Gịnị butere esemokwu n'etiti Onyeisiala Trump na Elon Musk?

Ndị ọrụ Trump kwuru na ya na Elon Musk ga-enwe mkparịtaụka n'ekwentị ụbọchị Fraịde 6 Juun, 2025.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Cheta na mmekọ Trump na Musk malitere oge Musk pụtara kwuo na ọ na-akwado Trump dịka onye ga-abụ onyeisiala na ntuliaka e mere na Novemba 2024.
    • Onye dere ya, Mike Wendling
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Esemokwu dị n'etiti Onyeisiala Donald Trump na-achị Amerịka na Elon Musk amalitela ịpụta ihe dịka Elon Musk katọrọ ụfọdụ atụmatụ ọchịchị Trump wepụtara.

Mmadụ abụọ a malitere inye onwe ha mkpaarị na soshal midịa ha dị iche iche.

N'ụbọchị Wenezde 4 Juun, 2025, Onyeisiala Trump kwuru na obi adịghị ya mma maka nkatọ ahụ Musk katọrọ atụmatụ ibelata ụtụisi ọchịchị ya wepụtara ma kwuo na mmekọrịta dị n'etiti ha abụọ enweela nsogbu.

N'aka nke ọzọ, Musk kwuru na ọ bụ nkwado o nyere Trump nyere ya mmeri na ntuliaka afọ 2024.

Ka ha kpaarịchara onwe ha na soshal midịa, Trump pụtara kwuo na ihe niile dị mma n'etiti ya na Elon Musk.

Ndị ọrụ Trump kwuru na ya na Elon Musk ga-enwe mkparịtaụka n'ekwentị n'ụbọchị Fraịde 6 Juun, 2025.

Musk kwukwara na ọ dị mkpa ka ya na Trump kpezie esemokwu a.

Gịnị na-esere ha?

Ihe kpatara esemokwu a bụ na Musk katọrọ iwu ụtụisi ọhụrụ Onyeisiala Trump wepụtara nke ụlọomeiwu nta Amerịka kwadoro. Ka ọ dị ugbua, akwụkwọ iwu ọhụrụ ahụ na-eche nkwado ụlọomeiwu Sineti.

Musk gbara arụkwaghịm dịka onyeisioche ụlọọrụ Department of Government Efficiency (Doge) dịka ọ nọrọ naanị ụbọchị 129 n'ọkwa ahụ.

Musk dere n'akara X ya na iwu ahụ jọgburu onwe ya ma kwuo na ndị niile kwadoro ya mere ihe ọjọọ.

O kwuru na iwu ahụ ga-etinye akụnaụba Amerịka na nsogbu ma gwa ndị nkwado ya ka ha kpọọ ndị na-anọchiteanya ha n'ụlọomeiwu maka nke a.

Oge ya na Onyeisi mba Jamini bụ Friedrich Merz gwara ndị ntaakụkọ okwu, Onyeisiala Trump kwuru na Musk maara ihe niile banyere iwu ụtụisi ọhụrụ ahụ ma kwuo na ọ ghọtaghị ihe na-ewe ya iwe maka ya.

A nwuchiri Epstein na Julaị 2019 maka ebubo imetọ na ịtụ mgbere mmadụ. O gburu onwe ya dịka ikpe ya na-aga n'ihu.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A nwụchiri Epstein na Julaị 2019 maka ebubo imetọ na ịtụ mgbere mmadụ. O gburu onwe ya dịka ikpe ya na-aga n'ihu.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Trump gara n'ihu kwuo na ọ bụ mwepụ gọọmenti wepụrụ ego mbeleta n'ụgbọala latrik nke nwereike imetụta ụlọọrụ Musk mere iwe ji ewe ya.

Na nzaghachi, Musk kwuru na ihe Onyeisiala Trump kwuru abụghị eziokwu ma gwa Trump ka ọ ghara imefu ego gọọmenti n'ihe na-enweghị isi.

Cheta na mmekọ Trump na Musk malitere oge Musk pụtara kwuo na ọ na-akwado Trump dịka onye ga-abụ onyeisiala na ntuliaka e mere na Nọvemba 2024.

Musk kwuru nke a ngwa ngwa otu onye chọrọ iji egbe gbagbuo Trump na Pennsylvania. Ọ gara n'ihu mapụta ego dị narị nde dọla abụọ na iri itoolu iji kwado achụmntavootu Trump.

Dika ụfọdụ akụkọ banyere esemokwu ha na-efegharị na soshal midịa, Musk gara n'ihu kwuo na ọ bụ nkwado ya nyere Trump mmeri na ntuliaka ahụ ma mee ka otu pati Repụblikan bụrụ ndị kachasị n'ụlọomeiwu Amerịka.

Musk kpọkuru ndị nkwado ya ma kwuo na oge eruola mgbe ha ga-ehiwe pati ọhụrụ nke ga-eme ka ebumnobi ụmụafo buru ụzọ.

Musk gara n'ihu dee ozi nke kwụrụ ka Onyeisiala Trump gbaa arụkwaghịm dịka onyeisiala Amerịka maka na iwu ọhụrụ o wepụtara ga-etinye akụnaụba Amerịka na nnukwu nsogbu.

O kwukwara na Trump pụtara n'ihe akụkọ nnyocha banyere Jeffrey Epstein nwụrụ anwụ e kwuru na o metọrọ ọtụtụ mmadụ.

A nwụchiri Epstein na Julaị 2019 maka ebubo imetọ na ịtụ mgbere mmadụ. O gburu onwe ya dịka ikpe ya na-aga n'ihu.

Trump nọ n'ọchịchị oge ahụ, kwuru na ọ maara Epstein dịka otu onye bi na Palm Beach mana ya na ya nwere esemokwu ọtụtụ afọ gara aga.

Ihe obi ọchịchị White House kwuru

Obi ọchịchị White House ekwuola na ebubo ndị ahụ abụghị eziokwu, ebe odeakwụkwọ Karoline Leavitt kwuru na iwe na-ewe Musk maka na ụfọdụ ihe ọ chọrọ adịghị n'iwu ọhụrụ a.

Trump wepụtara ozi n'akara soshal midịa 'Truth Social' ma kwuo na ọchịchị ya gbochiri atụmatụ ụfọdụ Musk wepụtara iji gbochie mmefu ijeri dọla ego gọọmenti.

Ụlọọrụ Musk gụnyere Tesla, SpaceX na Starlink nwere nkwekọrịta dị n'etiti ha na gọọmenti ma na-erita uru mwepụ ego mbeleta n'aka gọọmenti.

Onyeisiala Trump họpụtara Musk dịka onyeisioche Doge nke ọrụ ha bụ ibelata ego mmefu dị iche iche gọọmenti na-emefu.

Doge kwuru na ha gbochiri ego mmefu ruru ijeri $180 mana a na-ekwu na nke a abụghị eziokwu.