Ndị a ma ama na-azọ ọkwa Onyeisiala mba Ghana na ndị osote ha

John Mahama, Prof Naana Jane, Dr. Bawumia na Dr. Matthew Prempeh

Ebe foto si, JOHN MAHAMA/PROF NAANA OPOKU AGYEMANG/DR BAWUMIA/MINISTRY OF ENERGY/FACEBOOK

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 8

Ihe niile adịla njikere maka ntụliakaelu dị oke mkpa a ga-ahazi na mba Ghana dịka pati ji ọkwa ọchịchị bụ New Patriotic Party (NPP) kwupụtara onye ya na osote Onyeisiala mba ahụ bụ Mahamudu Bawumia ga-eso zọọ ọkwa.

Nke a mere dịka ọ gasịrị ihe karịrị ọnwa isii pati ahụ họpụtara onye ga-eji aha ya zọọ ọkwa Onyeisiala n’ọnwa Nọvemba 2023.

Ahọrọla onye bụbu minista na-ahụ maka agụmaakwụkwọ na minista na-ahụ maka ikikere ọkụ bụ Dr Matthew Opoku Prempeh dịka onye ga-abụ osote Onyeisiala.

Dibịa Bekee ahụ bụ onye gbasiri ike na NPP na mpaghara ya bụ Ashanti nke mere ha ji mara na ọ bụ ọkachamma maka ọkwa osote Onyeisiala.

Tupu ekwupụta nke a, enweela ụfọdụ ndị e chere ga-enweta ọkwa ahụ dịka Osei Kyei Mensah – Bonsu (onye bụbu onyendu ndị kachasị n’ọnụọgụ n’ụlọomeiwu), Dr Yaw Osei Adutwum (minista agụmaakwụkwọ), Frema Osei Opare (onyeisi ndị ọrụ n’obi ọchịchị), Apostle Opoku Onyinah (onye bụbu onyeisioche Church of Pentecost), Bryan Acheampong (minista ọrụ ugbo), Naa Torshie Addo (onye omeiwu) na ndị ọzọ.

Mana osote Onyeisiala ahọrọla Dr Matthew Opoku Prempeh dịka osote ya n’oge ntụliakaelu dịka ọ gachara kpọtụtụ ndị okenye pati ya.

Nke a pụtara na pati abụọ a ma ama enwetachaala ndị ga-eji aha ha zọọ ọkwa Onyeisiala na ndị osote ha n’otu n’otu dịka ha ga-amalite ịchụ nta vootu.

Dr Bawumia na Dr Mathew Opoku Prempeh

Ebe foto si, DR MAHAMUDU BAWUMIA/MINISTRY OF ENERGY/FACEBOOK

Kedụ ndị ga-eji aha NPP zọọ ọkwa n’oge ntụliaka?

Onye ji ọkwa osote Onyeisiala mba ahụ ugbua bụ Dr Mahamudu ka ndị pati ya họọrọ ka ya na John Mahama maa aka n’oge ntụliaka.

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dr Bawumia bụbu onye na-eso Onyeisiala nke na-apụ apụ bụ Nana Akufo-Addo n’ụzọ ntụliakaelu abụọ ga-abụzi onye ga-edu ndị pati ya oge ọchịchị Onyeisiala nke ugbua kụụrụ ọnụ.

Nwaamadị ahụ okwu akụnaụba doro anya ma bụrụkwa onyeisioche otu na-elekọta akụnaụba ekwuola na ya nwere ikikere ịgbanwe ọnọdụ mba ahụ.

Ụfọdụ na-agbaọchịchị mba ahụ ụkwụ na ụmụafọ Gana ndị ọzọ pịasuru osote Onyeisiala ahụ n’ihi na o nweghị ike igbo nsogbu akụnaụba mba ahụ.

Ọnọdụ obibi ndụ akawanyela njọ, akwụkwọ ego mba ahụ na-akụ afọ n’ala n’ebe akwụkwọ ego mba ndị ọzọ nọ dịka azụmaahịa dị iche iche na-ahụsi anya.

Mana gọọmenti na osote Onyeisiala ahụ kwuru na ọ bụ ọrịa covid 19 nakwa agha dị n’etiti Rọshịa na Yukren butere nsogbu niile mba ahụ na-agabiga .

Dr Bawumia kwuru na ya nwere ikikere idozi ihe niile mana ndị ọnụ na-eru n’okwu na-ajụ ihe mere o ji eche ka ọ bụrụ Onyeisiala tupu o gboo nsogbu ndị ahụ karịa oge a ọ nọ na gọọmenti.

