Chinmark investment: Ihe i nwere ike ime iji nweta ego i tinyere n''investment' akụkọ bara - Johnson Chukwu
Ndị igbo si na mmadụ agaghị anọ na mmiri ma ncha abanye ya n’anya, ya mere BBC Igbo ji gba mbọ wetere ndị mmadụ ihe ha kwesiri ima maka itinye ego n'ụlọọrụ ndị 'investment'.
Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ egwu ugbua banyere ụlọọrụ azụmahịa nakwa nke ndị na-eji ego achụ ego ma na-ekwe nkwa ha anaghị emezu, lee ihe otu nwoke aha ya bụ Johnson Chukwu bụ onye ọkacha mara n’ihe gbasara ego na azụmahịa kwuru maka etu mmadụ ga-esi mara ụlọọrụ ego bụ nke ọma na nke bụ nke aghụghọ.
Ọtụtụ ndị mmadụ abanyela n'ụgbọ bufere ha site n'ụzọ ụlọọrụ ndị 'investment' maọbụ ụzọ ụlọọrụ isusu nke aghụghọ dị ịcheịche.
Otu n’ime ha wuru ewu bụ MMM nke gọọmentị Naịjirịa dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara itinye ego ha n’ime ya mana ọtụtụ egeghị ya bụ ndụmọdụ ntị.
Ụlọọrụ MMM mechara kụsasịa ma buru ego ndị mmadụ gba ọsọ n’afọ 2019.
Ụjọ ji ndị mmadụ ugbua ọkachasị dịka akụkọ otu ụlọọrụ akpọrọ Chinmark Group pụtara ihe ebe ọtụtụ na-ebo ha ebubo na ha nakọtara ndị mmadụ ego ma ghara ịkwụchị ha ya dịka ha si kwee na nkwa.
Dịka a ka na-enyo okwu ụlọọrụ a enyo, kirie ihe onyonyo a ka ị hụrụ ihe onye ọkacha mara kwuru banyere itinye ego n’ụlọọrụ ndị na-eji ego achụ ego site n’ụzọ Bekee kpọrọ ‘investment’.
Akụkọ ndị yitere nke a:



