Mwakpo ndị ojiegbe mere n'ụlọụka Anglịkan n'obodo Lilu dị n'Anambra Steeti, lee ihe anyị ma

Ụlọụka na ụgbọala, ọgbatumtum na ngwo ngwo ndị ọzọ a gbara ọkụ na mwakpo ahụ.

Ebe foto si, Screen shot

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii Anambra Steeti akatọọla mwakpo ndị ojiegbe wakporo ụlọụka St. Andrews Anglịkan dị n'obodo Lilu nke okpuruọchịchị Ihiala nke steeti ahụ n'ụbọchị Sọnde 7 Disemba, 2025 mgbe ndị ụka na-efe ofufe.

Ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Anambra State bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ndị ojiegbe ahụ gburu otu onye, merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ ma gbaa ọtụtụ ụgbọala, ọgbatumtum nakwa akụkụ ụlọụka ahụ ọkụ.

O kwuru na mwakpo abụghị naanị ihe ọjọọ megide obodo kama ọ bụ imetọ ụlọ okpukperechi nakwa ikike ndị mmadụ nwere n'okpukperechi ha.

Ọ gara n'ihu tie ezinaụlọ ndị o metụtara aka n'obi, tinyere ndị obodo Lilu ma kwuo na ndị uweojii amalitela ime nnyocha ịchọpụta ma nwuchie ndị mere mwakpo ahụ.

Kedụ ndị ojiegbe si mee mwakpo ahụ

Akụkọ kwuru na mkpamkpa a mere n'ụtụtụ ụbọchị ụka, mgbe ndị mmadụ nọ n'ime ụlọụka na-efe ofufe, ndị ojiegbe wuchiri n'ebe ahụ ma malite ịgba egbe aghara aghara.

Nke a mere ndị mmadụ jiri na-agba aghara aghara n'ime ụlọụka iji zọọ isi onwe ha mana ndị a gbagburu otu nwaanyị a na-eche bụ nwunye ụkọchukwu ma merụọ ọtụtụ ndị ọzọ ahụ.

Ndị ojiegbe ahụ akwụsịghị ebe ahụ, ha gara n'ihu gbaa ọtụtụ ụgbọala na ọgbatumtum ndị mmadụ jiri bịa ụlọụka ọkụ ma gbaa ụfọdụ akụkụ ụlọụka ahụ ọkụ.

Dịka ọ dị ugbua a matabeghi kpọmkwem ndị bụ ndị ojiegbe ahụ, dịka ndị uweojii kwuru na ha ka na-eme nnyocha.

Nwakpo a na-abịa n'ime izuụka ole me ole ndị obodo Lilu malitere ịsụchasị ọhịa tojuru mbara ezi na okporoụzọ ha iji lọghachị azụ n'obodo site n'ọsọ ha gbara kamgbe ihe ruru afọ anọ n'ihi ọnọdu ọjọọ nke nchekwa n'obodo ha.

Lilu so n'otu n'ime ọtụtụ obodo dịka Isseke, Orsu-Ihiteukwa, Awo Idemmiri, Orsu ebe ndị mmadụ gbara ọsọ mgbe ndị ojiegbe a sị na-achọ mnwereowe Biafra na-akpa ike na mpaghara ahụ.

Mana na nso nso a, ọtụtụ ụmụafọ obodo ndị a malitere ịlọghachị azụ, na-azacha, na-ekpocha okporoụzọ ha iji malitekwa ndụ.