Onye ahụ bụbu onyeisioche ụlọakụ Ghana gwara ụmụafọ mba ahụ tinye ya dịka ọkwọụgbọ ka ọ kwọrọ mba ahụ banye na mmepe na ọganịihu.

Dịka onye si mgbagougwu Ghana, ndị ọkachamara tụrụ anya na ọ ga-enweta nnukwu vootu na mpaghara ahụ nakwa mpaghara atọ ndị ọzọ dị na mgbagougwu.

Dr Bawumia bụ onye ọzọ a maara nke ọma sitere mpaghara mba ahụ azọ ọkwa Onyeisiala maọbụ osote Onyeisiala na pati ji ọkwa ọchịchị n’ime afọ iri na isii gara aga.

Bawumia na Opoku Prempeh

Ebe foto si, DR MAHAMUDU BAWUMIA/FACEBOOK

Dịka ndị nlekọta NPP họpụtachara Dr Bawumian n’ọnwa Nọvemba 2023 dịka onye ga-eji aha ya zọọ ọkwa Onyeisiala, ọ kwesịrị ịhọpụta onye ọ ga-eji mere osote ya ọ ga-eji chụọ nta vootu maka ntụliakaelu 2024.

Iwu pati ahụ kwadoro onye ga-eji aha ya zọọ ọkwa Onyeisiala ịhọpụta onye ga-abụ osote ya n’ime ọnwa iri na abụọ tupu ahazie ntụliaka ọ bụrụ ma Onyeisiala esoghị azọ ọkwa ahụ.

Mana ndịisi pati NPP enyekwuola Dr Bawumia oge ịkpọtụrụ ndị nọ n’otu ahụ gbasara onye ọ chọrọ ịhọrọ dịka osote ya.

N’ikpeazụ, Dr Bawumia na ndị nlekọta patị ahụ ekwupụtala onye ga-abụ osote ya n’oge ntụliakaelu. Ọ bụ minista na-ahụ maka ikikere ọkụ ugbua bụ Dr Matthew Opoku Prempeh.

Dọkịta ahụ gabara afọ iri ise na isii (56) nọọrọ n’isi ministry agụmaakwụkwọ (2017 – 2021) tupu Onyeisiala bụ Nana Akufo-Addo ahọpụta ya dịka minista ikikere ọkụ n’afọ 2022 ruo mgbe a họpụtara ya dịka onye ya na osote Onyeisiala mba ahụ ga-eso zọọ ọkwa onyeisiala.

Dr. Opoku Prempeh, onye ọtụtụ mmadụ maara dịka NAPO bụ onye ụkwụ siri ike n’otu ahụ dịka a maara ya nke ọma na mpaghara Ashanti palace – Manhyia.

Mpaghara Ashanti bụ ebe NPP gbara mgbọrọgwụ dịka Dr Opoku Prempeh n’onwe ya bụkwa onye gbasiri ike n’ebe ahụ.

Ndị ọkachamara kwuru na ihe mere e ji họrọ minista na-ahụ maka ikikere ọkụ bụ iji hụ na pati ahụ gara n’ihu jidesie mpaghara Ashanti ike ma nwetakwa ọtụtụ vootu ebe ahụ.

Ọtụtụ mmadụ na-ahụta Dr Prempeh dịka onye na-enye nsogbu site na mgbe ọ bụụrụ minista agụmaakwụkwọ. Ọ naghị anụ ihe.

Ọ bụladị n’ọkwa ya ugbua dịka minista na-ahụ maka ikikere ọkụ, ọ naghị aṅa ntị n’ihe ụmụafọ mba ahụ na-ekwu ka o wepụta usoro a ga-esi kesaa ọkụ n’oge ọbụla ọkụ latrik nwere nsogbu iji nye ha ohere ịhazi onwe ha nke ọma.

Ndị na-agba gọọmenti ụkwụ akọwaala ya dịka onye na-eme ihe etu o siri masị ya mana ndị pati ya kwuru na ọ bụ ya bụ onye “tozuru oke ma nwee ihe niile a chọrọ” iji gbakọọrọ osote Onyeisiala aka n’oge ntuliaka.

Tupu ya abanye igwu ndọrọndọrọ ọchịchị, NAPO arụbuola ọrụ dịka onye ọrụ ahụike na mba UK oge ọ rụchara ọrụ dịka onyeisi nke otu ụlọọrụ a kpọrọ Keyedmap services limited.

Dr Opoku Prempeh nọchiteburu ndị Manhyia dị na mpaghara Ashanti dịka onye omeiwu ha n’afọ 2009.

