Biafran Vipers: Ndi ọzọ apụtala na-eyi ndi eze ọdinala na ndi ọchịchi nọwụwa anyanwụ egwu

Ebe foto si, Screenshot/Whatsapp
Otu amabeghi ndị ha bụ kpọrọ onwe 'Angry Vipers of Biafraland' apụtala n'ọwụwa anyanwụ.
N'ihe onyonyo na-efegharị, ndị ahụ bu egbe ma jikere ka ndị na-aga agha kwuputara ọtụtụ ihe gbasara ọwụwa anyanwụ nakwa ndị ndọrọndọrọ ọwụwa anywanwụ.
Ha sị na ọnọdụ ụwụwa anywanwụ na etu e siri jide onyeisi Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu adịghị ha mma n'ọbi.
Ha kwuru na ha nyere ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwụ naanị abalị iri abụọ na otu iji tọghapụ Nnamdi Kanu.
Ha gwakwara ndị ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche si ala Igbo ha ritue n'ọkwa maọbụ hanwa bụ ndị Biafra Vipers achọrọ ha bịa.
Onye ọzọ ndị a kpọrọ aha bụ Obinna Iyiegbu bụ onye eji "Obi Cubana" mara sokwa n'ime ndị a kpọrọ aha. Ha sị na ọ kpọtara onye uweojii Abba Kyari.
Amabeghi ndị ndi a bụ, mana ha sonyere n'ime ụfọdụ ndị na-ebu egbe apụta ekwu okwu n'onyonyo ma na-amanye iwu n'aha Biafra.
Ọfọdụ n'ime ndi otu na-abụ sọso otu ugboro ka a na-anu aha ha, mana e nwere ndi nke na-apụta kwamgbe, dịka ndi kpọrọ onwe ha "Biafran National Guard" nke otu onye kpọrọ onwe ya "General Innocent Orji" nọ n'isi ha.
Ọtụtụ mgbe, otu a kachamara maka achụmnta nwereonwe Biafra ugbua bụ Ipob na-agbarụ ihu maka ndị na-apụta iyi ndị mmadu egwu n'aha ọwụwa anyanwu maọbụ Biafra.
Dịka oge ndị BNG sepụtere isi, ọnụ na-ekwuru Ipob bụ Emma Powerful kwuru na ha amaghị ndi ha bụ ma na-arụ aka na o ga-abụrụ gọọmentị Naịjirịa ka ha na-arụru ọrụ.
N'azụ okwu Maazi Powerful kwuru, onyonyo mechara pụta na-egosi ebe Maazi Kanu na Orji na-eme kparịtaụka n'afọ 2017.
Lee otu ndị ọzọ pụtara ịbu egbe ka otu a kwa
Biafra Motherland Warriors

Ebe foto si, Screen grab
Dịka 'Biafra Vipers' ndị Biafra Motherland Warriors bụkwa n'ime ihe onyonyo ka ha kpọpụtara aha ha n'ọnwa Ọgọst.
N'ime onyonyo ahụ ha wakporo otu onye Nigerian Security and Civil Defence Corps (e ji Civil Defence mara) ma napụ ha egbe ha.
Ka ha na-eme mwakpo a, otu onye n'ime ndị nchekwa Civil Defence malitere jiri asụsu Igbo rịọwa ha biko dika ha na-achọ igbu ya.
Onye ose onyonyo ha sara ya sị "Igbo gbukwaa gị ebe ahụ!".
Mana, ha mechara sị ya yipu uwe Civil Defence ya ma gbapụya ọsọ.
Biafra National Guard

Ebe foto si, BNG/Facebook
E nwere ọtụtụ otu na-azọ nnereonwe Biafra, mana Biafra National Guard bụ aha ọhụrụ.
Dịka onyonyo na-efegharị na soshal si kwuo, aha onyeisi ndị otu a bụ Innocent Orji.
O kwuru na ha si n'Izrel lọta iji lụọ ọgụ dịka ndị ọchịchị Naịjirịa nwuchiri onyeisi Redio Biafra bụ Nnamdi Kanu, nakwa oriaku Onyekachi Orji.
Orji Kwuru na n'ihi nke a, ha ga-ekwupụta nnwereonwe Biafra n'abalị iri atọ nke ọnwa Ọkụtoba 2021 mana ọ bịaghị na mmezu.
Ndị BNG na ndi agha Naịjirịa mechara kwaa mgbọ n'obodo Amaekpu dị n'Ohafia n'ọnwa Ọktoba 2021.
Ndi gburu otu onye n'ime otu ma jidekwa onye ọzọ n'obodo Eda dị n'Ohaozara, Ebonyi Steeti.
Ka nke a mechara, Maazi Orji pụtara n'onyonyo ebe ọ nọ gbaa ogbunigwe elu nke Bekee na-akpọ Rocket.
Eastern Security Network

Ebe foto si, Getty/Ipob
Nnamdi Kanu bụ onyendu otu Ipob kwuru na o hiwela otu nchekwa a kpọrọ Eastern Security Network (ESN) "iji gbochie mkpamkpa ndị ọchị ehi na-akpa n'ọwụwa anyanwụ".
Kanu kwuru na Eastern Security Network abụghị ndị agha Biafra, na ha bụ ndị nchekwa.
"Eastern Security Network abụghị ndị agha Biafra. Ọ dị ka Amotekun. Mgbe oge ruru anyị ga-egosi ụwa ndị agha Biafra."
"Anyị anaghị abanye agha ọbụla."
Mara na gọọmenti Naịjirịa gụnyere Ipob n'ime otu ndị na-eyi ndụ egwu na mba ahụ. Ha sikwa na ha bụ ndị enweghị ikike ịgbakọ.
Ọ bụ ndị omeiwu steeti na ndị gọvanọ nwere ikike ihibe ndị ọrụ nchekwa na steeti dị iche iche na Naijiria.
Mana ọkaiwu Nnmadi Kanu bụ Aloy Ejimakor kwuru na ESN ahụ emegideghi iwu ala Naịjirịa.












