Ọ naghị ewute m na m kagburu ntuliaka mba Senegal - Macky Sall

Macky Sall bụ Onyeisiala mba Senegal

Onyeisiala mba Senegal bụ Macky Sall kwuru na ya enweghi obi ụta maka mbọ ọ gbara iyigharị ntuliaka e kwesịrị ịme n'ọnwa gara aga nke kpatara nnukwu ọgba-aghara na mba ahụ.

Macky Sall kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere, ebe nọ kọwaa na ọ bụ maka ịhe gbasara etu ntuliaka ahụ nakwa etu o siri metụta ndị ndọrọndọrọ ọchịchị mere o jiri gbawee oge e kwesịrị ime ya bụ ntuliaka

N'okwu ya “agaghị arịọ onye ọbụla mgbaghara maka na o nweghi ihe ọjọọ m mere. M na-agwa gị okwu dịka Onyeisiala mba Senegal, ihe niile anyị mere, anyị mere ya dị ka usoro iwu si kwadoo”

A ga-eme ntuliaka ahụ n'ụbọchị Sọnde na-abịa abịa maka na mbọ ọ gbara ka ọ bụrụ n'ọnwa Disemba amịtaghị ezi mkpụrụ.

Ndị na-akatọ ọchịchị Macky Sall kwuru na ọ chọrọ iji aghụghọ gbatịa oge ya n'ọchịchị.

Mana Sall kwuru na ọ bụrụ na e mechaa ntuliaka n'ụbọchị Sọnde ma ghara ịhọpụta onye na-achị ha, na ya agaghị anọ karịa oge ya kwesịrị ịnọ n'oche ọchịchị dịka Onyeisiala.

Mana ịzụuka gara aga ka a tọhapụrụ Ousmane Sonko na Bassirou Diomaye Faye na mkpọrọ. Ha sọ na ndị na-anọghị n'ọchịchị na-akatọ ọchịchị Macky Sall.

Sonko bụ onyeisi otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-anọghị n'ọchịchị, ebe Faye jị ọkọlọtọ ha azọ ọkwa onyeisiala.

Sall gọrọ na o nweghi ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na mkpọrọ ndị a na-ekweghi n'ọchịchị ya gara.

Sall ga-apụ n'ọkwa ka ọ chịchara ugboro abụọ, ebe ndị otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya họpụtara Amadou Ba dị afọ isi isii na abụọ ka ọ zọọ ọkwa onyeisiala ahụ.

Macky sall kwuru na ọ bụghị naanị ya bụ ịhe mere ka e yigharịa ntuliaka, ma kọwaa na ya mere ịhe ndị ahụ maka ịhe ndị omeiwu na-arụtụ aka na ya bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

“Ọ bụrụ na ndịomeiwu eweputaghi ịwụ mere ka e bugharia mgbe a ga-eme ntuliaka, o nweghị etu a ga-esị nwee ntuliaka”

Mana nkwuputa na e yigharịrị ntuliaka nke Sall kwupụtara butere ọgbaghara n'etiti ndị na-eme ngagharịiwe na ndị uweojii nke kpara mmadu atọ jiri nwụọ n'oge ahụ.

ọtụtụ na-atu egwu na o wetere ajọ aha nye mba Senegal dịka obodo ọchịchị onye kwuo uche ya ka dị ire na mpaghara Afrịka ebe ndịagha na-ewere ọchịchị.

Senegal emeela ntuliaka e ji họpụta ndị na-achị mba ahụ ugboro atọ na-enwegh ọgbaghara kembe ha nweere onwe ha ma buru mba ndịagha na-ewebeghi ọchịchị na mba Afrịka.

Ndị na-eme ngagharịiwe na Senegal

Ebe foto si, AFP

O kụkwara na “Ọ bụ ihe iju anya etu ndị mmadụ si ahụta m. Ọ bụrụ na m ka chọrọ ịnọ n'ọchịchị m ga-ewere ọkọlọtọ ikike ịzọ onyeisiala n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị anyị. N'Afrịka, onye ọbụla chọrọ ịchị ugboro ise ga-enwete ya”

“Ọ bụrụ na ọ bụ ihe m bu n'obi, o nweghi onye ga-akwụsị m ma e wepu ndi Senegal bụ ndị binyere m aka ka m chịwa”

“Ọ bụrụ na ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa Maachị na anyị eweputaghị onyeisiala site na ntụliaka, aga m apụ n'oche n'abalị abụọ nke ọnwa Eprelụ bụ ụbọchị ikpeazụ m nwere ịnọ n'oche. Aga m anọ karị n'oche”.

N'ime mmadụ iri na itoolu na-azọ ọchịchị onyeisiala na Senegal, a na-ahụta Faye dịka onye ga-emeri ndị ọzọ na ntuliaka ahụ.

Mana ọ bụrụ na e nweghi onye nwetara pasentị 50% na ntuliaka ahụ, a ga-emegharị ya n'etiti mmadụ abụọ kachasị mee ọfụma.