Ọ bụ otu n’ime ndị omeiwu ọrụ doro anya n’ụlọomeiwu mana ugbua, ọ ga-elekwasa anya n’inweta mmeri na ntụliaka ọha nke Dr Mahamudu Bawumia ga-azọ ọkwa Onyeisiala na ya.

Dịka ọ fọdụrụ ihe na-erughị ọnwa isii tupu ahazie ntuliaka ahụ, o kwesịrị ịmalite iji aha pati ahụ chụwa nta vootu.

Pati NDC na ntuliaka ahụ

John Mahama na Prof. Naana Jane Opoku Agyemang

Ebe foto si, PROF NAANA OPOKU AGYEMANG/FACEBOOK

Nkọwa foto, Foto John Mahama na Prof. Naana Jane Opoku Agyemang

Onye ji aha NDC azọ ọkwa onyeisiala mba ahụ bụụrụ onyeisiala oge John Atta Mills nwụrụ n’oche ọchịchị n’afọ 2012.

Tupu oge ahụ, John Mahama bụ osote Onyeisiala malite n’afọ 2009 ruo mgbe John Atta Mills nwụrụ.

N’oge ntụliaka 2012, ọ zọrọ ọkwa onyeisiala n’okpuru pati ya ma nweta mmeri nke mere o ji bụrụ onyeisiala ruo afọ 2016 mgbe New Patriotic Party NPP meriri ya na ntuliaka ehụ kpụ ọkụ ahaziri na Gana.

Tupu ọ bụrụ osote onyeisiala, nwaamadị ahụ maara nke ekwe na-akụ na nzikọrịtaozi agaala ozi na ngalaba gọọmenti dị iche iche malite n’onye nnọchiteanya n’ụlọomeiwu ruo n’ọkwa onye omeiwu.

John Mahama si n’otu mpaghara dị na mgbagougwu bụ Savannah, ebe ndị mmadụ chere ya na Dr Bawumia ga-achịpụ ya maka vootu ndị mpagharaugwu.

Mana tupu ndị Gana achụpụ gọọmenti ya, mba ahụ tara nnukwu ahụhụ n’ihe banyere ọkụ latrik nke ha kpọrọ “dumsor”.

Dumsor bụ ihe ndị obodo ahụ na-akpọ nsogbu ọkụ latrik, mana site n’ọtụtụ enyemaaka, gọọmenti ya kwuru na ha ga-egbo nsogbu ahụ tupụ ha apụọ n’ọkwa.

Onye ahụ bụụrụ onyeisiala ma bụrụkwa onye ji aha NDC malitere ikwe nkwa ọnọdụ akụnaụba na-agaghị ehi ụra bụ nke ha ga-eji gboo nsogbu anamachọọrụ ma kwalite nrụpụta ihe.

Dịka John Mahama siri kwuo, ndị mmadụ ga na-arụ ọrụ esepụghị aka na ngalaba niile.

O kwuu na gọọmenti ya ga-ebelata oke mmefu ego.

“A ga m eji naanị ndị minista iri isii (60) rụọ ọrụ ma nweekwa ụlọọrụ ga-enyocha ọrụngo gọọmenti niile nakwa mmefu ego ọbụla karịrị nde dọla ise ($5m),” ka o kwuru.

Onye na-azọ ọkwa osote Onyeisiala n’okpuru pati NDC bụ nwaanyị

Prof Naana Jane Opoku Agyemang

Ebe foto si, PROF NAANA OPOKU AGYEMANG/FACEBOOK

Onye ga-eji aha pati ahụ zọọ ọkwa osote Onyeisiala bụ ọkankuzi Naana Jane Opoku Agyemang.

Nwaanyị a arụọla ọrụ dịka minista agụmaakwụkwọ n’okpuru ọchịchị John Mahama malite n’ọnwa Febụwarị 2013 ruo na Jenụwarị 2017.

Tupu ọ banye igwu ndọndọrọ ọchịchị, Prof Naana bụ onyeisi mahadum nwaanyị mbụ na Cape Coast University malite 2008 ruo 2012.

O jiiri ọkwa ahụ kpọọ oku maka agụmaakwụkwọ, ụdị ekere (gender), ụmụnwaanyị na ahụike tupu John Mahama ahọpụta ya dịka minista agụmaakwụkwọ.

Na ntuliaka 2016 nke NDC kụrụ afọ n’ala, onye bụụrụ osote Onyeisiala n’oge ahụ bụ Paa Kwesi Arthur zọrọ ọkwa osote Onyeisiala tupu ya onwe ya anwụọ n’afọ 2018.

