Anyị achọghịzi ndị Ebube Agu - Ụmụnwaanyị Oguta

Ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe

Ụmụnwaanyị ndị obodo Amaeche nke dị n'okpuruọchịchị Oguta, n'Imo steeti, emeela ngagharịiwe iji katọọ ọrụ ndị otu nche a na-akpọ Ebube Agu.

Ha mere ngagharịiwe a b'ụtụtụ taa bụ Mọnde, abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Julaị 2022.

Nke a na-abịa dịka ndị obodo ahụ kwuau na ndị Ebube Agu gbagburu otu onye ntorobịa obodo ahụ aha ya bụ Kelechi Ogbonna n'ụbọchị ụka, Julaị 24, 2022.

Oguta
Nkọwa foto, Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii kwuru na ya ga-eburu ozi ụmụnwaanyị ahụ bugara ndị isi ya

Ụmụnwaanyị ahụ yicha akwa ojii ma na-agụ egwu mwute dịka ha bu ngagharịiwe ahụ gaa n'isi ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo ha.

Onye ndu ụmụnwaanyị ahụ bụ Nkiru Ugoagwu gwara ndị uweojii na ihe ha chọrọ bụ ka onye maọbụ ndị gburu nwa ha nwoke bụ kelechi, nweta ntaramahụhụ kwesịrị ya.

"Obi na-agbawa anyị maka ọnwụ nwa anyị bụ Kelechi. Ọnwụ ya agaghị abụ n'efu," oriaku Ugoagwu kwuru.

"Anyị na-akpọkụ onyeisi okpuru ọchịchị a, Gọvanọ Imo Steeti bụ Hope Uzodinma, Onyeisiala muhammadu buhari, nakwa otu Amnesty International ka ha gbatara anyị ọsọ enyemaka."

N'okwu nke ya, onyeisi ndị uweojii kelere ụmụnwaanyị ahụ maka etu ha si mee ngagharịiwe ahụ n'ụzọ udo.

O kwere nkwa na ya ga-eburu ozi ha bugara ndị isi uweojii ka ha leba ya anya ma mee ihe kwesịrị ekwesị.

Kedụ ndị bụ ndị Ebube Agu?

Ebube Agu
Nkọwa foto, Naanị n'Ebonyi Steeti ka gọọmentị hiberela ndị ọrụ nchekwa 'Ebube Agu', mana amaghị ndị na-eji aha ndị nche a arụ ọrụ n'Imo Steeti
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ebube Agu bụ otu nchekwa nke ndị gọvanọ na-chị steeti ise dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kwekọrịtara ihibe iji wulite nchekwa na mpaghara ahụ.

Mana kamgbe ha nwechara nkwekọrịta ahụ n'ọgbakọ ha nwere n'Enugwu n'afọ 2021, ọ bụ naanị gọọmentị Ebonyi Steeti hibere ya bụ otu nche kpọmkwem.

Akụkọ na-ekwu na e nwere otu nche a na-akpọ Ebube Agụ, nke na-arụ ọrụ n'Imo Steeti, mana o nweghị onye ma kpọmkwem ndị ha bụ.

Opekata mpe ihe karịrị mmadụ iri abụọ ka e borola ebubo na ndị Ebube Agụ gburula n'Imo Steeti.

BBC Igbo agbaala mbọ ugboro ugboro ịnụ n'ọnụ gọọmentị Imo steeti gbasara ndị bụ ndị Ebube Agua, mana mbọ ahụ enwebeghị isi n'ihi na onwebeghị onye ọrụ gọọmentị kwere ịkọwara anyị.

Onweghịkwa onye ma onye bụ onyeisi ndị otu nche a ruo ugbua.

Cheta na enweghị nchekwa n'Imo steeti nakwa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ rịrị elu nke ukwuu, dịka ndị ekperima wakpochara ụlọ mkpọrọ dị n'Owere, n'afọ 2021, ma tọhapụ ndị mkpọrọ niile nọ ebe ahụ.

Gọọmentị Naịjirịa na-ekwu na ọ bụ ndị otu ọgụ nnwereonwe a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra' kpara ike ọjọọ ahụ, mana ndị IPOB kwuru na ọ bụghị ha.