You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Baldness: Ihe na-akpata isi nkwọcha nakwa ihe ị ga-eme banyere ya
Eloka (nke a abụghị ezigbo aha ya) bụ nwaokorobịa gbara afọ iri abụọ na abụọ, mana ọ gbara ya gharịị na ọ malitela inwe isi nkwọcha.
Ihe a na-echu ya ụra oge niile, n'ihi na ndị enyị ya na-eji ya amanye ya njakịrị n'ụlọakwụkwọ maọbụ na nnọkọ ha ọbụla.
O kwuru sị: "Aghọtaghị m ụdị ihe a, gịnị kpatara ntutuisi m ji epewanye mpe? E che m na ọ bụ naanị ndị okenye na-enwe isi nkwọcha?"
Ndị ọkachamara kwuru na isi nkwọcha ụmụnwoke nwere ike ịmalite mgbe mmadụ ka na-etoputa, bụ nke bekee kpọrọ 'teenage years'.
Ụdị isi nkwọcha a ka Bekee na-akpọ 'male-pattern baldness".
Mana ya bụ ihe na-abvụkarị ndị topụtarala mmadụ ka ọ na eme, ma na-akawanye njọ dịka afọ mmadụ na-agbali.
Gịnị na-akpata isi nkwọcha?
Dịka Dọkịta Francis Chika Ezegbe si gwa BBC na mkparịtaụka ekwentị, ihe nwere ike ịkpata isi nkwọcha abụghị otu ihe, mana nke kacha apụta ihe na-abụkarị ihe na-esi n'agbụrụ.
Ezegbe na arụ ọrụ dịbịa bekee n'ụlọ ọgwụ dị na mba UK
O kwuru sị: "Ọ bụrụ na isi nkwọcha dị n'agbụrụ mmadụ; ya bụ na nna maọbụ papa nnukwu maọbụ nwanne mmadụ nwere isi ya, ohere dị na onye ahụ ga-enwekwa isi nkwọcha."
Ihe ndị ọzọ nwekwara ike ikpata isi nkwọcha gụnyere:
- Ọrịa - dịka ọrịa umeji (liver) maọbụ ọrịa ụfọdụ akpụkpọahụ
- Mgbanwe n'ahụ - Ụfọdụ ụmụnwaanyị nwere ike malite inwe ndapụ ntutu ma ha dị ime maọbụ mụọ nwa, maọbụ ha ruwe mgbe ha ga-akwụsị ịtụ ime (menopause)
- Ọgwụ mmadụ ṅụrụ aṅụ - ụfọdụ ọgwụ kansa, maọbụ nke ọbara mgbalielu nwere ike ịkpata ndapụ ntutu
- Ọgwụgwọ nke Bekee kpọrọ 'radiation therapy'
- Ndọkasị ahụ (stress)
Mana ihe na-akacha akpata isi nkwọcha na ndị ntorobịa na-abụkarị site n'agbụrụ.
Ụfọdụ ndị ọkachamara ekwuola na ntutu ọbụla dị mmadụ n'isi nwere ogo ndụ ya, nke pụtara na dịka oge na-aga, ntutu ahụ ga-eru n'isi njedebe ndụ ya ma kwụsị itopụta
Gịnị na-egbochi isi nkwọcha?
O nweghi ihe e kwekọrịtara kpọmkwem nwere ike igbochi isi nkwọcha, ọ kachasị ọ bụrụ onye o si n'agbụrụ ya.
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ọgwụ a kpọrọ 'supplements' nakwa mmanụ dị icheiche juru ahịa ugbua, bụ nke ndị na-ere ha na-ekwu na ha nwere ike igbochi ndapụ ntutu ma mee ka ntutu na-etoli nke ọma.
Mana dịka Dkt Ezegbe si kwuo, o nweghị nnyocha ọbụla gosiri na e nwere ọgwụ na-egbochi isi nkwọcha.
"Ọ bụ eziokwu na e nwere ude maọbụ mmanụ nwere ike ime ka ntutu tolie nke ọma, mana ọ na-ete aka - ihe dịka ọtụtụ ọnwa - tupu ha arụọ ọrụ," Ezegbe kwuru.
Gịnị ka onye nwere isi nkwọcha ga-eme?
Dịka dkt Ezegbe si kwuo, ọ baghị uru mmadụ ịdọgbu onwe ya n'ihi ihe ọ ma na ọ ga-emerịrị.
O kwuru sị: "O doro anya na dịka afọ mmadụ na-agbalite, ụfọdụ ihe dị n'ahụ mmadụ agaghịkwa na-arụ ọrụ etu ha si arụbu. Nke a abụghị ihe mmadụ ga-eji chegbuo onwe ya.
"Ọ dị mkpa ka mmadụ nwee ntụkwasị obi n'ime onwe ya nke Bekee kpọrọ 'self confidence'."
"Isi nkwọcha abụghị ọrịa, ya mere ejikwala aka gị gbuo onwe gị."
Mana o kwukwara na mmadụ nwere ike ịga ụlọọgwụ ga tinye ntutu n'isi ya bụ nke a kpọrọ 'hair transplant'.
"Otu onye agbatobi m na UK ebe a kwụrụ puku paund atọ (£3000) maka ịga ụlọọgwụ na mba Turkey maka 'hair transplant'," Ezegbe kwuru.
Puku paụnd atọ karịrị otu nde naịra (N1 million) na Naịjirịa.
Mana ọ bụrụ na ị chọọ ntutu aka mere, ha juru eju n'ahịa ugbu, ma nke nwoke ma nke nwaanyị.
Akụkọ na-ekwu na ọtụtụ ndị a ma ama na Naịjirịa na-etinyezi ya bụ ntutu aka mere.
Ha gunyere ndị ejije Nollywood bụ IK Ogbonna na Charles Okocha, dịrị gawazie.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: