Donald Trump: Gịnị mere nwereonwe obodo Greenland ji bụrụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua?

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Maapụ Greenland

Ebe foto si, Reuters na BBC

Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na Maapụ Greenland
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Kemgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump banyere n'ụbọchị Monde, 20 Jenuwarị, 2025, obodo a na-akpọ Greenland so n'okwu a kpụ n'ọnụ kemgbe ahụ ma ruo taa.

Otu ihe na-ada ụda ugbua bụ mmasị Onyeisiala Trump nwere banyere obodo ahụ nakwa uru ọ bara maka nchekwa na akụnaụba mba Amerịka.

Onyeisiala Trump kwuru na ya nwere ntụkwasịobi na mba Amerika ga-enweta Greenland ka ọ bụrụ otu obodo n'ime Amerịka.

O kwuru na ndị mmadụ bi n'obodo Greenland bụ mmadụ 57,000 ma kwuo na ndị ahụ chọrọ ịbụ ndị Amerịka ma nwee mmasị ha na mba Amerịka inwe mmeko.

N'okwu ya "ọ dị m ka anyị a ga-enweta ha". "Anyị ga-enweta obodo Greenland".

Ebee ka Greenland di?

Maapụ Greenland
Nkọwa foto, Maapụ Greenland

Greenland bụ nnukwu obodo dị na mpaghara Artic nke oke osimiri gbara gburugburu.

Mmadụ ruru puku iri ise na isii (56,000) bụ ndị bi n'ime obodo ahụ dịka ndị amaala ya.

Mmiri oyi kpụkọrọ akpụkọ bekee kpọrọ 'ice' nọchiri ihe ruru pasentị iri asatọ (80%) ala obodo ahụ nke mere ndị mmadụ ji biri n'isi obodo ya a kpọrọ Nuuk.

Uru Greenland bara maka nchekwa na akụnaụba mba Amerịka

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump

Greenland bụ ebe mba Amerịka na Denmark nwere ọdụ ndịagha.

N'ikpeazụ a, a na-enwe mmasị n'ịmịpụta ihe ọnatarachị (uraniom na iron) dị na Greenland.

Ihe mere ọ jiri dị mfe ịweputa ihe ọnatarachị dị ebe ahụ bụ maka na mgbanwe ihuigwe na-enyereaka na-agbasa mmịrị gbara ọkpụrụkpụ nọchiri ala karịrị ọkara ala dị n'obodo ahụ.

Greenland bụ obodo dị n'etiti mba Amerịka na Yurop. Ọ bụ ụzọ kacha nso ị sị Amerịka gaa na mba dị iche iche na Yurop ma bụrụ ebe Amerịka nwere akụrụngwa nkanụzụ ha jị a ga n'ọnwa maọbụ n'ihu igwe.

Obodo ahụ nọ dịka ndị nweere onwe ha n'ime mba Denmark. Nke a pụtara na ha nwere gọọmentị nke ha mana ha nọkwa n'ime mba Denmark.

A na-atụ anya na ha nwereike iweta nweereonwe ha kpamkpam ma kwụrụ chịmchịm dịka otu mba n'ime mba ụwa. Nke a ga-enyere ha na mba Amerịka aka inwe mmekọrịta dịka mba na ibe ya.

Ihe Praịm Mịnịsta Greenland na nke mba Denmark kwuru

Praịm mịnịsta mba Denmark Mette Frederiksen

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Praịm mịnịsta mba Denmark Mette Frederiksen

N'agbenyeghị ihe Onyeisiala mba Amerịka na-ekwu, Praịm mba Denmark na nke Greenland ekwuola na 'a gaghị ere Greenland ere'.

Praịm Mịnịsta Greenland bụ Mute Egede kwuru na ọ bụ ndị obodo Greenland nwere ikike ikwu ihe ga-eme n'obodo ha.

Mana ọ rụtụkwara aka na mmekọ obodo ahụ na mba Amerịka n'ihe gbasara nchekwa na ịmịpụta ihe ọnatarachị ha.

N'aka nke ọzọ, Praịm Mịnịsta mba Denmark kwuru na "ọ bụ ndị Greenland nwe obodo ha" ma kwukwa na ọ bụ ndị obodo ahụ ga-ekwu ihe ha chọrọ.