Senate presidency: Ndị na-asọ mpi ịchị ụlọomeiwu Naịjirịa na ihe i kwesịrị ịma maka ha

Ndị na-azọ ọkwa ịchị ụlọomeiwu Naịjirịa

Ebe foto si, Kalu/Izunaso/Yari/Akpabio/Facebook

Okwu ndị ga-achị ụlọomeiwu Naijirịa n'agba ọchịchị ọhụrụ Naịjirịa abụrụla okwu akpụ n’ọnụ ugbua ọkachasị dịka ọtụtụ na-arụ aka n’okwu agbụrụ, okpukperechi dịka ebe mgbado ụkwụ n’inwete ọkwa a.

Pati na-achị ugbua bụ All Progressive Congress (APC) wepụtara aha ndị ha chọrọ ka ha bụrụ ndịisi ụlọomeiwu bụ nke Onyeisiala Bola Tinubu kwadoro.

Ndị a gụnyere Godswill Akpabio maka onyeisi ndị sịnetọ ebe Barau Jubrin ga-abụ osote ya, Abass Tajudeen maka ọkwa onyeisi ụlọomeiwu nta ebe Benjamin Kalu ga-abụ osote ya.

Mana ọ dizi ndị omeiwu n'aka ile ndị niile na-azọ ọkw anya ma họpụta kpọmkwem ndị ga-abụ ndịisi ha mgbe ha ga-eme ntuliaka n'ụbọchị Tuzde 13 Juun, 2023.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ndị na-azọ ọkwa onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa

Godswill Akpabio

Ebe foto si, Godswill Akpabio/Facebook

Godswill Akpabio

  • Godswill Akpabio dị afọ 61 dịka a mụrụ ya n’afọ 1962
  • Ọ gụrụ akwụkwọ dịka onye ọkaiwu ma na-arụ ọrụ dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị ugbua
  • Nna nna ya rụrụ ọrụ dịka onye ọchịchị (Warrant Chief) n’oge ndị ọcha chiri ndị Naijirịa na mpaghara Ikot Ekpene
  • N’afọ 2002, gọvanọ Obomg Victor Attah họpụtara ya dịka Kọmịshọna mmanụ agbidi na ihe ọnatarachi steeti ahụ
  • Site n’afọ 2002 ruo 2006, ọ rụrụ ọrụ dịka Kọmịshọna na naglaba atọ bụ ngalaba mmanụ agbidi na ihe ọnatarachi, ngabala na-ahụ maka okpuruọchịchị na ịchị echichi nakwa ngabala na-ahụ maka ala na ụlọ obibi ndị mmadụ
  • Ọ zọrọ ọkwa gọvanọ na 2006 ma nweta mmeri ịbụ gọvanọ Akwa Ibom, o mechakwara nwetakwa ọkwa ahụ ọzọ na 2011
  • A họpụtara ya dịka onyeisioche otu ndị gọvanọ PDP na 2013
  • N’afọ 2015, ọ zọrọ okwa sịnetị nke mpaghara Akwa Ibom North-West Senatorial District (Ikot Ekpene) ma nweta mmeri ya
  • Na 2015 a họpụtara ya n’ụlọomeiwu dịka onyeisi otu ndị sịnetị na-anọghị n’ọchịchị
  • Na 2018 ọ gbara arụkwaghi n’ọkwa ahụ ma wụba APC
  • Na 2019, aka chịburu Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari họpụtara ya dịka minista na-ahụ ihe gbasara Niger Delta
  • Ọ gbara arụkwaghim n’ọkwa ahụ na 2022 n’ihi atụmatụ ya ịzọ ọkwa onyeisiala n’aha APC nke o mechara zepụ aka na ya
  • O nwetere mmeri ịbụ sịnetọ ga-anọchịte Akwa Ibom North-West Senatorial District na 2022
  • Ụlọọrụ na-ebuso mpụ na nrụrụaka agha bụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) na-enyocha maka ebubo izufu ego Akwa Ibom steeti ruru ijere Narịa 100 oge ọ rụrụ ọrụ dịka gọvanọ mana okwu a apụbeghi ụlọikpe
  • Na 2020, ndị ụlọomeiwu kpọrọ ya oku maka ebubo metụtara imefu ego ruru ijeri Naịra 40 n’ụzọ na-ezighi ezi.

