Marksman Chinedu Ijiomah: Ejịghị m ego ndị mmadụ mee 'dorime'

Aha onyonyo, Chinmark Ijomah: Ejịghị m ego ndị mmadụ mee 'dorime'

Onyeisi ụlọọrụ Chinmark Group bụ Marksman Chinedu Ijiomah ekwuola na ihe mere ya ji ghara imezu nkwa ịkwụ ndị tinyere ego n'ụlọọrụ ya bụ n'ihi na ngalaba na-ahụ maka itinye ego n'azụmahịa a kpọrọ Security Exchange Commission(Sec) natara ikike gbachie akpaego ya na nke ụlọrụ ya dị n'ụlọakụ.

Chinmark na Chinedu Ijiomah na-ewu kemgbe na soshal midia maka etu ndị mmadụ si pụta na-ekwu na o kweghị akwụ ha ụgwọ o ji ha dịka ụfọdụ n'ime ha tinyere ego ha n'ụlọahịa ya iji nweta isi ego na ọmụrụnwa.

Ọtụtụ ndị a na-eti mkpu ego ha kwuru na mbọ niile ha gbarala maka nke a dara mmiri dịka Ijiomah gbachiri ekwentị ya ma were ndị agbero wujuo n'ụlọọrụ ya dịga na mpaghara di iche iche na Naijiria nakwa na Dubai.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Ijiomah kwuru na ọ bụghị ọsọ ka ya gbara kama na SEC gbachiri akpaego ya, nke nwunye ya na nwa ya.

O kwuru na o nweela ndị ya kwụrụ ụgwọ n'ime ihe ruru mmadụ 400 tinyere ego n'ụlọahịa ya. ma kwekwa nkwa na ya ga-anwụ ndị fọrọ afọ ma ọ bụrụ na ha nye ya ohere ọnwa asaa na-abịa.

Etu ndị mmadụ siri mara na nnu aṅaala ofe

Ngalaba Securities & Exchange Commission (SEC) nke Naịjirịa depụtara n'ọba ozi webụsaiti ha akwụkwọ ozi katọrọ atụmaatụ oji ego achụ ego nke ụlọahịa Chinmark Group.

Akwụkwọ ozi ahụ bu deeti December 25, 2021 dọrọ ndị mmadụ aka na nti ka ha mata na Chinmark group nke nọ n'okpuru aha Fin Africa Investment Limited edenyeghị aha azụmahia ya n'akwụkwọ SEC ma na-ekwu na onye ọbụla ya na ha na-emekọ ihe, ihe ọ hụru ya jiri isi ya buru.

Kedụ ụlọọrụ bụ Chinmark Group?

Ụlọọrụ Chinmark Group dịka ha siri kọwa na websaiti ha bụ ụlọọrụ nwere ọtụtụ alaka nke gụnyere ewumewu ụlọ (Chinmark Homes and Shelter) ọrụugbo ( Chinmark Farms, njem (Chinmark Rides), erimeri(Chinmark Restaurant & Foods services) wdgz.

Isiụlọọrụ ahụ dị na 162 Ogui Road, Enugwu.

Udiri ihe a ometụla mbụ na Naịjiria?

Ihe na-eme n'ụlọ ọrụ Chinmark ugbua yitere atụmaatụ MMM nke a na-akpọ "Mavrodi Mundial Moneybox" na bekee.

Ndị nwe atụmaatụ a kwuru na ha ji ya enyere ndị mmadụ aka mana ụlọakụ ukwu (Central Bank of Nigeria) gọọmenti Naịjirịa dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha gbara ya bụ atụmaatụ ọsọ.

N'ọnwa Aprelu nke afọ 2018 ka ndị nwe ya bụ atụmaatụ gwara ndị mmadụ na ha gbachiri ọnụ ụzọ ha maka onyeisi ha bụ Sergie Mavrodi anwụọla.

Ọtụtụ ndị mmadụ si mba Ghana, Kenya nakwa Naijirịa tufuru ọtụtụ ego mgbe aka bidoro gbajiwe atụmaatụ a n'afọ 2016.