Dịka Amissah Arthur nwụsịrị, John Mahama họpụtaziri Prof. Naana Jane dịka onye osote ya maka ntụliaka 2020 nke ha dara.

Na ntụliaka nke afọ a, onye ji ọkọlọtọ NDC azọ ọkwa onyeisiala họrọkwara otu nwaanyị ahụ dịka onye ga-eso ya n’azụ.

Ọtụtụ mmadụ kwetara na nke ahụ bụ mkpebi dabara adaba gbasara ịgụnye ụmụnwaanyị n’ọkwa ọchịchị na ikwalite ha.

Ọ bụrụ ma pati ahụ nweta mmeri na ntuliaka a, Gana ga-enweta osote onyeisiala nwaanyị mbụ ya.

N’etiti ha, John Mahama gbara afọ iri isii na ise (65) ebe Prof. Naana Jane gbara afọ iri asaa na abụọ (72).

Onye ji aha pati Movement for Change azọ ọkwa Onyeisiala bụ Alan Kwadwo Kyerematen

Dr. Abu Sakara na Alan Kyerematen

Ebe foto si, ALAN KWADWO KYEREMATEN/FACEBOOK

E wezuga pati abụọ ndị a ma ama na ndị ji aha ha azọ ọkwa Onyeisiala, ụfọdụ ụmụafọ Gana na-ekwu na onye ọzọ ga-apụta ịma ha aka n’ihu.

Kemgbe afọ iri atọ na abụọ (32) gara aga, ọ bụ naanị pati abụọ na-achị eze na Gana – ma ọ bụghị NDC, ọ bụrụ NPP. Obere pati ndị ọzọ enwetabeghị ihe ruru pasenti vootu abụọ n’oge ntuliaka.

Onye ahụ bụbu minista azụmaahịa tupu ọ gbaa arụkwaghịm bụ onye a ma ama na NPP, ndị o jiri ha zọ ọkwa ugboro abụọ ma daa.

Ọ bụ ya mere o ji gbaa arụkwaghịm na pati ahụ, hiwe ‘Movement for Change’.

Oge ọ gbara arụkwaghịm, Alan Kyerematen kwuru na ya nwere mkpebi ahụ n’ime omume na-adịghị mma ndị pati ahụ mesoro ya.

Ọ na-ekwe nkwa ibu agha megide mpụ na nrụrụaka, jikọta mba ahụ ọnụ ma mee ka onye ọbụla soro n’ihe a na-eme.

O kwukwara na ya ga-elekwasa anya n’iwunye ụlọọrụ dị iche iche iji kwalite ọnọdụ akụnaụba Ghana ma kepụta ohere ọrụ maka ọtụtụ ndị ntorobịa mba ahụ.

Dịka ọ gasịrị ọnwa ole na ole o hiwere Movement for Change, o kwupụtara na ya na onyendu National Interest Movement nke Dr Abu Sakara nọ n’isi ya ga-agbakọ aka.

Ikikere ọhụrụ - Nana Kwame Bediako

Nana Kwame Bediako

Ebe foto si, NANA KWAME BEDIAKO/FACEBOOK

N’ọnwa Febụwarị afọ a, onye ji ego achụnta ego bụ Nana Kwame Bediako (e ji Cheddar mara) kpuhere onwe ya dịka onyendu ikikere ọhụrụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Gana.

O kwuru na ya chọrọ ị bụ onyeisiala mba ahụ na-agbanyeghị na o nweghị ihe ọ maara banyere ndọrọndọrọ ọchịchị Gana.

Nwoke ahụ gbara afọ iri anọ na anọ (44) kwuru na ya ga-agbakwasa ụkwụ n’akaọrụ nakwa ọnatarachi ndị ntorobịa iji kepụtara ndị Gana akụnaụba.

Mmadụ ndị ọzọ na pati ndị kwupụtara mmasị ịzọ ọkwa Onyeisiala

E wezuga ndị nke anyị kpọrọ aha, e nwere ndị ọzọ kwuru na ha ga-eso zọọ ọkwa ahụ.

Pati anọ ndị ọzọ gụnyere Convention Peoples’ Party (CPP), Peoples’ National Convention (PNC), Peoples’ National Party (PNP) na Progressive Peoples’ Party (PPP) ga-eso zọọ ọkwa ahụ.

Jacob Osei Yeboah kwuru na ya chọrọ ihiwe gọọmenti ịdịnootu nke ga-enweta opekatampe oche ndị omeiwu iri abụọ (20).

Twum Barima Adu na Sam Ankrah bụkwa ndị ọzọ kwụụrụ onwe ha na-azọ ọkwa ahụ.