Ndịagha ewegharala ọchịchị n'ike ọzọ na Burkina Faso

Ebe foto si, RADIO TÉLÉVISION DU BURKINA
Onyeagha bụ Kaptin na mba Burkina Faso ekwuputala n'ihe onyonyo TV mba ahụ na ya achudaala onyeisial onye agha mba ahụ bụ Lt Col Paul-Henri Damiba.
Ibrahim Traore kwuru na nke a bu n'ihi na Damiba akwụsịlighị nsogbu ndị agha nnupuisi Islam na-enye nsogbu na mba ahụ.'
Nke a bụ nke ugboro abụọ a na-eweghara ọchịchị n'ike na mba ahụ dịka Damiba mere nke ya n'ọnwa Jenụwarị afọ a(2022).
Damiba kwuru na ọ bụ maka nsogbu ndị agha islam mana ọ kwụsịlighị nsogbu ahụ.
N'ụbọchị Monde, e gburu ndị agha 11 dịka ha na-edu ụgbọọ́la ndị nkịtị nmpaghara ugwu mba ahụ.
Traore kwuru na e mechiela oke ala mba ahụ na mba ndị gbara ya okirikiri ma kwụsịkwa ihe ndọrọndọọ ọchịchị nile were rue mgbe a ga-ekwurugharị ya.
Ụda egbe na ọgbaghara na ihe ọzọ anyị ma na-eme

A nụrụ ụda egbe n'akụkụ ọgige ndị agha dị na Ougadougou bu isi obodo mba Burkina Faso n'ụtụtụ ụbọchị Fraịde.
Ụlọ mgbasaozi nke gọọmentị bụ "La Radiodiffusion Télévision du Burkina" kwụsịrị ọrụ ịgbasa ozi.
Nke a na-abịa dịka ndị agha mba ahụ nwụrụ n'izu ole na ole gara aga.
Nicolas Negoce nọ na Dakar ezipụtara anyị ozi a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Kedụ ka ihe si kwụrụ ugbua?

Ebe foto si, Simon Gogo
Ụlọ mgbasaozi dị icheiche dị na mba ahụ na-ekwu na ụda egbe na ọgbaaghara ndị pụtara na mba ahụ ugbua bụ atụmatụ iweghara ọchịchị n'ike.
Nke a na-abịa dịka anụrụ ụda egbe ahụ n'akụkụ ogige ndị agha n'isi obodo Ouagadugu.
Akụkọ na-efegharị bu na ndị agha gbara ụlọọrụ nke ụlọmgbasaozi gọọmentị etiti ha ogige.
Ụlọntaakụkọ Reuters nke mba ofesi na-ekwu na ndị nọ ebe ihe mere gwara ha na nnukwu ụda dara n'akụkọ obi gọọmentị mba ahụ na Ouagadugu kwa.
Cheta na ndị uweojii mba ahụ ekwubuola na ha amaghị ihe na-eme dịka oke nghọtaghie na gbagharịa na-eme n'ebe ahụ.









