Russia school shooting: Onye ojiegbe agbagbuola mmadụ 13 n'ụlọakwụkwọ

Ụlọakwụkwọ dị n'Izhevsk

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ihe ruru mmadụ 650,000 bi n'obodo Izhevsk bụ ebe mwakpo a mere

Otu onye ojiegbe awakpoola ụlọakwụkwọ dị na mba Russia, gbuo mmadụ iri na atọ (13) ma merụọ iri abụọ na otu (21) ahụ.

Mgbọ egbe tụgburu ụmụakwụkwọ asaa n'ime ihe ruru 1000 na-aga n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Onye ojiegbe ahụ a chọpụtara bụbu nwata ụlọakwụkwọ ahụ, mechara gbagbuo onwe ya n'ụlọakwụkwọ ahụ, mana o doghi anya ihe mere o ji mee ihe o mere.

Ndị ntaakụkọ mba Russia ewepụtala ihe onyonyo ndị gosiri ebe ndị mmadụ ji ụjọ na-azọ isi onwe ha n'ụlọakwụkwọ ebe ya bụ mwakpo mere.

Ụfọdụ ihe onyonyo ahụ gosiri ebe ọbara wụsara n'ala n'ụlọakwụkwọ ahụ, ebe mgbọ si gafere na mpio, dịka ụmụakwụkwọ zoro n'okpuru oche na tebulu ha.

Ụmụaka asaa na ndị okenye isii so na ndị nwụru na mwakpo a, tinyekwara ndị nche abụọ na ndị nkuzi abụọ, dịka gọọmentị mba ahụ si kwuo.

Ka ọ dị ugbua, akpọpụla ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi n'ụlọakwụkwọ ahụ.

Otu onye omeiwu steeti Izhevsk bụ ebe ihe a mere, kwuru na Artem Kazantsev (bụ aha onye ojiegbe ahụ), ji egbe abụọ mee ya bụ mwakpo.

Ihe onyonyo nke otu nnyocha mba Russia wepụtara na soshal midia, gosiri ka ozu onye ojiegbe ahụ tọgbọrọ n'ala, ma gosikwa na e sere njirimara ndị Nazi na 'balaclava' n'uwe ya.

Ndị nnyocha amalitela inyocha ebe obibi ya.

Onyeisi mpaghara ahụ e tinyekwalanu oge iru uju ruo 29 nke ọnwa Septemba maka ya bụ ihe mere, dịka ọnụ na-ekwuru Onyeisiala Vladimir Putin kwuru na ya bụ mwakpo "na-ewute ya nke ukwuu".