E bidola ime nyocha banyere ndị uweojii e setere n'onyonyoo ebe a na-eke ha ego

Ebe foto si, Screenshot/NgeriaPoliceforce/Facebook
Ndi uweojii Naijiria ekwuola na ha amalitera ime nyocha banyere ndị otu ha e setere n'onyonyoo ebe ndí Chaịna na-eke ha ego.
Ọnụ nakwuru ndị uweojii bụ Olumuyiwa Adejobi mere ka a mata nke a n'akwụkwọ ozi o zigara ndị ntaakụkọ site n'akara sohal mịdịa ha.
Adejobi katorọ akparama agwa ndị uweojii ahụ sị na udiri ihe dị etu ahu na-emetọ ntụkwasị obi ohanaeze nwere n'ebe ha nọ.
N'olu Adejobi "Ndi uweojii Naijiria ahụla ihe onyonyoo na-egosi ebe ndị uweojii kwụru n'ahịrị na-anara ego dịka ndị Chaịna na-eke ha ego n'aka n'aka"
"Nke a abụghị ihe e jiri mara ezi agwa ndị uweojii".
Adejobi gara n'ihe kwuo na "anyị achọpụtala ndị otu anyị mere ihe ahụ. Ugbua anyị ebidola usoro ime nyocha nakwa ị dọ ha aka na ntị".
Gịnị ka a ga-eme ụmụamala Chaịna ahụ?
Okwu ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ kedụ ihe a ga-eme ụmụ amala Chaịna a hụrụ na-eke ego ahụ?
Mana onye ọkaiwu BBC Igbo gbara ajuju ọnụ bụ Peter Aja zara sị " ihe e kwesiri imara ugbua bụ eziokwu niile banyere ego ha kere".
"E kwesiri ịmara ego gịnị ka ha na-eke nakwa ihe mere ha ji eke ego tupuu a mara na ha adara iwu maọbụ na ha adaghị iwu".
"Ọ bụ mgbe e mechere nyocha banyere ihe mere ga-agwa anyị ihe a ga-eme ha, mana ugbua naani onyonyoo ahụ edobeghị anya ikwu kponkem na ọ bụ ihe gbasara iri ngari maọbụ nrụrụaka ego".
"E kwesiri inye ndị uweojii na ndị Chaịna ahụ ntarama ahụhụ maka na agwa ha n'onyonyoo ahụ na-ebutere ụlọọrụ ndị uweojii ajọ aha".
Lee ebe onye uweojii ekweghị anata ngarị ego ruru otu nde naịra
Na Katsina steeti ka ndị uweojii nụchiri mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-ezu ohi ụgbọala ma.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahu bụ Abubakar Sadiq siri kwuo "ka e jidechara ndị ohi ahụ, ha nyere ndị uweojii ngarị otu nde naira ka a tọhapụ ha. Mana ndị otu anyị juru ego ahụ ma jide ha".
O kwuru sị "n'Eprel 11 2025, mgbe ndi uweojii na-agahari na mpaghara Kuka, Mashi dị na Katsina steeti ka ha kwusiri umunwoke abụọ bu ugboala Toyota Corrola LE na-acha akwụkwọ ndụ ndụ".
"Ndi no n'ime ụgbọala ahụ bu Mubarak Kabir, nwoke di afo iri na isii, Adamu Hashim nwoke di afo iri abuo na asaa bụ ndị Kano steeti".
Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Bello Shehu kenere ndị uweojii ahụ maka mbọ ha na-agba na steeti ha nakwa ịkpa ezi agwa.









