Unknown Gunmen in Anambra: "Etu ndị ekperima si anazi ụtụisi n’Anambra n’aha mnwereonwe Biafra"

Ebe foto si, Anambra State Government
Gọomentị Anambra Steetị akọwaala etu ndị ekperima, ndị ntọrị na ndị ohi si anazi ụtụisi na steeti ha n'aha ịchọta mnwereonwe Biafra.
N'ozi gọọmentị wepụtara, ha sị na nke a na-eme n'ụfọdụ obodo ndị dị n'okpuruọchịchị Ihiala, Nnewi South na Aguata.
N'okwu ha "Ị ma na ebe ndị dịka Ihiala, Nnewi South na Aguata, ndị mmadụ na-akwụ ụtụisi n'aka ndị ekperima tupu ha echie echichi, gbaa nkwụ di na nwunye, kwaa ozu nakwa mee emume ndị ọzọ n'obodo."
"Ndị ekperima a na-ana ụtụisi n'aka ndị na-azụ ahịa, ndị na-akwọ ụgbọala kwa ụbọchị, kwa izuụka na kwa ọnwa ọbụla."

Ebe foto si, Anambra State Government
Gọọmentị sị na ndị a na-anapụ ndị mmadụ ụgbọala ha n'ike, zoo ha n'ime ọhịa ma na-eche ka a bịa zụọ ụgbọala ndị a n'aka ha.
"Ha na-atọrị ndị mmadụ ma yie ndị ọzọ egwu iji napụta ha ego."
"Ihe ndị a bụ aka ọrụ ndị ekperima chọrọ ịkpachi mpaghara Anambra South ma ọ bụrụ na anyị ebilighi megide ma chọpụta ha."

Ebe foto si, Anambra State Government
"Ị hụ ọtụtụ ụgbọala nke ndị Anambra nwe nke a na-apụrụ ndị nwe ha n'ike. Ha na-ebi ndụ ha site n'ịkpachapụ ndị obodo ihe ha jiri biri n'aha ịlụ ọgụ mnwereonwe Biafra, ma na-enupuisi n'iwu otu ndị chọrọ mnwereonwe Biafra hiwere.
O nwere ihe ọzọ ndị ogbu ọ raa ọbara a na-achọ na-abụghị mnwereonwe Biafra nke ndị mmadụ na-amaghị.

Ebe foto si, Anambra State Government
Gọọmentị gara n'ihu rịọ ndị Anambra ka ha ekwela ka ndị ekperịma na ndị ntọrị chụpụ ha na steeti n'aha ịchọ nwereonwe Biafra.
Cheta na nso nso a gọvanọ Soludo nke Anambra Steetị sị na ndịagha Naịjirịa wakporo ogige ndị a ekperima a ma chọpụta akwụkwọ bucha aha ndị a tọọrọ nakwa ego ole e jiri gbapụta ha.
Ọ kpọkwara oku ọzọ ka sị ka ndị niile bu egbe wụsaa nkwa agha ha ma bịa ka a kpaa nkata udo.
Kedụ ihe Ipob kwuru?

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-achọ mnwereonwe Biafra bụ Indigenous People of Biafra (Ipob) site n'ọnụ na-ekwuru ha bụ Emma Powerful ekwuola na ọ bụghị ndị otu ha na-akpa ike ndị a.
Ọ sị na ọ bụ ndị 'o so chi egbu' na-eme ihe niile a iji mebie aha nakwa atụmatụ mnwereonwe Ipob na-achọ.
Powerful sị na oge na-adịghị anya na ha ga-agba ndị niile na-eme ihe n'anwụ iji gosi na aka ha dị ọcha.