Orji Uzor Kalu

Orji Uzor Kalu

Ebe foto si, Orji Uzor Kalu/Facebook

  • A mụrụ Oriji Uzor Kalu n’afọ 1960
  • Ọ bụ onye omeiwu na-achọchịte mpaghara Abia North Senatorial District n’ụlọomeiwu
  • Ọ rubuola ọrụ dịka ‘Chief Whip’ n’ụlọomeiwu
  • O chịrị Abịa steeti dịka Gọvanọ malite n’afọ 1999 ruo afọ 2007
  • Kalu bụ onyeisioche ụlọọrụ SLOK Holding, onyeisioche ụlọ mgbasaozi Daily Sun na New Telegraph
  • Tupu ọ bụrụ gọvanọ, ọ ruburu ọrụ dika onyeisioche,Borno Water Board nakwa Cooperative and Commerce Bank Limited
  • O si PDP wụba Progressive Peoples Alliance (PPA) si pati ahụ banyezie APC
  • Na 2019, ọ zọrọ okwa ịnọchiteanya mpaghara Abia North n’ụlọomeiwu mana sịnetọ Mao Ohuabunwa ji vootu 10,000 napụ ya ara n’ọnụ
  • Na 2019, ụlọikpe ukwu na Legọs tụrụ ya nga afọ 12 maka ebube nrụrụaka ego ya ruru ijere Naịra 7 na ụma nke e kwuru mere n’oge ọchịchị ya dịka gọvanọ
  • Na 2020 ụlọikpe kachasị kwupụtara na mkpebi ụlọikpe ukwu ukwu ahụ agaghi nke ọma ma tọhapụ ya na nga
  • A tọhapụrụ ya n’ụbọchị nke atọ n’ọnwa Juun 2020.

Abdul'aziz Abubakar Yari

Abdul'aziz Abubakar Yari

Ebe foto si, Abdul'aziz Abubakar Yari/Facebook

  • A mụrụ Abubakar Yari n’afọ 1968
  • Ọ chịbụrụ Zamfara steeti n’afọ 2011 dịka gọvanọ n’aha All Nigeria Peoples Party (ANPP)
  • Ọ mechara banye All Progressives Congress bụ pati anọ nweta mmeri ịbụ gọvanọ steeti ahụ ọzọ na 2015
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na ngalaba Public Administration bụ ngabala na-ahụ maka ọchịchị ọha
  • Malite n’afọ 1999 ruo 2003 ọ rụrụ ọrụ dịka onye ọdeakwụkwọ pati All Nigeria People's Party (ANPP)
  • Na 2015 a họpụtara ya dịka onyeisioche otu ndị gọvanọ Naịjirịa
  • Ụlọikpe ukwu kụchapụrụ mmeri ya dịka onye nnọchịte Zamfara West nakwa mmeri ụfọdụ ndị APC ọzọ na 2019 maka okwu na a họpụtaghị ha na ntuliaka ime ụlọ pati ahụ
  • Okwu nrụrụaka olemole nọ n’isi ya nke gụnyere ndị so nnyocha kọmitii gọvanọ nọchịrị ya bụ Bello Matawalle hibere, okwu nkwụghachi ego Federal Project Refund, okwu EFAB Properties wire transfer, ụlọọrụ EFFC nakwa ICPC
  • Nchịkọta ego so ebubo nrụrụaka nọ n’isi ya ruru ijeri kwuru ijeri Naịra

Osita Izunaso

Osita Izunaso

Ebe foto si, Osita Izunaso/Facebook

  • A mụrụ Osita Izunaso n’ụbọchị 30 Ọktoba afọ 1966, ọ bụ nwafọ obodo Ohakpu na mpaghara Orlu, Imo Steeti
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Jos, mahadum Abuja nakwa mahadum Calabar ebe o nwetere nzere n’azụmahịa, ntaakụkọ nakwa ọkaiwu.
  • A họpụtara ya dịka onyeomeiwu n’ụlọomeiwu nta n’afọ 1992 nakwa 1999.
  • Ọ rọụla ọrụ dịka odeakwụkwọ ngalaba gọọmentị dị icheiche gụnyere; minista ndị ntoroọbịa, minista ndị ọrụ bekee nakwa onye bụbu gọvanọ Imo steeti
  • Ọ rọbuola ọrụ dịka Sịnetọ na-anọchiteanya ndị Imo West n’afọ 2007 ruo 2011.
  • Ọ bụ onye pati All Progressive Congress (APC) bụ ebe a họpụtara ya n’ọkwa Sịnetọ nke ugboro abụọ n'afọ 2023.
  • N'afọ 2009 ndị mpaghara Orlu tinyere akwụkwọ ka a na-apụ Izunaso ọkwa ya dịka sịnetọ mana osote onyeisi ụlọomeiwu bụ Ike Ekweremadu jụrụ ma kagbuo atụmatụ ahụ.

Ndị na-azọ ọkwa ndịisi ụlọomeiwu nta

A bịa n’ụlọomeiwu nta, mmadụ abụọ gbapụtara ihe n’ịzọ ọkwa ịbụ ndịisi gụnyere Tajudeen Abbas na-azọ ọkwa onyeisi ebe Benjamin Kalu na-azọ ọkwa osote onyeisi.

