Nigeria Election 2023: Matakwuo maka ndị na-azọ ọkwa Onyeisiala na nkwa ha na-ekwe

Tinubu, Kwankwaso, Obi, Atiku

Ọsọ onye ga-ewere ọkwa Onyeisiala Naịjirịa iji nọchie anya Onyeisiala Muhammadu Buhari na-aga n'ihu ugbua.

Ọ bụ mmadụ iri na asatọ ga-achịpụ ya n'ịzọ ọkwa onyeisiala a na ntuliaka a ga-eme n'ụbọchị 25 Febụwarị 2023.

Mmadụ anọ ndị a (na-esoghi usoro ọbụla) bụ ndị kachasị gbapụta ihe na ya bụ ndọrọndọrọ, dịka ngụkọ dị icheiche e merela na Naịjirịa n'ọdị nso a si gosipụta.

Ha bụ: Bola Ahmed Tinubu nke 'All Progressives Congress' (APC); Atiku Abubakar nke 'Peoples Democratic Party' (PDP); Peter Obi nke 'Labour Party' (LP); na Rabiu Kwankwaso nke 'New Nigerian Peoples Party (NNPP).

Pịa aka n'ihe ngosi a ka ị mata ihe niile dị mkpa gbasara mmadụ anọ a n'otu n'otu nakwa nkwa ha na-ekwe Naịjirịa ma ọ bụrụ na ha merie ntuliaka ọkwa Onyeisiala.

Kedụ ndị nọ n'ọsọ ịchị Naịjirịa

Chọpụtakwuo ihe banyere ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa

Họrọ otu onye ka ị mata maka ya

Bola Tinubu

All Progressives Congress (APC)

  • Afọ ole ọ dị: 70
  • Ọ gụrụ maka mgbakọ (Accounting) na mahadum Chicago
  • Ọ chịrị Legọs Steeti ugboro abụọ site na 1999 ruo 2007
  • Ọ nọchiri Legọs Westị n'ụlọomeiwu Sineti site n'afọ 1992-1993
  • Ọ gbara ezi mgbọrọgwụ na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa, nke a bụ mbụ ọ na-azọ ọkwa onyeisiala.
  • O so buo agha megide ọchịchị ndịagha.
  • O wulitere akụnaụba Legọs steeti ihe karịrị ugboro anọ site na N22.2b n'afọ 1999 gaa N220.0b n'afọ 2007.
  • Ọ rụrụ dịka onye nyocha ego a kpọrọ 'auditor' nakwa onye oji ego ụlọọrụ Mobil Producing Nigerian, otu n'ime ụlọọrụ na-emepụta mmanụ agbidi na Naịjirịa.
  • Ọ kwalitere mbupu ngwa ahịa na Naịjirịa ma belata ndabere na ntụbata ngwa ahịa.
  • O belatara enweghi ọrụ ndị ntoroọbịa n'ọkara n'ime afọ anọ ma kewapụta ọrụ ruru otu nde na ngalaba teknụzụ n'afọ abụọ.
  • O meziri ngala ikpe na Naịjirịa ma tinye uchu n'igbochi mpu ma kwalite ntukwasị obi ndị mmadụ n'ebe ndị ọrụ nchekwa nọ.

Atiku Abubakar

Peoples Democratic Party (PDP)

  • Afọ ole: 76
  • Osote Onyeisiala Naịjirịa site n'afọ 1999 ruo 2007
  • O nwere asambodo 'masters' na ngalaba 'International relations' site na mahadum Anglia Ruskin dị na Briten.
  • Ọ bụbụ onye ọrụ Kọstọm batara na ndọrọndọrọ ọchịchị na mbido afọ ndị 1980.
  • Ọ zọọla ọkwa onyeisiala ugboro ise ma o nwetaghi ya n'afọ 1993, 2007, 2011, 2015 na 2019.
  • Ọ hiwere 'American University' nke Naịjirịa bụ nke nyere ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị Chibok a tọhapụrụ agụmakwụkwọ n'efu.
  • Onye ojiegoachụntaego tinyere aka n'ahịa mmanụ agbidi, ọrụ ugbo, ụlọakụ na ngalaba mmepụta ọgwụ e ji agwọ ọrịa.
  • Nghọtaghie dị na etu o siri nyefee ụfọdụ ụlọọrụ gọọmentị n'aka ndị nkịtị.
  • Nye ndị nkịtị na-azụ ahịa ohere n'ime ọba azụmahịa nakwa akụnaụba Naịjirịa.
  • Kwalite ịdịnotu Naịjirịa site na inye mmadụ niile nọ Naịjirịa ohere nakwa ikpe kwụọtọ.
  • Hazigharịa etu e si kee ọchịchị na Naịjirịa.

