Prof. Felix Anyaegbunam arrested: Akpụrụla ọkammụta e boro ebubo ịmetọ nwa onye nche ya dị afọ 12 gawa ụlọikpe

Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii Ebonyi steetị sị na ha akpụpụla Felix Anyaegbunam, onye ọkammụta na mahadum 'Alex Ekwueme Federal Univeristy Ndufu Alike Ikwo (AE-FUNAI), dị n' Ebonyi steeti ulọikpe maka ebubo na o metọrọ nwata nwaanyị dị afọ 12.
Ya bụ nwatakiri nwaanyị bụ nwa onye nche na-arụrụ ọkammụta ọrụ na be ya.
Ndị uweojii n'Ebonyi Steeti nwụchiri Ọkammụta Anyaegbunam n'ụbọchi Fraịde nke izuụka gara aga bụ 19 Nọvemba maka ebubo a.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Loveth Odah kwuru sị: "Anyị emechaala nnyocha maka ebubo a, mpụtara ya gosiri na aka nwoke a adighị ocha."
Ọ sịkwa: "Anyị kpụgara nwatakiri nwaanyị ahụ ụlọọgwụ inyo ime ahụ ya. Ugbua a kpụpụla nwoke ahụ ụlọikpe."
Dịka o siri kọwa, ọ bụ nwatakịri nwaanyi ahụ gwara otu nwaanyi ọ ma maka ihe ọ na-agabiga, nwaanyị ahụ were gwa ndị na-ahu maka ọdịmma ndị mmadụ Bekee na-akpọ "Non-Governmental Organisation" (NGO).

Ọ bụ ndị NGO ahụ gara gbara ndi uweojii ama ihe na-eme.
BBC Igbo na nna nwatakiri nwaanyị ahu nwere mkparịtaụka banyere ebubo mmetọ a na-ebo Ọkammụta Anyaegbunam.
Nwoke ahụ gara n'ihu kwuo ihe ọ ma maka ihe a mere.
Dịka o siri kwuo, nke a abụghị mbụ okwu banyere iwakpo nwaayi na-agbakọ ya na Ọkammụta ahu.
N'okwu ya, ọ sị: "Anam arụ ọrụ dịka onye nche na be Maazị Anyaegbunam kemgbe afọ itolu gara aga. "
"N'oge gara aga, Maazị Anyaegbunam gwara m na ọ chọrọ nwa odibo ga-enyere ya aka na-eleta ụlọ ya anya."
O kwuru na ya gbara mbọ kpọnye ya nwata nwaanyị bụ nwanne nwunye ya, onye gbara afọ iri na asaa.
"Maazị Anyaegbunam tụwaraburu nwa mkpọnyela ime"
Ọ sị: "N'oge na-adighị anya, Maazị Anyaegbunam bịara gwam na ọ chọrọ ịlụ nwata nwaanyị ahụ maka na ọ tụwala ya ime. "
"Mkpu pụrụ n'ọnụ n'ihi na ihe a abụghị nkwekọrịta mụ na ya."
"Anyị bugara akụkọ nye ndị uweojii oge ahụ."
Nwoke ahu gara n'ihu kwuo na nwada ahụ mụrụ Maazị Anyaegbunam nwa, mana dịka enweghị onye nọ nso ileta nne na nwa ahụ anya, ọ kpọnyere ya nwa m nwaanyị dị afo iri na abụọ.
Ọ sị: "Mgbe nwa nwanne nwunye m malitere ire ihe na-ahịa International market, naanị nwa m nwaanyị ahụ na Maazị Anyaegbunam malitere ịnọ n'ụlọ."
"N'oge na-adighị anya, nwa m bidoro gwawa m na Okammụta ahụ na-achọ idina ya."
"A jụrụ m Maazị Anyaegbunam maka ihe nke a mana ọ gwara m na akụkọ a bụ akụkọ ụgha, na nwa m na-arọ nrọ, na atụmatụ ya bụ ileta nwa ruo ogugu agụmakwụkwo nke mahadum."
"Nwa m na-agwa ihe ọ na-agabiga kwamgbe."
Nwoke ahụ sị na ọ bụ kwamgbe kwamgbe ka nwa bịara gwa ya ihe ọ gwara m n'oge mbụ bụ eziokwu, na ya bụ Maazị na-achọsike idina ya.
Ọ sị n'oge na-adighị anya, "akụkọ mmetọ nwatakiri a bịara pụta ihe."
Ọ bụ ebubo mmeto nwata ka Ọkammụta Anyaegbunam ga-aza n'ụlọikpe
Loveth Odah gwara BBC Igbo na ka ọ dị ugbua, ọ bụ ulọikpe ka ọ dịrị ikpe Ọkammụta Anyaegbunam ikpe dịka ọ sị na ọ bụ ebubo imetọ nwaanyị ka e boro ya.
Ọ sị: "Ihe ọ ga-azara ọnụ ya banyere ya n'ụlọikpe bụ imetọ nwata."










