Ọ bụghị maka mgbasaozi Awo-Omamma ka anyị ji machie Nonso Nkwa na Ozisa FM - NBC

Ozisa FM

Ebe foto si, Ozisa 96.1 fm/ Chinonso Uba NonsonkwaFM

Ụlọọrụ na-achịkọta mgbasaozi ikuku na Naịjirịa, a kpọrọ 'National Broadcasting Commission' akọwaala ihe mere ha ji mechie ụlọọrụ mgbasaozi redio bụ Ozisa FM nke dị n'Owere, Imo steeti.

Franca Aiyetan, onye ji ọkwa ngalaba a kpọrọ 'Broadcast monitoring' na NBC gwara BBC Igbo n'ekwentị na ụlọọrụ ahụ dara iwu na-achịkọta mgbasaozi na Naịjirịa.

Aiyetan kwuru na otu onye ọrụ Ozisa FM aha ya bụ Chinonso Uba, onye e ji Nonso Nkwa mara, gahiekwara megide ọtụtụ iwu NBC.

Ndị mmadụ na-ekwu na Soshal midia na ihe mere e ji mechie Ozisa FM bụ maka na ha gbara ihe niile gbasara mwakpo e mere n'obodo Awo-Omamma n'anwụ.

Mana Franca Aiyetan kwuru na nke ahụ abụghị eziokwu.

"Ọkpụrụkpụ iwu anọ ka Ozisa FM na onye ọrụ ha bụ Nonso (Nkwa) megidere, nke mere anyị ji machie ha," Aiyetan kọwara.

"Nke mbụ bụ na ikike nke Ozisa FM ji arụ ọrụ bụ nke a na-akpọ 'Community License', nke a pụtara na ọ bụghị ozi niile ka ha nwere ikike ịgbasa. Mana ha gahiere iwu a."

"Nke abụọ bụ na iwu mgbasaozi megidere onye ntaakụkọ isonye n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị, mana nnyocha anyị gosiri na Nonso (Nkwa) bụ onye pati ADC (African Democratic Congress).

Iwu NBC

Ebe foto si, NBC Code 5.3.5

Nkọwa foto, Ngalaba 5.3 nke iwu ndị NBC kwuru na ụlọọrụ maọbụ onye mgbasaozi ekwesịghị ịkpa agwa iji gosi na ọ na-akwado otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla.

"Nke atọ bụ na iwu megidere onye ntaakụkọ ka nọ n'ọrụ ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla, mana anyị chọpụtara na Nonso (Nkwa) na-azọ ọkwa ọchịchị na pati ADC."

"Nke anọ bụ na anyị adọbuola ya aka ntị site n'inye ya ntaramahụhụ ọnwa isii n'ọnwa Febrụwarị afọ a, mana o geghị ntị."

Franca Aiyetan kwuru na ha emechighi Ozisa FM kpamkpam kama ọ bụ abalị iri atọ ka wepuru redio ahụ n'ikuku iji dọọ ha aka na ntị.

Ihe Nonso Nkwa kwuru

Nonso Nkwa

Ebe foto si, Theodore Chinonso Uba NonsoNkwa

Oge BBC Igbo kpọrọ Nonso Nkwa n'ekwentị, o kwuru na ebubo niile ndị NBC na-ebo ya achịtaghị aja.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na ya na-apụta ịzọ ọkwa ọchịchị, mana "onweghị iwu ọbụ machiri m iso n'otu ndọrọndọrọ maọbụ ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla".

"Ihe iwu kwuru bụ na mmadụ kwesịrị itinye akwụkwọ arụkwaghịm ma ọ fọdụ abali iri atọ tupu ntuliaka," Nonso Nkwa kwuru.

"Abụghị m onye ọrụ gọọmentị, ọ bụghị gọọmentị na-akwụ m ụgwọ, iwu emegideghị m ịzọ ọkwa ọchịchị."

Nonso Nkwa gakwara n'ihu kọwaa na ụlọọrụ ya gwara ya ka ọ gaa ọzụzụ otu ọnwa, "mana ama m na ọ bụ akaọrụ ndị iro m, maka ọrụ m na-arụ."

"Abụ m ọnụ na-ekwuru ụmụ ogbenye na ndị na-enweghị ọnụ okwu, ọ bụ ya ka ọtụtụ ndị ọchịchị, ọ kacha n'Imo steeti, jiri kpọọ m asị."

Ihe Ozisa FM kwuru

Ozisa

Ebe foto si, Ozisa 96.1 FM

Ụlọọrụ Ozisa redio wepụtara akwụkwọ ozi ma kwuo na NBC emechighi ụlọọrụ ha kpamkpam, kama ọ bụ nkwụsịtụ ọrụ nwa mgbe nta.

Ha kwuru sị: "Anyị na ndị ọ dị n'aka na-enwe mkparịtaụka maka nke a ugbua... Anyị na-arịọ mmadụ niile ka ha kwụsị ikwu okwu maọbụ ikesa ozi nwereike ịkpalite ọgbaaghara."

Ozisa Fm kọwakwara na ọ bụghị ụlọụka Katọlik nwe ya bụ ụlọọrụ, kama ọ bụ otu a na-akpọ 'Ozisa Foundation for Peace and Social Development.'