E duola Donald Trump n’iyi ọrụ dịka onyeisiala Amerịka

Ihe niile gbasara etu e si edu Trump iyi ọrụ ka ọ na-alaghachite dịka Onyeisiala mba Amerịka

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere

  1. Trump akatọọla ndị Democrat, kwee nkwa dị iche iche

    Trump akatọọla ndị Democrat, kwee nkwa dị iche iche

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwuchaala okwu nnabata ya bụ nke gụnyere okwu nkatọ megide ọchịchị pati Demokrat pụrụ apụ ma kwe nkwa maka ihe ọma ndị ga-abịa.

    Dịka Onyeisiala pụrụ apụ bụ Joe Biden na ndị Demokrat nọ ya n’azụ, Trump kwuru na ya ga-atụgharị “aghụghọ ọjọọ” nke e mere na mba ahụ.

    Ọ bara mba megide ihe ọ kpọrọ “nrụruaka ehibere maka ịnapụ mba anyị ikike na akụnaụba ya”.

    “Ihe niile ndị a ga-agbanwe malite n’ụbọchị taa,” ka Trump kwuru.

    O kwere nkwa ịgbanwe aha Gulf of Mixico ka ọ bụrụzie “Gulf of America”, iweghachite Panama Canal nakwa ileba anya n’okwu gbasara ọkụ na ndị mbịarambịa.

    Dịka Trump siri kwuo “Amerịka ga-ahụta onwe ya ọzọ dịka mba na-eto eto” ma kwe nkwa na ọ ga-amụba akụnaụba na okeala mba Amerịka.

  2. Ihe mbụ Donald Trump kwuru dịka Onyeisiala mba Amerịka

    Ihe mbụ Donald Trump kwuru dịka Onyeisiala mba Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump agwala ụmụ amala mba ahụ okwu mbụ ka e duchara ya n’iyi ọrụ.

    Trump kwuru sị na ya “ga-eme ka Amerika bụrụ ihe mbụ n’ọchịchị ya”.

    Ọ siri na a mụọla mba ahụ ọhụrụ ma kwuo na “nchekwa ga-atọ atọ na mba ahụ ma mee ka ikpe ziri ezi dị”

    “Anyị ga-abụ obodo nwere akụnụụba ọzọ”

    “Isi sekpụ ntị bụ na anyị ga-eme ka mba anyị nwee ọganihu ma mee ka ndị mmadụ ghara ịnọ n’agbụ.”

  3. E duola Donald Trump n’iyi ọrụ dịka onyeisiala Amerịka

    E duola Donald Trump n’iyi ọrụ dịka onyeisiala Amerịka

    Ebe foto si, Getty Images

    E duola Onyeisiala ọhụrụ nke mba Amerịka bụ Donald Trump n’iyi ọrụ nke mere ya onyeisiala nke iri anọ na asaa na mba Amerịka.

    E ji akwụkwọ nsọ abụọ duo Trump n’iyi ọrụ, otu bụ nke nne ya nyere ya ebe nke ọzọ bụ akwaụkwọ nsọ Lincoln.

    Akwụkwọ nsọ Lincoln bụ nke eji edu ndị isiala mbụ chịbụrụ mba Amerịka nke gụnyere Abraham Lincoln n’afọ 1861.

    Trump kwere nkwa na ọ ga e chekwa ma chebe iwu nke mba Amerịka.

  4. Biden anabatala Donald Trump na White House

    Biden anabatala Donald Trump na White House

    Onyeisiala na-apụ apụ bụ Joe Biden na nwunye ya bụ Jill nabatara Donald Trump na Melania na White House ebe ha ga-anọdụ ala tupu ha agawa Capitol.

    Nke a bụ nke mbụ mmadụ abụọ ahụ na-ahụkọrịta onwe ha n’ụbọchị taa.

    A hụrụ ndị ezinaụlọ Trump ka ha na-abanye n'ụlọ Capitol, ebe idu onyeisiala n’iyi ọrụ ga-aga n'ihu.

    Ọchịchị Trump na-abata na-egosi na ọ ga-ekwupụta "ihe mberede mba" banyere okeala mba Amerịka na Mexico, tinyere ọtụtụ ọrụ ndị isi ndị ọzọ - nke a ga-ekwuputa ma e mechaa taa.

  5. Donald Trump awụchiela n’obi ọchịchị White House dịka emume idu n’iyi ọrụ na-amalite

    Donald Trump awụchiela n’obi ọchịchị White House dịka emume idu n’iyi ọrụ na-amalite

    Donald Trump na ndị ezinaụlọ ya nke gụnyere Ivanka Trump abịala na Capitol Hill dịka emume idu ya n’iyi ụrọ na-amalite.

    Ndị ezinaụlọ Trump agawala n’ụlọ ọchịchị mba Amerịka bụ White House ebe a ga-edu ya n’iyi ọrụ dịka ha gachara ụka n’ụlọụka dị na Washington DC.

    Ndị so ya gaa ụka gụnyere ọtụtụ ndị siri ike na teknụzụ na mba ụwa nke gụnyere Mark Zuckerberg nwe ụlọọrụ Meta, Jeff Bezos nke Amazon, Sundar Pichai nke Google na Tim Cook nke Apple.

    A ga-eme emume idu Donald Trump n’iyi ọrụ bụ ihe a na-emekarị n’ogige US Capitol n’ime ụlọ maka ọnọdụ ọjọọ nke ihu eluigwe.

    Onyeisiala bụ Trump ga-agwa mba Amerịka okwu mgbe e duchara ya n’iyi ọrụ tupu ọ gawa emume atọ nke gụnyere oriri n’oge mgbede.

  6. Donald Trump: Etu idu n'iyi ọrụ Onyeisiala mba Amerịka si aga

    Oge Donald Trump na nwunye ya zutere Onyeisiala Joe Biden n'obi Ọchịchị White House

    Ebe foto si, Getty Images

    Nkọwa foto, Oge Donald Trump na nwunye ya zutere Onyeisiala Joe Biden n'obi Ọchịchị White House

    Onyeisiala mba Amerịka Joe Biden anabatala Donald Trump na nwunye ya n’obi ọchịchị White House dịka emume idu Trump n’iyi ọrụ na-amalite.

    Jill Biden bụ nwunye Onyeisiala Biden so nabata Donala Trump na nwunye ya.

    Cheta na Donald Trump achịbuola mba Amerịka site na Jenụwarị 2017 ruo Jenụwarị 2021.