Abaribe, Alex Ikwechegh abụghị ndị a pụrụ ịtụkwasị obi - APGA

Ebe foto si, Enyinnaya Abaribe/ Alex Ikwechegh/ APGA
Osote Onyeisioche pati All Progressives Grand Alliance (APGA) na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ Augustine Ehiemere eboola ebubo na Enyinnaya Abaribe na Mascot Ikwechegh abụghị ndị a pụrụ ịtụkwasị obi n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.
Nke a na-abịa dịka otu ahụ gwara ha abụọ ka ha pụọ n'oche ha nọ n'ụlọọmeiwu dịka ha abụọ pụrụ n'Apga banye n'otu ADC na Labour Party'.
Ehiemere boro ebubo a oge ọ na-asa okwu gbasara ọpụpụ Abaribe pụrụ banye n' otu ADC, Ikwechegh pụọ, banye 'Labour Party'' (LP).
"E kwesịghị ịtụkwasị ha obi n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị."
O kwuru na o nwebeghị oge ọbụla Ikwechegh "wetara ọganihu na pati anyị".
Ehiemere gara n'ihu boo ebubo sị,"Ya(Ikwechegh) na ndị isioche pati anyị n'Aba North nakwa Aba South nwere nzukọ, tinyere ndị ndu ụmụnwaanyị na ndị ndu ndị ntoroọbịa ha, o megherie ha anya ka ha soro ya pụọ tupu ọ gbaa arụkwaghịm na pati anyị."
Maazị Ehiemere gbakwunyere na ọ naghị ewute pati APGA na Ikwechegh pụrụ n'otu ahụ n'ihi na ọ bụghị onye a pụrụ ịtụkwasị obi.
Nke a na-abịa dịka ngalaba pati All Progressives Grand Alliance (APGA) n'Abịa Steeti gwara Enyinnaya Abaribe na Alex Mascot Ikwechegh ka ha gbahapụ oche ha n'Ụlọomeiwu Etiti, n'ihi na ha hapụrụ pati ahụ banye na pati ndị ọzọ.
Ka ọ dịugbua, Abaribe na Mascot Ikwechegh azaghị ekwentị ha nke ha na-asa ozi BBC Igbo ezigarala ha n'ekwentị tupu anyị bipụta akụkọ a.
Maka ịgafe na pati ọzọ: APGA agwala Abaribe na Ikwechegh ka ha gbaa arụkwaghịm

Ebe foto si, Enyinnaya Abaribe/Facebook, Alex Ikwechegh/X
Ngalaba pati All Progressives Grand Alliance (APGA) n'Abịa Steeti agwala Enyinnaya Abaribe na Alex Mascot Ikwechegh ka ha gbahapụ oche ha n'Ụlọomeiwu Etiti.
Ọkpụkpọ oku a na-abịa dịka ndị omeiwu abụọ ahụ gbahapụrụ pati APGA ma banye n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ndị ọzọ.
Enyinnaya Abaribe hapụrụ APGA banye n'otu African Democratic Congress (ADC), ebe Alex Mascot Ikwechegh banyere Labour Party (LP).
APGA kwuru na ndị omeiwu abụọ ahụ kwesịrị ịgba arụkwaghịm n'ihi na ọ bụ ọkọlọtọ pati ha ka e ji họpụta ha n'ọkwa ọchịchị.

Ebe foto si, APGA/X
Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'Aba, Odeakwụkwọ Mgbasaozi APGA n'Abịa Steeti bụ Chukwuemeka Nwokoro kwuru na ọpụpụ mmadụ abụọ ahụ atụghị ndị otu ahụ n'anya.
O kwenyere na ọpụpụ Abaribe na Ikwechegh emeela ka APGA nwere onwe ha "n'agbụ ndọrọndọrọ ọchịchị".
APGA kpọrọ oku ka ndị omeiwu abụọ ahụ gbahapụ ọkwa ha n'Ụlọomeiwu Etiti na-egbughị oge n'ihi na ọ bụ aha otu ahụ ka e jiri tinye ha n'ọkwa.
APGA kwetara na isite n'otu pati fere n'ọzọ bụ otu njirimara ọchịchị onye kwuo uche ya na Naịjirịa, kama ha gbara isi akwara na ọpụpụ ndị omeiwu abụọ ahụ enweghị ka ọ ga-esi metụta ọganihu ha.
Ha bokwara ebubo na Abaribe na Ikwechegh atụnyeghị nnukwu oke maka uto nke pati ahụ n'Abịa Steeti oge ha bụụrụ ndị ndu ya.
APGA kọwakwara omume Abaribe na Ikwechegh dịka mgba okpuru megide ọganihu nke pati ahụ n'Abịa Steeti.





























