Macky Sall abụrụla onyeisioche ọhụrụ nke African Union

Ebe foto si, Getty Images
Macky Sall nke mba Senegal abụrụla onyeisioche ọhụrụ nke otu African Union (AU).
A họpụtara Sall n'ụbọchị ise nke ọnwa Febrụwarị afọ 2022, na nzukọ ndị isiala mba ndị nọ n'okpuru AU nke ugboro 35 a na-eme n'isiobodo Addis Ababa, Ethiopia.
Sall banyere n'ọkwa ọchịchị a dịka Antoine Felix Tshisekedi bụ onyeisiala mba Democratic Republic of Congo chịchara ma rịtuo.
Ọ ga-achị otu afọ tupu o nyefee onyeisiala ọzọ ọchịchị n'afọ 2023.
Onye bụ Macky Sall?
- Macky Sall bụ onyeisiala mba Senegal kemgbe ụbọchị abụọ nke ọnwa Epreelụ 2012 e duru ya n'iyi ọrụ
- A mụrụ ya n'ụbọchị 11 nke ọnwa Disemba 1961.
- Ya na Marieme Faye nwunye ya ji ụmụ atọ; nwoke abụọ na otu nwaanyị.
- Ọ rụrụ dịka minista na ngalaba dị iche iche gụnyere minista na-ahụ maka Mines, Energy and Hydraulics, site n'afọ 2001 ruo 2004
- Ọ chịburu dịka Praịm minista mba ahụ site n'afọ 2004 ruo 2007, ma bụrụkwa onyeisi ụlọomeiwu mba Senegal site n'afọ 2007 ruo 2008.
- Ọ chịkwara dịka 'mayor' obodo Fatick bụ ebe a mụrụ ya, site n'afọ 2009 ruo 2012.
Ihe ị kwesịrị ịma maka otu African Union
- African Union bụ otu jikọrọ mba 55 dị n'Afrịka
- Ọ bụ ndị isiala na-anọchite mba 55 ndị a na nzukọ ndị AU na-emekarị kwa afọ ọbụla
- E hibere ya kemgbe ụbọchị 26 nke ọnwa Mee afọ 2001, dịka a kwụsịrị ọgbakọ Organisation of African Unity (OAU) a na-emebu kemgbe afọ 1963
- Ha kwenyere ka ọchịchị na-agagharị kwa otu afọ ọbụla, nke bụ na onyeisioche ọbụla ga-achị naanị otu afọ
- Ọ bụ ọgbakọ ebe a na-anọ akpa maka nsogbu nakwa etu e si egbo nsogbu ndị na-echere Afrịka aka mgba.
Ihe mere Donald Trump na Mike Pence ji adụ onwe ha aka n'ọnụ

Ebe foto si, Mike Pence
Mike Pence onye bụbu osote onyeisiala mba Amerịka akatọọla okwu aka chịbụrụ mba ahụ bụ Donald Trump, ebe o kwuru na Pence nwebụrụ ikike ịkwụsị mmeri Onyeisiala Joe Biden na ntụlịaka nke afọ 2020.
Pence sara ihe a Trump kwuru n'ụbọchị Sọnde ma kwuo na mpụtara ntuliaka nọ na aka ndị Amerịka ma na ọ nọghị n'aka ya.
Ọ gara n'ihu kwuo na okwu ahụ Trump kwuru maka ntuliaka 2020 ezighi ezi ma ncha.
N'akụkọ nọ nso nke a, otu pati Republican nke mba Amerịka agbọọchịela mmadụ abụọ bụ ndị omeiwu otu ha ọnụ maka itinye anya na nnyocha so okwu ọgbaghara dapụtara mgbe ndị nkwado Trump kpara nkata ịkposa mpụtara ntuliaka mba ahụ n'afọ 2020.
Ndị omeiwu abụọ a bụ Liz Cheney na Adam Kinzinger, bụ naanị ndị otu pati Republican nọ na kọmitii ahọpụtara iso na-enyocha ọgbaghara ahụ.
Cheta na n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị afọ 2020, ìgwè mmadụ wakporo Capitol bụ ụlọ ndị omeiwu mba ahụ nke nọ na Washington bụ isi obodo mba Amerịka mgbe ndị omeiwu zukọrọ ikwado ma kpebịe mpụtara ntuilaka nke kpụtara Onyeisiala Joe Biden dịka onye nwetere mmeri.
Mmadụ anọ nwụrụ n'oge ọgbaaghara na mwakpoo ahụ dapụtara, nke gụnyere otu onye uweojii nke gọnọpụrụ mgbe ọ n'ọrụ nchekwa n'ọgbaghara ahụ ma nwụọ n'echi ya.
Ikpe amaala ụfọdụ n'ime ndị nkwado Trump a sị mere ihe a ebe a ka na-ekpe ikpe ndị ọzọ ruo ugbua.
Ozi otu pati Republic zipụtara site na ngalaba ha bụ "Republican National Committee (RNC)" boro ndị omeiwu abụọ bụ Liz Cheney na Adam Kinzinger ebubo na ha na-etinye aka na-igbochi ndị mba Amerịka ime mkpebi ndọrọndọrọ ọchịchị nọ n'ikike diri ha.
Ruo nso nso a, ngalaba RNC kwusiriike na ọgbaghara ahụ dapụtara gbadoro ụkwụ n'ikike diri ndị mba ha nakwa n'usoro ndọrọndọrọ ọchịchị.
Ngalaba a rụtukwara aka na ya bụ ihe mere ebe ahụ ziri ezi.
Onyeisioche ngalaba a bụ Ronna McDaniel mechara pụta kọwa sị "nkwado anyị bụ n'okwu usoro ndọrọndọrọ ọchịchị ziri ezi nke na-enweghị ihe ọbụla jikọrọ ya na mwakpoo mere na Capitol".
Otu pati ahụ gara n'ihu họpụta kọmịtii mere mkpebi na ha agaghizi akwado Liz Cheney na Adam Kinzinger dịka ndị otu ha mana ha kwuru na agaghi achụpụ ha n'otu ha.
Banyere asisa a Pence nyere Trump maka mpụtara ntulika 2020, Trump kwuru na ndị kọmịtịị ahụ kwesiri imalite nnyocha n'isi Pence ma hapụ ndị a a sị mere ya bụ mwakpoo na Capitol.
Pence gara n'ihu kwusieike na okwu Trump ezighi ezi ma gbaa ama nye ọha na onye bụ Osote onyeisiala mba Amerịka ugbua bụ Kamala Harris agaghi enwe ike mee mkpebi na mpụtara ntuliaka 2024 n'ihi na ọ bụ naanị ndị mba Amerịka nwereikikere ime mkpebi a site n'usoro nakwa ohere ntuliaka mba ha nyere.









