Chatgpt: Etu 'artificial inteligence' ga-esi metụta ndụ gị n'afọ 2023

AI

Ebe foto si, Getty Images

Edemede BBC dere n'afọ 2019 ka ha kọwara 'Artificial Intelligence' nke bụ Ai na mkpọbịrị dịka tekụnụzụ e ji eme ka igwe kọmpụta nwee ike iche uche maọbụ kpaa agwa dịka etu mmadụ nwere ike isi mee.

Ya bụ ihe edemede kwuru na AL nwere ike ịmetụta ndụ mmadụ n'ihe gbasara etu onye ahụ si ebi, etu e si arụ ọrụ na etu e si egwu egwu ma mmadụ nwere ike ọ gaghị ama.

Ejike Ozonkwo bụ onye ọnụ na-eru n'okwu maka ihe gbasara tekụnụzụ ọkachasị nke AI kwuru maka etu AI ga-esi enyere ndụ mmadụ aka n'afọ 2023.

Onye ọnụ na-eru n'okwu maka Artificial Intelligence

Ebe foto si, Ejike Ozonkwo

Nkọwa foto, Onye ọnụ na-eru n'okwu maka Artificial Intelligence

Ozonkwo bụ Data Scientist ma bụrụkwa onye tinyere aka n'atụmatụ di iche iche nke na-ewulite tekụnụ ọkachasị AI na Naijirịa.

Ozonkwo kwuru sị, " AI bụ iji 'algorithm' ime ka igwe kọmpụta mụta maọbụ ghọta ihe etu mmadụ si amụta".

O kwuru na ọ bụ ihe mere eme nke dị n'ọnụọgụgụ (data) bụ isi sekpụ ntị maka AI.

O tinyere ọnụ na-etu AI nwere ike i si metụta ndụ ndị mmadụ ọkachasị n'afọ 2023 a.

Etu AI ga-esi metụta gị n'ụlọọrụ gị n'afọ a

AI

Ebe foto si, Getty Images

Ozonkwo kwuru sị, " Onye nọ n'ụlọọrụ, AI nwere ike ime ka ị rụọ ọrụ gị ọsịsọ. Ndị na-arụ dịka na ngalaba mgbakọ na mwepụ, AI ga-eme ka ha mee nnyocha ma wepụta mpụtara nnyocha ha na-egbughị oge".

O kwukwara sị, " A bịa na nzụkọ a na-eme n'ụlọọrụ, AI nwere ike ịdetu ihe niile e kwuru na ya bụ nzụkọ ma onye kwuru ya. "

"O ga-emecha depụta edemede maka ya bụ nzụkọ ma zịgakwa ya site na email".

Ozonkwo kwuru na ndị tekụnụzụ na-eme 'programming' nwer eike iji AI mee ka ọ dịrị ha mfe ma hazie ka ọ dịrị onye ọzọ mfe ịghọta ihe onye ahụ chọrọ ime.

O kọwara sị na AI nwereike ị dere mmadụ edemede email ya dịka etu mmadụ ga-esi dee ya.

Etu AI ga-esi metụta agụmakwụkwọ

ụmụ akwụkwọ

Ebe foto si, Iwaria

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

O kwuru sị, " A bia na-agụmakwụkwọ, AI mewe ya ka o dịka afọ anọ mmadụ nọrọ n'ụlọakwụkwọ bụ n'efu n'ihe na AI dịka Chatgpt nwere ike ịdepụta ihe mmadụ mụrụ n'ime afọ anọ n'ime ọkara nkeji".

O kwuru na AI nwere ike ị dere ụmụakwụkwọ ihe onye nkụzị ha nyere ha ka ha dee na-atufughị oge.

Ozonkwo kwuru sị, " Nke a ga-eme ka ụmụ akwụkwọ nwee ike dee ihe agụmakwụkwọ ha na-atụughị oge ma ncha ncha".

O kwuru sị, " Nwata akwụkwọ nwere ike inye AI isiokwu na sị ka AI jụọ ya ajụju nwere ike ịpụta n'ule maka ya bụ isiokwu. Nke a ga-enyere nwata akwụkwọ ahụ aka ịkwado maka ule".

Ozonkwo kwuru na e nwere ihe na-echu ya ụra maka AI na agụmakwụkwọ.

O kwuru sị, " Kedụ uru ọ baara mmadụ ịga n'ụlọakwụkwọ ebe AI dịka Chatgpt nwere ike ikuzịrị ya ihe ndị ahụ n'ụlọ?

Ọzọkwa ọ bụrụ na ndị nkụzị na-echezi etu ha ga-esi ekuziri ụmuakwụkwọ ihe n'ihe ha chọrọ ka ụmuakwụkwọ mụta etu e si eche uche na ọ bụghị naanị ịza ajụjụ e nyere ha".

O kwuru sị, " Anyị achọghị ka AI cheere ndị mmadụ uche nke ha kwesịrị ichere onwe ha".

Etu AI ga-esi metụta ndị na-eti egwu na ndị ọzọ

Ihe AI serre

Ebe foto si, MALIK AFEGBUNA/SLICKCITY

Nkọwa foto, Ihe nka AI sere

Ozonkwo kwuru sị, " Maka ndị na-eti egwu na ndị nka ọzọ, ha nwereike iji AI dịka Chatgpt na ndị ọzọ dee egwu ha, ọkachasị ndị na-agụ egwu rapụ".

O kọwara na-enwere AI nke nwereike ịsepụta mmadụ etu onye ahụ siri kọwara ya.

Ozonkwo kwuru. " E nwere nke a na-akpọ 'Deep Fake' nke a ga-eji ihụ mmadụ ma tinye onye ahụ okwu na ọnụ. Nke a na-etu n'ike n'ike ma na-ebutere ụfọdụ ndị mmadụ nchekasị obi. A na-atụanya na ndị ọchịchị ga-emepụta iwu ga-etinye aka na nke a".