Tadujeen Abbas

Tajudeen Abbas na-azọ ọkwa onyeisi ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, Tajudeen Abbas

  • Tajudeen Abbas bụ nwafọ Kaduna steeti a murụ n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba afọ 1965
  • Ọ gụrụ akwụkwọ Praịmarị n’ụlọkwụkwọ LEA dị na Zaria afọ 1976, gụọ nke sekọndịrị n’ụlọakwụkwọ Gọọmentị dị na Markafi n’afọ 1978.
  • Ọ gụkwara akwụkwọ na mahadum Ahmadu Bello dị na Zaria, Usman Danfodio dị na Sokoto.
  • Tajudeen rụrụ ọrụ na ngalaba dị icheiche n’ụlọakwụkwọ Kaduna Politekinik dịka onyeisi ngalaba ngụkọkọ ego.
  • Ọ rụkwara ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka nkesa akwụkwọ ụtaba (Tobacco) na Jos site n’afọ 1998 ruo 1991.
  • Ọ malitere ọrụ dịka onye omeiwu n’ụlọomeiwu nta kamgbe 2011 ruo 2019 bụ ebe ọ nọchitereanya ndị mpaghara Zaria nke Kaduna Steeti.
  • Ọ rụọla ọrụ na kọmitii ụlọomeiwu nta dị iche iche gụnyere, azụmaahịa, akụnaụba, ọrụ pụrụiche, nchekwa dgz.
  • Ọ bụ onye pati All Progressive Congress (APC) bụ ebe o ji

Benjamin Kalu

Onyeomeiwu na-azọ ọkwa osote onyeisi ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, Benjamin Kalu

  • Benjamin Kalu bụ nwafọ obodo Bende dị n’Abia steeti, a mụrụ ya n’ụbọchị 5 Mee afọ 197.
  • Ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum Calabar bụ ebe ọ malitere ịnọchiteanya ụmụakwụkwọ mgbe ọ dị afọ iri na atọ.
  • Ọ rụọla ọrụ dịka onyeisi okpuruọchịchị Bende dị n’Abia steeti n’afọ 2003 ruo 2004 mgbe ọ dị afọ iri atọ na otu.
  • Kalu rụkwara ọrụ dịka onye ndụmọdụ gọvanọ Abia steeti n’oge ahụ bụ Orji Uzor Kalu.
  • Ọ banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị n’uju n’afọ 2002, zọọ ọkwa ụlọomeiwu nta n’afọ 2011 na 2015 ma daa.
  • Ọ zọrọ ọkwa ụlọomeiwu nta ahụ ọzọ n’afọ 2019 ma merie n’aha All Progressive Congress (APC) bụ ebe ọ ka nọ rute ugbua.
  • Ọ bụ ọnụ na-ekwuru ndị ụlọomeiwu nta ma bụrụkwa onyeisi kọmitii na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọomeiwu nta.
Nigerian Senate

Ebe foto si, Nigerian Senate/Twitter

Ihe mere mmekọ ndị onyeisiala na ndị ọchịchị ụlọomeiwu ji bụrụ ihe a na-ele anya

Ọkwa ndị na-achị ụlọomeiwu Naịjirịa bụ ihe ọha na-elekarị anya n’ihi mkpa mmekọ akụkụ ọchịchị onyeisiala na ndị ụlọomeiwu dị nye onwe ha nakwa ụmụndụ ụmụ afọ Naịjirịa.

Ngalaba atọ na-emezu ọchịchị na Naịjirịa bụ ọchịchị onyeisiala, ndị ụlọmeiwu na ngalaba ikpe.

Ọrụ ndị omeiwu bụ ihe na-emetụta ọrụ onyeisiala dịka ọrụ onyeisiala na-emetụta nke ndị omeiwu.

Ụfọdụ ụzọ mmekọ ngalaba abụọ a si emetụta onwe ha bụ:

  • Ụlọomeiwu ịmepụta iwu ndị nwereike imetụta ọchịchị onyeisiala nakwa ndị Naịjirịa
  • Onyeisiala ibinyeaka n’atụmatụ iwu ndị ụlọomeiwu mepụtara
  • Ndị ụlọomeiwu na-ebu ụzọ anabata atụmatụ onyeisiala ibi ego ịrụ ọrụ ebe ọbụla
  • Ọ bụ ndị ụlọomeiwu bụ ndị na-abata ma kwado nakwa nnyocha ndị ya onyeisiala so achị dịka ndị mịnịsta nakwa ndị ọzọ
  • Ọ bụ ndị ụlọomeiwu bụ ndị na-ebenyeaka n’atụmatụ mkpata na mmefu ego Naịjirịa kwa afọ (Bọọgetị)
  • Ọrụ ha sokwa na ịhụ na onyeisiala ejighi ikike ọchịchị ya na-eme ihe sọrọ ya, nke bụ na ha na-echekwa ikike ọchịchị Naịjirịa