CBEX, MMM: Lee etu ị ga-esi gbanarị ndị nnapụ ego 'pọnzi'

Ebe foto si, Interpool/Getty images/ EFCC/X
- Onye dere ya, Michael Ilediagu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Ebeg o si, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3
CBEX bụ ụzọ e si eji ego achụ nta ego akụkọ kwuru na ọ kwasara ugbua ma riela ego ọtụtụ ndị mmadụ na Naịjirịa.
Akụkọ na-ekwu na CBEX na-enye ndị tinyere ego n'aka ha uru ruru pasentị otu narị (100%) ma kwuo na mgbe ha mechere kwasaa na ego ndị mmadụ ha jiri gbalaga karịrị puku ijere na ụma (N1.3trillion)
Dịka CBEX si mee ugbua, ka ndị a na-akpọ Mavrodi Mundial Moneybox (MMM) si kwasakwa ma rie ego ụmụ Naịjirịa n'afọ 2016.
Ka ọtụtụ ndị o metụtara na-ebe akwa ka onye ọka mmụta n'ihe gbasara akụnụba nakwa ị chụnta ego bụ Desmond Okechukwu Echeta kọwaara ọtụtụ ihe gbasara ụzọ adịgboraja dị iche iche e si anapụ ndị mmadụ ego.
Desmond Echeta bụ onye nkuzi na Mahadum na-ahụ maka ọrụ ugbo n'Ohaji, Egbema, Imo steeti ma bụrụkwa ọkammụta n'ihe gbasara akụnụụba.
Gịnị bụ 'Pọnzi skịm?
Dika ọtụtụ ndị mmadụ na-ebe akwa na CBEX napụrụ ha ego gbalaga, Dọkịnta Desmond Okechukwu Echeta nyere nkọwa dị oke mkpa banyere 'pọnzi skịm'.
Desmond sị na 'pọnzi skịm' bụ usoro azụmaahịa n'adịghị n'iwu obodo ma kọwaa ya dịka chamdum.
"Ọ bụ ahịa a na-ezuru mmadụ ego ya ma were ya nye onye ọzọ".
"Ọ bụ ụzọ azụmaahịa enweghị gọọmentị na-enyocha ihe ha na-eme"
Kedụ etu ị ga-esi ghara ịdaba n'aka ndị nnapụ ego n'ụzọ ụchụ nta ego?
Echeta kọwara na ihe mbụ mmadụ kwesiri ịmara banyere 'pọnzi" bụ na ha na-azụ ahịa n'usoro n'adịghị n'iwu.
Ihe ndị ọzọ ị ga-amara gụnyere:
- Ego nrite ha na-enye mmadụ dịka uru bụ ihe na-adị nnukwu mana ọ dịghị adigịde.
-Ha na-ekpuchi etu ha si azụ ahịa maka na ihe niile ha na-eme bụ n'ụzọ zoro ezo.
-Ha na-esi n'ụzọ akaike na-akpọbata ndị mmadụ n'ihe ha na-eme.
-O nweghị Ngalaba gọọmenti na-enyocha ihe ha na-eme.
-Ha na-eme ka ndị mmadụ mara na ọ bụ itinye ego ịnweta uru ngwangwa nke mere na ndị mbụ tinyere ego na-akacha enweta uru mana ha ne-esi na ndị ọzọ anapụ ego.
-Ọ bụ ego ndị nke mbụ tinyere ego na-eme igwe mmadu ịbịa tinye ego ha.
Ihe mmadụ kwesịrị ime tupuu o tinye ego n'ulọ ahịa ọbụla
Echeta kọwaara na ihe mbụ mmadụ kwesiri ime bụ ịme nnyocha banyere ụlọọrụ maọbụ ụlọahịa ọ chọrọ ịtinye ego ya.
"Mara ka e siri guzobe ulọọrụ ahụ ma mara na ọ bu eziokwu na ha na-azụ ahịa, mara etu ha si azụ ahịa, mara ihe niile ha na-ere ma mara ndị niile so nwee ụlọọrụ ahụ"
Ọ bụ nnyocha ndị a ga-enyereaka ịmara na ha abụ ụlọọrụ adigboroja.
Ihe ụlọọrụ EFCC kwuru maka CBEX
N'oge CBEX kwasara ma buru ego ndị mmadụ gbalaga, ụlọọrụ na-ahụ maka mpụ na Naịjirịa bụ Economic and Financial Crime Commission (EFCC) kwuru na ha ga-ejide ndị ahụ nwe ya.
EFCC kwuru na ha na ndị International Criminal Police Organisation (Interpol), ndi Federal Bureau of Investigation (FBI) na ndị ọzọ ga-ejikọ aka ọnụ chọpụta ndị nwe CBEX ahụ ma kpụpụ ha ụlọikpe.




