Ndi na-edebenye aha maka PVC n'afọ a ha aka afọ ndị ọzọ?

Akụkọ apụtala ọtụtụ oge na nso nso a ebe imirikiti ndị mmadụ na-enupụta n'igwe iji debanye aha ha n'akwụkwọ ntuliaka, ma nweta kaadị e ji atụ vootu bụ Permanent Voter's Card PVC n'aha ịchafụ.
Dịka ị marala, kaadị a bụ ihe ndị mmadụ ga-eji tụọ vootu n'ụbọchị ọbụla a na-eme ntuliaka.
Ọtụtụ na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị na-achọ inweta PVC ha n'afọ a, karịrị ndị nke afọ ọzọ, mana nke a ọ bụ eziokwu?
Ọnụọgụgu ndị na-atụ vootu kamgbe a malitere inye PVC n'afọ 2011

Ebe foto si, EIE Nigeria/Twitter
Ụlọọrụ Inec malitere inye Permanent Voters Card - PVC maka ntuliaka 2011. Tupu 2011, a naghi eji PVC atụ vootu, ọ bụ nke nwamgbenta a kpọrọ Temporary voters card - TVC.
Mana dịka a malitere PVC, ndị aha ha dị n'akwụkwọ ndị Inec nwere ikike ịtụ vootu n'afọ 2011 bụ 73,528,040 dịka ndị Inec siri kwuo.
Ndị gụnyere ma ndị ji kaadị nke nwamgbenta bụ TVC na ndị ji Permanent Voters Card - PVC. N'ime ndị a, ndị pụtara tuo vootu bụ 39,469,484 nke bụ pasenti 53.68 ndị binyere aka ịtụ vootu.

Ebe foto si, Ekiti State Gov/Website
N'afọ 2015, Inec kpochapụrụ TVC kpam kpam kwuo na ọ bu naanị ndị ji PVC nweerike ịtụ vootu. Ya bụ n'ime mmadụ nde 73,528,040, ndị ndị Inec nyere ikike ịtụ vootu bụ 67,422,005 mana ndị tụrụ vootu bụ naanị 29,432,083 naanị pasentị 43.65.
N'afọ 2019, ndị denyere aha bụ 84,004,084 mana ndị Inec kwuru tozuru ịtụ vootu bụ mmadụ 68,833,476 mana ndị tụrụ vootu kpọmkwem bụ nnanị mmadụ 28,614,190 bụ pasentị 34.75 n'ime ndị denyere aha ha.

Etu e si denye aha na mpaghara ọwụwa anyanwụ kamgbe 2015

N'ime mmadụ nde 10,057,130 denyere aha ha na Inec ma nweta PVC nwere ikike ịtụ vootu n'afọ 2019, ndị tụrụ vootu n'ezie bụ naanị mmadụ 2,701,746. Mmadụ 7,355,384 bụ ndị na-atụghị maọbụ na nke ha tụrụ adabaghị adaba.
Nke a kpatara e jiri kwuo na ndị mpaghara Ọwụwa Anyanwụ nwere ihe a kpọrọ 'voter apathy' na Naịjirịa karịa mpaghara ndị ọzọ.


Etu ihe kwụ ugbua
Ugbua, ndebanye aha maka ntuliaka afọ 2023 na-aga n'ihu ugbua, mana ọ dị ka ihe dị iche dị.
Ụlọọrụ Inec kwuru na ihe ruru mmadụ nde 10 edenyela aha n'afọ a, nke gụnyere mmadu 84,004,084 denyerela aha na 2019.
Inec ewepụtabeghi aha niile e denyere na ndị tozuru ịtụ votu mana ihe eserese a gosiri etu ihe si kwụrụ na mpaghara ọwụwa anyanwụ ugbua, ọnụọgụgụ ndị denyerela aha.


Inec na-epụtara etu ihe si kwụrụ gbasara idebanye aha maka PVC na mpaghara Naịjirịa niile.
Lee ụfọdụ ndị ha wepụtarala:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ihe ndị ntorobịa na-eme iji kwalite ndebanye aha n'akwụkwọ ntuliaka

Ebe foto si, Inec
Ọtụtụ ndị a ma ama na-eti egwu haziri ọgbakọ mkporindụ n'ama egwuregwu Tafawa Balewa na Legọs.
Ha kwuru na ndị mmadụ agaghị akwụ ụgwọ iji sonye n'ọgbakọ, naanị PVC ka onye ọbụla ga-egosi iji sonye.
Ha kpọkwara ndị ọrụ Inec ka ha bịa debanye aha ndị na-enweghi PVC.

Ọtụtu ndị mmadu ekwuola na ụdị mkpu a na-eti maka iweta PVC nakwa ọnụọgụgụ ndị na-apụta maka ya ugbua bụ nke a hụbeghi ụdị ya mbụ.
Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ihe ịtụnanya nakwa ihe ha nabatara, maka na nke a nwereike iwelite ọnụọgụgụ ndị ga-atụ vootu n'afọ 2023 karia afọ ndị nke gara aga.

Ka ọ dị ugbua, ha adọtịala ohere maka idenye aha gafee abalaị 30 ọnwa Juunu ha tinyeburu.
Nke a bụ maka na ụloikpe nyere iwu ka a dọtịa ya, mana a mabeghi oge a ga-akwụsị ya.
Ọtụtụ kwenyere na nke a ga-eme ka ọnụọgụgụ ndị ga-edebanye aha ha gbagotekwuo.









