Arsenal vs Chelsea: Chelsea apịawaala Arsenal ogbe azụ na be ha

Ndị otu Arsenal

Ebe foto si, Reuters

Otu Chelsea akụpụla Arsenal eze abụọ dịka ha ji ọkpụ goolu abụo merie ha.

Nke a ga-eme ya ugboro abụọ a na-emeri otu Arsenal na bọọlụ ha gbara kemegbe ebidoro Premier Lig afọ ọhụrụ.

Ndị gbakara neeti Arsenal gụnyere Romel Lukaku na nkeji 15 nakwa James na nkeji 35.

Goolu abụọ ndị a bịara n'agba nke mbụ n'asọmpị ahụ.

Cheta na ọ bụ mbụ Lukaku ga-agbara Chelsea bọọlụ kemgbe ha zụtagharịrị ya n'aka otu Inter-Milan.

Nke a ga-eme ya asọmpị abụọ otu ndị ahụ kemgbe amalitere afọ bọọlụ nke 2021.

Cheta na otu Brentford meriri otu Arsenal mgbe ha abụọ zutere ebe Chelsea ji ọkpụ goolu atọ kụpụ Crystal Palace ọkwụrụ n'anya.

Ajụjụ dịzi ndị mmadụ n'ọnụ ugbua bụ "Onye ka ọ ga-ebi n'ụkwụ ya taa"?

Ka anyị lebe anya n'etu ihe si kwụrụ: