Ada Jesus burial : Lee ka o si aga n'akwamozu ọkpaọchi a

Foto Ada Jesus

Akwa na Anyammiri bụ ihe na-eru ka mmiri n'akwamozu Mmesoma Nnadi , onye ọkpachị a ma ama dịka Ada Jesus nke mere n'obodo dị ya bụ di ya n'ụbọchị Ejemewuru Oguta, Imo Steetị na Fraide(28/5/2021).

Ada Jesus nwụrụ n'abalị 21 nke ọnwa Eprelu ka ọ rịachara ọrịa nwa oge site n'ọrịa akịrị.

Ọ dị afọ nnaanị afọ 24 ka ọ nwụrụ.

Ndí ntorobía

Igwe mmadụ gụnyere ezinaụlọ, ndị enyi, ndị ọgọ na ọtụtụ ndị ntorobia jupụtara dịka e buru ozu ya site n'ụlọozu Aladinma gawa obodo di ya dị n' Ejemekwuru n'Oguta 2, n'Okpuru Ọchịchị Ugwuta n'Imo steeti.

Ụgbọ ozu e jiri buo ahụ Ada Jesus
Nkọwa foto, Ụgbọ ozu e jiri buo ahụ Ada Jesus

Ụzụ akwa tụrụ n'elu na ala, obere na nnukwu dịka ozu nwata nwaanyị ahụ wuru ewu karịa okenye na-alọta be ndị di ya.

Ndí bu ozu Ada Jesus, Nne Ada Jesus
Nkọwa foto, Arịrị e gbuo afọ mụrụ Ada Jesus

Nne, nna, okoro na agbọghọ chị anyammiri n'aka.

Akwamozu Ada Jesus
Akamozu Ada Jesus
Akwamozu Ada Jesus

E mechara bụga ya n'ama ụlọakwụkwọ ndị n'ogbe ahụ maka ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ.

Akwamozu Ada Jesus
Akwamozu Ada Jesus

Control Jay bụ onye na-ahaziri ya ihe ejije kwuru na "ekwebeghị m na ọ nwụọla".

'Echeghị m na o nwere onye ga-echezọ Ada Jesus n'afọ 50 na-abịa."

Ili ebe a kwadoro maka ídónye ozu Ada Jesus
Nkọwa foto, Ili ebe a kwadoro maka ídónye ozu Ada Jesus
Ídónye ozu Ada Jesus n'ili
Nkọwa foto, Ídónye ozu Ada Jesus n'ili