Shettima, Lai Mohammed, Okonjo-Iweala na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ekike ha wuru ewu na soshal midia

Ebe foto si, Twitter
Kamgbe foto Kashim Shettima pụtachara dịka ọ gara ọgbakọ ndị 'Nigeria Bar Association' n'ụbọchị Mọnde, Ọgọst 22, 2022, ndị mmadụ na soshal midia aṅụbeghị mmiri tọgbọ iko.
Ọtụtụ ewepụtela foto ebe ha kere ekike dịka nke Shettima; ụfọdụ mere nke a n'ụdị ihe ịkpa ọchị, ebe ndị ọzọ mere ya dịka nkwado.
Nke a abụghị nke mbụ ekike onye ndọrọndọrọ ọchịchị na-akpalite akụkọ wuru ewu na soshal midia.
Lee ụfọdụ ndị a ma ama ekike ha wurula ewu:
Kashim Shettima

Ebe foto si, Twitter
Nke a bụ nke na-ewu ugbua na soshal midia.
Kashim Shettima bụ aka chịburu Borno steeti, ma bụrụkwa onye na-azọ ọkwa osote onyeisiala Naịjirịa na party 'All Progressives Congress'.
Ndị dịka Festus Keyamo, bụ Mịnịsta nta na-ahụ maka ndị ọrụ na Naịjirịa, nakwa otiegwu Charles Oputa, onye e ji Charly Boy mara, ewepụtela foto ebe ha kere ekike dịka Shettima.
Muhammadu Buhari

Ebe foto si, screenshot
Foto ekike Onyeisiala Muhammadu Buhari wukwara ewu na soshal midia oge ọ gara njem nleta n'Imo steeti n'afọ 2021.
Na foto ahụ, Buhari yi akwa Isi Agu ma yirikwa traụza nke ọ dịka ọnụ ụkwụ ya anaghị erucha ala.
Dịka foto ahụ pụtachara, ọtụtụ mmadụ, ọ kachasị ndị ọkpa ọchị yikwara ụdị uwe ahụ n'ụzọ iji kpaa ọchị.
Ngozi Okonjo-Iweala

Ebe foto si, Twitter
Ngozi Okonjo-iweala bụ onyeisi otu na-ahụ maka ịtụ mgbere ahịa n'ụwa niile nke a kpọrọ 'World Trade Organisation'.
Nwa ada a arụbuola ọrụ ugboro abụọ dịka mịnịsa na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa.
N'ọnwa Febrụwarị afọ 2021, dịka Okonjo-Iweala merichara ntuliaka dịka onyeisi WTO, ọtụtụ ụmụnwaanyị na Naịjirịa malitere ihe ha kpọrọ #BeLikeNgoziChallenge.
Ha bidoro ike ekike dịka Ngozi Okonjo-Iweala iji gosi ịhụnanya ha nwere n'ebe nwaanyị a nọ nakwa iji too ya maka aha ọma ọ na-ewetara Naịjirịa.
Lai Mohammed

Ebe foto si, Screengrab
Nke a mere n'ọnwa Febrụwarị afọ 2018 oge Mịnịsta mgbasaozi bụ Lai Mohammed gara njem nleta na mba Spen.
Foto fesara na soshal midịa nke gosiri ebe Mohammed gara leta n'ama egwuregwu ndị otu bọọlụ Real Madrid.
Na foto ndị ahụ, Mohammed yi akwa agbada ma yikwasa ya 'coat' n'elu.
Ụfọdụ kwuru na ekike ahụ adabaghị adaba, ebe ndị ọzọ kọwara na nke a nwereike ịbụ maka na Febụwarị bụ oge 'Winter' nke bụ oge nnukwu oyi na-atụ na mpaghara Yurop.
Patience Jonathan

Ebe foto si, Twitter
Patience Jonathan, nwunye aka chịburu Naịjirịa bụ Goodluck Jonathan wuru ewu na soshal midia maka ekike ya n'ụbọchị ekeresimesi afọ 2017.
Uwe ahụ dịka o nwere ọtụtụ ugbele nnụnnụ na ya, nke mere ọtụtụ ndị mmadụ ji were ya na-atụnyere ọkụkọ ọcha.
Michelle Obama

Ebe foto si, screengrab
N'oge Barack Obama bụ onyeisiala Amerịka, ụfọdụ ndị mmadụ katọrọ foto nwunye ya bụ Michelle dịka ha kwuru na nwunye Onyeisiala ekwesịghị iyi akwa na-egosi aka ya.
Mana ọtụtụ ndị ọzọ kwadoro Michelle ma kwuo na nkatọ a na-akatọ ya erijughị afọ.









