Donald Trump sị na ya ga-eme iwu banyere soshal midia dịka ọ na-agbarụrụ Twitter ihu

President Donald Trump participates in a press conference at the Kennedy Space Center on 27 May 2020.

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ga-ebinye aka n'iwu si ya n'aka ga-emetụta ụlọ ọrụ soshal midia, dịka ụlọ ọrụ ya siri kwuo.

Atụmatụ a na-abịa ka Trump dọrọ aka na ntị na ya ga-agbachi ụlọ ọrụ soshal midia ọ sị na-apichi ọnụ ndị kwenyere na okwukwe "conservative".

Ekwubeghi etu iwu ọhụrụ Trump a ga-adị.

Okwechaghị nghọta ụdịrị ihe Trump nwereike imenwu ma ya bụrụ na ndị Omeiwu ewpụteghi iwu ọhụrụ ga-enye ya ikike.

Ndị ụlọ ọrụ Trump enyeghi ozi ọzọ banyere atụmatụ a bụ nke a na-ele anya na o nwereike ịbinye aka na ya n'ụbọchị Tụzde.

Trump na-ebo Twitter ebubo mmegide ndị otu ya mana onweghi akaebe o nyere banyere nke a.

O mechiri otu ihe o dere na Twitter site na ikwu "Ugba a ha apụọla ezigbote ara. Na-elekwa!!!"

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Presentational white space

Okwu na-ere Trump na ụlọ ọrụ soshal midia senyitere isi ọzọ n'ụbọchị Toozde dịka etinyere akara nyocha n'otu ihe o dere na Twitter.

Twitter dere na ihe Trump dere banyere mpụ na ntuliaka Amerịka "enweghi akaebe" ga-egosi na ọ bụ eziokwu

N'ụbọchị Wednesde Trump kwusiri ike na ya "ga-eji ike hazie" ma ọ bụ "gbachie" ogige soshal midia.

Ọ gwara mmadụ nde iri asatọ na-eso ya na Twitter na ndị na-akwado pati Repụblikan ndị chere na ogige soshal midia "na-akpichi ndị conzavative ọnụ kpam kpam", na ya agaghi ekwe ka nke a mee.

Oneyisi Twitter sara ihe Trump kwuru site n'isi: "Anyị ga na-egosi ozi akwụghị ọtọ banyere ntuliaka Amerịka n'ụwa dum."

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Presentational white space

Maazị Trump dekwere otu ihe ahụ o dere na Twitter na Facebook mana onweghi akara nyocha etinyere na ya.

Na mkparịtaụka o mere na Fox News ụbọchị Wednesde, onyeisi Facebook bụ Mark Zukerberg sị na ịkpịchị ogige soshal midia ọnụ abụghị ihe o che gọọmentị na-eti mkpu mkpịchị ọnụ kwesiri ime.

Twitter jizi aka ike eso akụkọ ụwa ugbua maka nrụtụ aka ndị mmadụ mere banyere etu ha si eme maka ụdịrị akụkọ ahụ.