụkọ BBC na ya bụ ihe mere n'eziokwu, mana ha na-eme nnyocha ịmata ndị aka ha dị n'ogbugbu mmadụ.

Ogbonna kwuru na ha etinyela ozu onye ọkada ahụ nwụrụ anwụ n'ụlọ ozu, ebe ozu nke onye ọchịehi ka ha bunyere ndị ezinụlọ ya ka ha lie dịka okpukperechi ha siri dị.

Ebee bụ Ukwa West?

Ụkwa West bụ okpuru ọchịchị dị n'Abia steeti.

Otu ihe e ji mara mpaghara ahụ bụ na ala ha nwere mmanụ agbịdị n'ebe o buru ibu.

Ọtụtụ oge ka ọgbaaghara na-adapụta na mpaghara ahụ n'ihi na ha na-ekwu na gọọmentị anaghị akpachapụrụ ha anya, n'agbanyeghị ego ha si na mpaghara ha enweta.

N'ọnwe Mee afọ a, mmadụ 52 lara mmụọ n'ihi ọkụ ọgbụgba nke si n'ebe a na-esipụta mmanụ agbịdị n'ụzọ adigboroja.