Chinmark Group investments: Gbagharanu m maka ọrụ m rụrụ n'ihe gbasara ya - Amanda Chisom
Amanda Chisom, bụ onye a ma ama na soshal midia, arịọla mgbaghara maka oke ya n’ịkpọta ndị tinyere ego ha n’ihe gbasara iji ego achụ ego nke ụlọọrụ Chinmark Group.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere, Chisom kwuru na enweghi mgbe o ji buru n’obi ịkpọkọta ndị mmadụ gwuo ha wayo maọbụ ghọgbuo ha.
Ihe jikọrọ Amanda Chisom na Chinmark
Amanda Chisom kọwara na ọ matara Chinedu Marksman Ijiomah (Chinmark) kemgbe afọ 2011.
O kwukwara na Chinmark mere ya ‘Global Ambassador’, mana enweghi ụbọchị ọbụla ha binyere aka n’akwụkwọ gbasara ya.
O kwuru na o che na ihe ọ na-eme kwụ ọtọ, na ọ dịghị ka ihe adịgboroja, mere o ji kwado ya ma tinyekwa ego nke ya ugboro ugboro n’ime ya bụ atụmatụ ma rite uru n’elu ya.
Chisom gwara BBC Igbo etu o si nye Chinmark ndụmọdụ ebe Septemba afọ 2021 ka ọ kwụsị ịnara ndị mmadụ ego na-etinye n’azụmahịa ya.
O kwuru na na egwu na-atụ ya n'ihi etu ọtụtụ ụlọorụ ndị na-anara ndị mmadụ ego ha iji achụ ego na-akpụ afọ n’ala.
Ọ sị na ihe mere o ji gwa ya okwu a bụ na ọ chọghị ka ndị mmadụ kpụrụ ya n’ọnụ ma ọ bụrụ na Chinmark mechaa kpụọ afọ n’ala, n’ihi na ọ bụ onye a ma ama.
O kwuru na Chinmark gwara ya depụtara ya usoro ọ ga-esi emechi ya bụ atụmatụ. Ọ gwakwara ya na ọ naghị ekwe ka ndị riterela uru n’ego ha tighachịkwa ya.
Ọ kọwara etu o si gakwuru ndị ọrụ Chinmark na-ajụ ha ihe mere na ha akwụbeghi ndị mmadụ ụgwọ nakwa etu e si sị ya kwụsị ikwu okwu gbasara ụlọọrụ ahụ na soshal midia ya.
Maka ndị na-ata ya ụta, Chisom kwuru na ọ ghọtara ebe ha si abịa na ihe mere ha ji ebo ya ebubo ndị dị aṅaa.
Ọ gara n’ihu sị ka ha bịa gbakọọ aka mara etu a ga-esi gboo ya bụ nsogbu dapụtara ugbua, n’ihi na ihe kacha mkpa bụ ịhụ na ego ndị mmadụ pụtara.
O kwuru na ọ na-ewute ya na a na-akpụ ugwu ya n’ala ma na-akpọ aha ya dịka onye gwuru ndị mmadụ wayo.
O kwuru na ebe ọ kwụ ugbua bụ ịhụ na ọ gbara mbọ etu ike ya ruru, ịhụ na ndị mmadụ nwetara ego ha.
Kedụ etu ndị mmadụ siri mara na nnu aṅaala ofe n'okwu ụlọọrụ Chinmark?

Ebe foto si, Amanda Chisom/Instagram
Ngalaba Securities & Exchange Commission (SEC) nke Naịjirịa depụtara n'ọba ozi webụsaiti ha akwụkwọ ozi katọrọ atụmaatụ oji ego achụ ego nke ụlọahịa Chinmark Group n'akwụkwọ ozi ahụ bu deeti December 25, 2021.
Ha dọrọ ndị mmadụ aka na nti ka ha mata na Chinmark group nke nọ n'okpuru aha Fin Africa Investment Limited edenyeghị aha azụmahia ya n'akwụkwọ SEC ma na-ekwu na onye ọbụla ya na ha na-emekọ ihe, ihe ọ hụru ya jiri isi ya buru.
Nke a eme ka ndị ụlọọrụ ọba ego amachie ego niile ụlọọrụ Chinmark n'ọba ego ha.
O mere ka ndị niile tinyere ego karịrị mmadụ puku anọ.

Ebe foto si, Chinmark/Facebook
Kedụ ụlọọrụ bụ Chinmark Group?
Ụlọọrụ Chinmark Group dịka ha siri kọwa na websaiti ha bụ ụlọọrụ nwere ọtụtụ alaka nke gụnyere ewumewu ụlọ (Chinmark Homes and Shelter) ọrụugbo ( Chinmark Farms, njem (Chinmark Rides), erimeri(Chinmark Restaurant & Foods services) wdgz.
Isiụlọọrụ ahụ dị na 162 Ogui Road, Enugwu.
Gịnị mere ụlọọrụ Chinmark?
N'ọdị nso a ka ngalaba gọọmentị a na-akpọ 'Securities and Exchange Commission' kwuru na ụlọọrụ ahụ bụ nke adigboroja, ma mechie ya.
Ndị SEC jichikwara ego niile ụlọọrụ ahụ nwere n'ụlọakụ nke pụtara na ha enweghị ike ịkwụ ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ego ha na ya bụ ụlọọrụ ụgwọ ọmụrụnwa ha.
Mana Chinedu Marksman kwuru na ha na-aga ije ya iji mata ma SEC ọ ga-akpọpere ha ọbaego ha niile.

