Chinmark: Chinedu Marksman bụ enyi m, agaghị m agọnahụ ya, ọ naghị agba ọsọ - Harrison Gwamnishu
Harrison Gwamnishu bụ nwa okorobịa a ma ama na soshal midia maka inyere ndị mmadụ aka n'ụzọ dị icheiche.
Mana ugbua, ndị mmadụ kpụ aha ya n'ọnụ dịka ụlọọrụ ọ na-etiburu mkpu, bụ Chinmark, mechiri.
Chinmark bụ ụlọọrụ nke onye nwe ya bụ Chinedu Marksman Ijioma.
Gwamnishu kọwara na ya na Chinedu Marksman mabu n'oge gara aga tupu ọ malite ụlọọrụ Chinmark.
O kwukwara na Chinmark na-enyetụ ya ego iji nyere ndị mmadụ nọ na mkpa aka.
Mana ya onwe ya bụ Gwamnishu abụghị onye otimkpu Chinmark, ọ bụghị onye nnọchite anya ha, ego ya adịghịkwanụ n'ụlọọrụ ahụ.
"Ihe m na-eme bụ na ana m ekesa ozi gbasara ụlọọrụ Chinmark n'akara Facebook m," Gwamnishu kwuru.
"Onweghị onye ọbụla m kpụụrụ n'aka ka o tinye ego ya n'ụlọọrụ Chinmark."
"Onye ọbụla hụrụ ihe Chinmark nwere n'ebe dị icheiche ga-enwe mmasị itinye ego ya n'ụlọọrụ ahụ."
"Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji tinye ego ha, mana ị hụlanụ etu ya bụ ihe si dị ugbua."
Gwamnishu kwuru na ego ndị mmadụ agaghị efu, maka na ụlọọrụ Chinmark nwere ọtụtụ ihe ha nwere ike ire iji kwụghachi ndị mmadụ ego ha.
Kama ọ nyere ndị tinyere ego n'ụlọọrụ ahụ ndụmọdụ ka ha bịakọta ọnụ, ka ya onwe ya bụ Gwamnishu kpọrọ ha gakwuru Chinedu Marksman ka ha mara etu ha ga-esi mee ya bụ ihe.
Gịnị mere ụlọọrụ Chinmark?
N'ọdị nso a ka ngalaba gọọmentị a na-akpọ 'Securities and Exchange Commission' kwuru na ụlọọrụ ahụ bụ nke adigboroja, ma mechie ya.
Ndị SEC jichikwara ego niile ụlọọrụ ahụ nwere n'ụlọakụ nke pụtara na ha enweghị ike ịkwụ ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ego ha na ya bụ ụlọọrụ ụgwọ ọmụrụnwa ha.
Mana Chinedu Marksman kwuru na ha na-aga ije ya iji mata ma SEC ọ ga-akpọpere ha ọbaego ha niile.

Ebe foto si, Chinmark/Facebook
Onye bụ Chinmark?
Chinedu Ijomah na-ewu kemgbe na soshal midia maka etu ndị mmadụ si pụta na-ekwu na o kweghị akwụ ha ụgwọ o ji ha dịka ụfọdụ n'ime ha tinyere ego ha n'ụlọahịa ya iji nweta isi ego na ọmụrụnwa.
Ọ bụ onye a maaama ka onye ojiego achọ ego nwere ọtụtụ ụlọọrụ ebe ana-akọ ugbo, na-agbasa ozi ma na ụlọoriri.
Ndị mmadụ ma ya dịka onye na-enye ọha aka.
O lụọla nwunye ma mụkwa ụmụ.
Mana Chinedu Marksman kwuru na ha na-aga ije ya iji mata ma SEC ọ ga-akpọpere ha ọbaego ha niile.




