Ohaji Egbema Killings: Etu e si gbagbuo mmadụ anọ na-arụ n'ụlọ ọrụ mmanụ agbịdị dị n'Imo steeti

Ebe foto si, Emmanuel Ugorji
Ndị omekome egbuola mmadụ anọ na-arụ n'ụlọọrụ 'Lee Engineering Company' ka ha wakporo ọdọ mmanụ agbịdị ha dị n'Assa dị n'okpuruọchịchị Ohaji/Egbema dị n'Imo steeti.
Akụkọ kwuru na ndị mmadụ anọ ahụ agbagburu nọ n'ụzọ na-aga n'ọdọ mmanụ agbịdị ụlọọrụ ha mgbe ndị omekome ahụ malitere gbawa ha egbe.
Dịka mmadụ anọ nwụru ozigbo ka ndị omekome gbachara ha egbe ndị ọzọ so eme njem ahụ meruchara ahụ.
Ruo ugbua amabeghị ihe kpatara mwakpo ahụ.

Ebe foto si, Emmanuel Ugorji
Otu onye si obodo Assa ebe ọdachị mere kwuru na ndị ụlọọrụ 'Lee Engineering Company' ka na-arụ ọdọ mmanụ agbịdị ahụ arụ.
Onyeisi ọgbakọ jịkọtara ndị ntorobịa nọ n'Ohaji Egbema bụ Emmanuel Ugorji kwetere na ihe mberede a mere.
Ugorji kwuru na ndị omekome a malitere inye nsogbu n'obodo ahụ na nso nso a.
O kwuru na mwakpo mbụ ha mere bụ n'ụlọọrụ Oilserve, nke abụọ bụ mgbe ndị omekome ahụ tọọrọ onyeisi ụlọọrụ Cluster Development Board bụ Godswill Uzomba kamgbe ọnwa atọ nakwa mgbe ndị omekome ahụ gbara akụrụngwa ZEROC dị n'ogbe Watersmith.
Ndị isi obodo na-akpọkụ gọọmenti obodo ahụ ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Michael Abattam gwara onye natakụkọ na ọ ga-amata etu ọdachị ahụ si mee kpọmkwem ma kọọrọ ọha nso nso a.










