Oxlade Video Tape: Ụfọdụ ndị a ma ama ihe onyonyo aramara ha gbarala n'anwụ

Oxlade, Tiwa, Shatta na Tacha

Ebe foto si, Oxlade/Tiwa/Tacha/Shatta/Instagram

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Okwu a kpụ n'ọnụ ugbua bụ etu ihe onyonyo aramara oti egwu bụ Ikuforji Olaitan e ji 'Oxlade' mara si gbaa n'anwụ.

Nke a mere ndị mmadụ ji kpụrụ nwa amadị a n'ọnụ dịka ọtụtụ na-eto ya, ebe ndị ọzọ na-akatọ ya.

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ gịnị mere e ji na-eto nwamadị a mana katọọ Tiwa Savage oge ihe onyonyo nke ya pụtara na soshal midia n'oge gara aga.

A matabeghi onye gbara ihe onyonyo a n'anwụ ebe nwamadị a bụ Oxlade ekwubeghi pịm banyere ya.

Onye bụ Oxlade?

Ikuforji Olaitan mana 'Oxlade' bụ e ji maara ya n'iti egwu ya.

Ebe foto si, INSTAGRAM/OXLADE

Ezi aha nwamadị a bụ Ikuforji Olaitan mana 'Oxlade' bụ e ji maara ya n'iti egwu ya.

Ọ na-eti egwu bụ nke ọ sị na ọ malitere n'ụlọụka mgbe ọ dị obere.

Ọ sị na nne na nna ya nwụrụ mgbe ọ dị obere na ọ bụ nnenne na nnanna ya zụlitere ya.

Oxlade gbapụtara ihe n'afọ 2020 mgbe o tichara egwu ọ kpọrọ "Away" bụ egwu mere ọfụma n'afọ ahụ.

O tiela egwu ndị ọzọ dị iche iche gụnyere Oxygen, Ojuju dgz.

Nke a abụghị mbụ ihe onyonyo aramara ndị a ma ama na-agba n'anwụ ma wuwe na soshal midia.

Ndị ọzọ nke ha gbarala n'anwụ gụnyere:

Tiwa Savage

Tiwa Savage

Ebe foto si, TIWA SAVAGE/INSTAGRAM

N'ụbọchị 8 nke ọnwa Ọktoba afọ 2021, Tiwa Savage na mkparịtaụka o nwere na New York sị na mmadụ chọrọ iji ihe onyonyo aramara ya atụnarị ya ego.

Tiwa sị na ọ bụ aramara mere n'etiti ya na ọyị ya nwoke mana ọ maghị ka o si ruo onye ahụ aka.

Ihe onyonyo ahụ mechara gbaa n'anwụ nke mere ọtụtụ ji kpụrụ ya n'ọnụ.

Tacha

Tacha

Ebe foto si, @SYMPLY_TACHA/TWITTER

Tacha bụ onye a ma ama so n'emume Big Brother Naija nwetere ozi n'afọ 2020 banyere foto ebe ọ gba ọtọ.

Mana Tacha sị na nke ahụ bụ foto a rụrụ arụ na ọ bụghị nke ya n'ezie.

Salawa Abeni

Salawa Abeni

Ebe foto si, INSTAGRAM/@OFFICIALSALAWAABENI

N'ọnwa Eprelụ afọ 2020, oti egwu bụ Salawa Abeni kwuru na mmadụ chọrọ iji foto ebe ọ gba ọtọ anapụ ya ego.

N'ozi o wepụtara n'Instagram Abeni sị na ọ dị ka ọ bụ mgbe ọ nọ n'ụlọọgwụ maọbụ mgbe ya na onye nke ya nọ ka e sere foto ahụ.

O mechara were aka ya gbaa foto ahụ n'anwụ ma sị na mmadụ agaghị e ji ya mekpaa ya ahụ.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Small Doctor

Small Doctor

Ebe foto si, INSTAGRAM/@SMALLDOCTOR

N'afọ 2017, ihe onyonyo ebe oti egwu a kpọrọ Small Doctor na-emetụ onwe ya aka n'amụ n'akara Snapchat.

Akụkọ sị na o mechara wepu ya ma sị na ọ mmadụ zobara n'ime ekwentị ya ma wepụta onyonyo ahụ.

Shatta Wale

Shatta Wale

Ebe foto si, INSTAGRAM/ SHATTA WALE

N'afọ 2018, ihe onyonyo pụtara na snapchat nwafọ Gana bụ Shatta Wale gosiri ka nwaanyị ji ọnụ na-amị amụ ya.

O mechara tinye ya na snapchat ma jụọ " ọ bụ na ndị mmadụ ahụtụbeghi ya mbụ?"

Mana o kwughi ma ọ bụ ya ka nwaanyị na-amị amụ n'ezie.