Peter obi

Labour Party (LP)

  • Afọ ole: 60
  • Ọ chịrị dịka Gọvanọ Anambra Steetị ugboro abụọ site n'afọ 2007 ruo 2014.
  • Ọ zọrọ dịka osote Onyeisiala na ntuliaka afọ 2019.
  • Onye ojiegoachụntaego, gụrụ maka 'philosophy' na mahadum Naịjirịa dị na Nsukka.
  • Ọ hapụrụ iteego gbara ọkpụrụ nke ruru nde dọla 156 ($156m) n'ụlọụka oge ọ chịchara dịka gọvanọ.
  • O buuru Anambra site n'ogogo 26 gaa na mbụ kachasị eme ọfụma n'ule NECO nakwa WAEC na Naịjirịa.
  • O nwere ọtụtụ ụlọahịa bụ nke nyerela ọtụtụ puku mmadụ ọrụ.
  • Ịgba mbọ hụụ na eziokwu dị n'ọchịchị ya ma buokwa agha megide mpụ na nrụrụaka.
  • Ịkpọrọ Naịjirịa si na ndị oriri na mbubata ngwa ahịa gaa ndị na-emepụta ihe.
  • Wulite ma kwalite ndụ ndị mmadụ site n'itinye ego n'agụmakwụkwọ STEM, ahụike nakwa iwulite akụrụngwa e ji enyere ndụ aka.

Rabiu Kwankwaso

New Nigeria Peoples Party (NNPP)

  • Afọ ole: 66
  • Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa site n'afọ 2003 ruo 2007.
  • Gọvanọ chịrị Kano Steeti site n'afọ 1999 ruo 2003 nakwa na 2011 ruo 2015.
  • Ọ nọchitereanya ndị Madobi n'ụlọomeiwu nta n'afọ 1992 nakwa Sịnetọ nọchitereanya Kano Central site n'afọ 2015 ruo 2019.
  • Ọ bụ Dkt. na ngalaba civil engineering na mahadum Sharda dị n'India.
  • Ọ na-enye agụmakwụkwọ n'efu nakwara inyere ndụ ndị mmadụ aka.
  • Ọ kwalitere ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ nọ n'ogogo praịmarị site n'otu nde n'afọ 2011 ruo ihe karịrị nde atọ n'afọ 2015 oge ọ chịchara.
  • Inye ụmụakwụkwọ praịmarị nri nakwa uwe akwụkwọ n'efu.
  • O hiwere Mahadum Tekịnụzụ na Sayensị nke Wudil Kano Steeti nakwa Mahadum Northweast, mahadum abụọ nke steeti Kano ga-enwe.
  • Ikewapụta ọrụ site n'itinye ego n'ọrụ ugbo.
  • Ileba anya n'ọnọdụ nchekwa
  • Ịkwanyere iwu ugwu na-achị obodo ugwu ma soro usoro iwu.
Nkewa ngalaba

Ntuliaka Naịjirịa 2023: Kedụ nkwa ndị pati na-ekwe gị?

Họrọ otu ihe maọbụ pati ị chọrọ ịhụ atụmatụ ha

Atụmatụ ndị pati

  • Pati All Progressives Congress

  • Pati Labour

  • New Nigeria People's Party

  • People's Democratic Party

End of Ntuliaka Naịjirịa 2023: Kedụ nkwa ndị pati na-ekwe gị?
Nkewa ngalaba
Nkewa ngalaba