Lee ọnọdụ ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị n'Abia Steeti dịka ụlọakwụkwọ mepere n'agba ọhụrụ a

Ụlọakwụkwọ ebe ahịhịa tojuru nakwa gbamgbam e ji mechie elu ụlọ mebichara emebi
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọakwụkwọ ndị nọ n'Abia Steeti emepeela maka ọmụmụ ihe nke agba afọ 2025 ruo 2026.

Nke a na-abịa dịka ụlọakwụkwọ Sekọndịrị na Praịmarị na Naịjirịa mechiri n'ọnwa Julaị maka ogologo ezumike a kpọrọ 'long vacation'.

Ndị ntaakụkọ BBC Igbo gara n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ ndị dị steeti ahụ ịchọpụta etu ụmụakwụkwọ siri kwadoo n'agba ọhụrụ a nakwa etu ọnọdụ ụlọakwụkwọ ndị a dị.

N'obodo Aba

Ime klassị gbamgbam e jiri mechie elu ya mebisiri emebi

N'Aba, Abia Steti, ndị nne na nna anaghị ekwe ụmụ ha ịbia ulọ-akwụkwọ ụbọchị Monde maka "sit-at-home".

N'ụfọdụ ụlọakwụkwọ nọ n'Aba, ọ hụrụ na ndị nkụzi bịara n'uju, mana enweghị nwata akwụkwọ ọbụla bịara ụlọakwụkwọ.

Ụlọ gbamgbam e jiri mechie elu ya dapụrụ adapụ na udu abụọ na-eji ojii nke e ji echekwa mmiri n'elu.

Ndịisi ụlọakwụkwọ ndị a gbara ajụjụọnụ kwuru na ndị nkuzi dị njikere ikwuzi ihe, mana ndị nne na nne anaghị ekwe ụmụ ha gaa ụlọakwụkwọ n'ụbọchị Monde n'ihi egwu, ma kwuo na ọ bụ gọọmenti ka ọ dị n'aka ịhụ na ọnọdụ ahụ kwụsịrị.

"Ndị nne na nna anaghị ekwe ụmụ ha ịbia ulọakwụkwọ n'ụbọchị Monde maka iwu 'sit-at-home'.

"Ọ bụ gọọmenti ka ọ dị n'aka iwete ezi nchekwa mee ka obi sie ndị mmadụ ike iji hụụ na ọnọdụ dị etu a kwụsịrị."

Igwe bọdụ na-egosi aha na njirimaara ụlọakwụkwọ, tinyere ụlọụzọ ama ụlọakwụkwọ tara nchara

N'ọtụtụ ulọakwụkwọ ndị ọzọ, a hụrụ na ụfọdụ ụlọ ọmụmụ ihe dị na ya enweghị gbamgbam n'elu ha, ụfọdụ n'ime ha enweghi oche e ji amụ ihe zoro oke ụmụakwụkwọ na-anọ n'ala amụ ihe, tinyekwara na ha enweghi ụlọmposi ọbụla ma nke ndị nkuzi na ụmụakwụkwọ.

Ndị nkuzi n'ụlọakwụkwọ ahụ kwuru na ọ bụ ndị ohi kpapụrụ gbamgbam dị n'elu ụlọ ndị ahụ.

Ha kpọkuru Gọọmenti Abia nakwa nke Naịjirịa ka a gbatara ha ọsọ enyemaka.

Igwe bọdụ na-egosi aha na njirimaara ụlọakwụkw

N'obodo Umuahia

Ụmụakwụkwọ yi uwe ha ma nọrọ n'ocha ha n'ime klassị

N'otu aka ahụ, onye ntaakụkọ BBC Igbo gakwara n'ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị n'Umuahia ma chọpụta na ndị nkuzi na ụfọdụ ụmụakwụkwọ bịara ụlọakwụkwọ.

N'ụlọakwụkwọ World Bank Praịmarị dị n'Umuahia, a hụrụ ụfọdụ ndị nkuzi na ụfọdụ ụmụaka bịara akwụkwọ.

Ụlọ ọmụmụ ihe abụọ ebe ahịhịa tojuru n'etiti ha

Otu onye nkuzi kwuru na ụlọakwụkwọ emepeela, na ihe ha na-eme bụ ịzachasị ụlọakwụkwọ ma kpokuo nne na nna ka ha kwee ka ụmụ ha malite akwụkwọ ozugbo.

A hụkwara ka ahịhịa tojuru n'ụfọdụ mpaghara ụlọakwụkwọ ahụ, tinyere ime klassị ndị mebiri emebi.

Cheta na gọọmenti Abia steeti kwuru na ha na-emezi ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị n'okpuruọchịchị iri na asaa mejupụtara steeti ahụ.

N'akwụkwọ mịnịstri agụmaakwụkwọ wepụtara, ha kwuru na ụlọakwụkwọ iri isii na abụọ ka a na-arụzi.

Gbamgbam mechiri elu ụlọakwụkwọ ndị a emebichaala
Gbamgbam mechiri elu klassị a na-anọ amụ ihe emebichaala