Lee ebe okwu ASUU na gọọmentị etiti kwụ ugbua

Ebe foto si, ASUU na Gọmentị Etiti
Otu jikọrọ ndị nkuzi mahadum bụ Academic Staff Union of Universities (ASUU) ekwuola na ha amalitela ọrụ site na ya bụ abụbụọrụ ha malitere kemgbe ọnwa asatọ gara aga.
Nke a pụtara site na nzụkọ ndeeri ha malitere n'abalị Tọzde bọtara Frịada maka ya bụ iwu ụlọikpe mkpegharị nyere ka ha malite ọrụ tupu e gee ha ntị n'ikpe ọzọ ha wetara ya bụ ụlọikpe.
Ndị otu ahụ kpọrọ ya bụ ọgbakọ iji nyochaa ihe ya bụ ụlọikpe mkpegharị kpebiri izuụka gara aga.
Cheta na Gọomentị kpupuru ASUU ụlọikpe Industral Court maka abụbụ ọrụ ha na-agba kemgbe.
Ya bụ ụlọikpe kpebiri ka ASUU malite ọrụ ozigbo ozigbo n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Septemba, mana ASUU gara ụlọikpe mgbegharị ịsị na ha ekweghị ihe ya bụ ụlọikpe kwuru.
ASUU rịọkwara ya bụ ụlọikpe ka ọ kwụsị mkpebi nke Industrial Court bụ nke sịrị ha malite ọrụ ozigbo.
Ya bụ ụlọikpe mkpegharị gwara ASUU na ha ga-amalite ọrụ dịka ụlọikpe nke ọzọ gwara ha putu e gee ha ntị.
ASUU malitere abụbụ ọrụ a kemgbe ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Febụwarị maka okwu gbasara ụgwọ ọnwa ha nakwa ọnọdọ agụmakwụkwọ ha sị na ọ dị njọ.
Ha rịọrọ gọọmenti ka ọ lebe ihe ndị a niile anya bụ nke ha sị na ha na gọọmentị enweela nkwekọrịta kemgbe afọ olemaole gara aga mana gọọmentị emeghị ha.
Ya mere ha ji kpọọ ekwu nkụ sị na ha agaghị aga ọrụ ruo mgbe gọọmentị weliri ụgwọ ọnwa ha ma lebe anya n'ọnọdụ agụmakwụkwọ.
Onyeisiala Muhammadu Buhari etinyerela ASUU ego n'ụgwọ ọnwa n'akwkwọ mkpata na mmefu akụ Naịjirịa nke 2023 mana ọnweghị ihe ha megoro na ihe ndị ọzọ ha nara ha.
Ugbua ASUU ekwela ịmalalite ọrụ dịka ụlọikpe Industrial Court nyere n'iwu mana a ka na-atụ anya ihe ọzo ha ga-eme.








