Electoral College Certification: Mike Pence na ndị omeiwu Amerịka ha enwere ike ịkụchapụ mmeri Joe Biden?

Ebe foto si, Getty Images
Njem Joe Biden ịbụ onyeisiala Amerịka ga-eru n'isi mmiri taa bụ Wenezde, abalị isii nke ọnwa Jenụwarị 2021 dịka ndị Omeiwu Amerịka ga-ezute ma mepee akwụkwọ mpụtara ntuliaka e mere n'afọ 2020 si steeti dị iche iche.
Na mbụ, imepe vootu ndị a anaghị abụ ihe na-agbagwoju anya mana ugbua, Donald Trump ka na-ekwusi ike na ọ bụ ya meriri ntuliaka onye ga-achị mba Amerịka site afọ 2021 ruo 2024.
Ọ na-ekwu nke a n'agbanyeghị na Joe Biden bụ onye zọrọ ọchịchị pati Demokrat ji ihe ruru vootu nde asatọ gafee nke ya.
Biden nwetekwara vootu 306 a na-akpọ "Electoral College Votes" na Bekee ebe Trump nwetere 232.
Vootu Electoral College ahụ bụ ihe ndị Omeiwu Amerịka ga-ebinye aka na ya n'ụbọchị isii nke ọnwa Jenụwarị 2021.
Mkpebi Trump a mere ka ụfọdụ ndị omeiwu si pati Repọblịkan na-akpọ ka akagbuo mpụtara ntuliaka steeti ụfọdụ.
Etu njem mbinye aka a ga-esi ga
N'elekere mbụ nke ehihie, ndị omeiwu niile ga-ezukọ n'Ụlọ Omeiwu ebe Osote Onyeisiala Mike Pence ga-anọ n'isi oche dịka ọ bụ ya bụ onyeisi ndị Omeiwu Amerịka.
A ga-ebubata akpatị abuọ mpụtara ntuliaka si steeti dị iche iche, Pence ga-emepe ya wee nye ndị ahọpụtara ga-agụpụta ha.
Ọ gwụchaala nke a bụ ihe Pence nwere ịrụ, mana Trump tụrụ asị na o nwere ikike ịgbajọ ntuliaka ụfọdụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Nke a abụghị eziokwu, dịka iwu Amerịka si dị:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ihe dị iche ọ ga-eme?

Dịka e si eme ya mbụ, ibinye aka na vootu a abụghị ihe na-agafe otu awa, mana a na-ele anya na nke afọ nwereike gafee otu ụbọchị dịka ndị omeiwu Repọblịkan na-eme mgbajọ mpụtara ụfọdụ steeti.
Ndi omeiwu gaa n'ihu mee ihe ha sị na ha ga-eme ndi omeiwu nta ga-abanye ụlọ omeiwu ha ga tụọ vootu nke a ga-eji mara ma a ga-aga n'ihu binye aka maọbụ gee ihe ha na-ekwu nti. Ndi omeiwu ukwu ga-agakwa ụlọ omeiwu ha mekwaa etu a.
Usoro eji agbajọ mpụtara ntuliaka kwuru na onye omeiwu nta chọrọ ime otu a ga-enweriri onye omeiwu ukwu ga-akwado ya.
Ka ọ kwụ ugbua, ndị omeiwu nta 140 na ndị nke ukwu 12 sị na ha ga-agbajọ mpụtara ntuliaka n'ihe ruru steeti 6.
E nwere ndị Repọblịkan anabataghị atụmatụ ịgbajọ mpụtara ntuliaka a.
Oneyisi ndị Ụlọomeiwu Ukwu bụ Mitch McConnell arịọla ndị patị ya ka ha ghara ime ihe a ha chọrọ ime.

Ebe foto si, Getty Images
Ebumnobi McConnell nwere ike bụrụ makana ọ ma na atụmatụ ahụ agaghị agbanwe ihe ọbụla.
Emechakwaa ihe niile, Joe Biden ka ga-abụ onyeisiala.
Ndị omeiwu ukwu na nke nta ga-eme nrụrịtaụka tupu ha atụọ vootu.
Dịka ndị Demokrat ka n'ụlọ omeiwu nta, a na-eche na ha ga-asị ka a gaa n'ihu.
E meela ụdịrị ihe a mbụ?
N'afọ 2005, ndị patị Demokrat abụọ - Stephanie Tubbs Jones na Sinetọ Barbara Boxer - gbajọrọ mpụtara vootu steeti Ohio, maka ha sị na nrụrụaka dị na ya.
Ụlọọmeiwu nta na nke ukwu anabataghị atụmatụ ha. Ha gara n'ihu binye aka na mpụtara ntuliaka ahụ.
N'afọ 2017, n'oge Joe Biden nọ n'isi dịka Osote Onyeisiala, ụfọdụ ndị omeiwu Demokrat pụtara ịsị na ha anabataghị mpụtara ntuliaka aha mana Biden kwụsịrị ha wee sị: "okwu agwụla".











