Ihe EEDC sara dịka Edochie, ndị ọrụaka na ndị ọzọ na-akwa arịrị maka mmefu ego n'ihi ụkọ ọkụ latrik n'Ọwụwa Anyanwụ

Ụlọọrụ na-ekesa ọkụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ EEDC ekwuola na ihe mere ọnọdụ ọkụ latrik ji kawanye njọ na mpaghara dị iche iche n'Ọwụwa Anyanwụ bụ n'ihi nsogbu gaasị.
Nkọwa a na-abịa dịka onye na-eme ejije Nollwood nwere agba bụ Pete Edochie kwara arịrị na ụkọ ọkụ mere ya ọ na-emefu nnukwu ego n'ịzụ mmanụ ụgbọala na diesel kwa ụbọchị.
Nsogbu ọkụ latrik akawanyela njọ kemgbe ọnwa ole na ole na mpaghara dị iche iche na Naịjirịa gụnyere Ọwụwa Anyanwụ.
N'ozi ha wepụtara n'ụtụtụ Mọnde abalị 9 nke ọnwa Maachị, afọ 2026 n'ọbaozi X, isi ụlọọrụ na-emepụta ọkụ latrik na Naịjirịa bụ 'National Grid' kwuru na ọkụ Naịjirịa na-emepụta ugbua kwụ na megawaatị 2,980.
Nke a bụ nkụda pasentị 20.4 n'ihe ọ bụ otu ọnwa gara aga (n'abalị itoolu oge ọ bụ megawaatị 3,742).
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ EEDC n'Enugwu bụ Emeka Eze kọwaara BBC Igbo na ihe kpatara ọkụ ji kọọ n'Enugwu nakwa mpaghara ndị ọzọ n'Ọwụwa Anyanwụ bụ maka na ọkụ a na-enye ha site n'aka ụlọọrụ 'Transmission Company of Nigeria' (TCN) pere mpe karịa ka e si enyebu ha na mbụ.
"Ọkụ adịghị ka ọ na-adị. Kwa ụbọchị anyị na-enweta òkè ọkụ mana òkè ọkụ anyị agbatuola nke na o nweghị ebe ọ na-eru anyị."
"Ụfọdụ ndị na-enwetabu ọkụ awa 20 dịka ndị nọ na 'Band A', o nweghị ka anyị ga-esi nwetali ọkụ anyị ga-enye ha."
Eze kwuru na, "Ebe e nwere ihe ịmaaka n'ihu bụ ndị na-emepụta ọkụ, e nwere ihe ịmaaka n'inweta gaasị e ji emepụta ọkụ."
"N'oge gara aga, ha pụtara bee maka ego e ji ha. Ihe ndị a bụ ihe ndị mere na ọkụ anaghị adịzi.
Ụkọ ọkụ mere anyị anaghị arụ ọrụ anyị ka o kwesịrị- Ndị ọrụaka

Ndị ọrụaka ji ọkụ latrik arụ ọrụ gwara BBC Igbo na ha na-atakwute ya aja ugbua n'ihi na ọnụahịa mmanụ ụgbọala arịala.
Otu onye n'ime ha gwara BBC Igbo na ụkọ ọkụ mere ka ya na-eji igwe na-enye ọkụ arụ ọrụ.
Ọ kwara arịrị mmekpahụ nke ahụ na-ebutere ya n'ihi na "ọnụahịa mmanụ ụgbọala arịala karịa N1150 site na N850 ọ bụbu na mbụ. Mara zie ihe ọ ga-eri ma amụọ ya n'otu izuụka."
Otu onye ọkwa akwa kwuru na ọ kwalibeghị akwa niile ọ natara kemgbe ọnwa Jenụwarị, afọ 2026.
N'otu aka ahụ, nwoke na-asa akwa, Bekee kpọrọ 'dry-cleaner' aha ya bụ Onyema Ukpai kwara arịrị na ya anaghị ahụ ọkụ ya ji edere ndị mmadụ akwa.
Pete Edochie: Ana m emefu N40,000 kwa ụbọchị n'ọkụ latrik

Onye na-eme ejije Nollywood a ma ama bụ Pete Edochie akwaala arịrị maka ihe ọ na-eri ya inweta ọkụ dịka nsogbu ọkụ latrik kawanyere njọ na nsonso a.
Na mkparịtaụka ya na ụlọmgbasaozi AIT nwere na nsonso a, Edochie kwara arịrị sị, "Ana m akwụ N10,000 kwa ụbọchị maka ọkụ n'ụlọ m, mefuo N30,000 ọzọ; N20,000 na dezel na N10,000 na mmanụ ụgbọala."
Edochie gara n'hụ kwu sị, "Ya bụ ihe na-enye m nsogbu. Ọ bụghị naanị ọkụ ka m na-echuru uchu."
End of Akụkọ ndị ọzọ yiri ya





























