Trump akatọọla ndị Democrat, kwee nkwa dị iche iche

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuchaala okwu nnabata ya bụ nke gụnyere okwu nkatọ megide ọchịchị pati Demokrat pụrụ apụ ma kwe nkwa maka ihe ọma ndị ga-abịa.
Dịka Onyeisiala pụrụ apụ bụ Joe Biden na ndị Demokrat nọ ya n’azụ, Trump kwuru na ya ga-atụgharị “aghụghọ ọjọọ” nke e mere na mba ahụ.
Ọ bara mba megide ihe ọ kpọrọ “nrụruaka ehibere maka ịnapụ mba anyị ikike na akụnaụba ya”.
“Ihe niile ndị a ga-agbanwe malite n’ụbọchị taa,” ka Trump kwuru.
O kwere nkwa ịgbanwe aha Gulf of Mixico ka ọ bụrụzie “Gulf of America”, iweghachite Panama Canal nakwa ileba anya n’okwu gbasara ọkụ na ndị mbịarambịa.
Dịka Trump siri kwuo “Amerịka ga-ahụta onwe ya ọzọ dịka mba na-eto eto” ma kwe nkwa na ọ ga-amụba akụnaụba na okeala mba Amerịka.





