You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.

Take me to the main website

NA EME UGBU A, Onyeisiala Trump amanyela ndị na-azụ mba Ịran ahịa ụtụisi 25%

Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Jenụwarị 2026.

Mkpuchi Na Eme Ozugbo

Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ilediagu, Adline Okere, Marvelous Obomanu, Uche Akolisa

  1. Onye zọburu ọkwa oche onyeomeiwu so na ndị ise ndị omekome gburu na Benue steeti

    Igbabe Ochi bụ onye so zọọ ọkwa n'ụlọomeiwu na Benue steeti so ndị e gburu mgbe ndị omekome wakporo obodo Otobi n'okpuruọchịchị Otukpo dị na Benue Steeti.Mwakpo a nke mere n'elekere 1.30 n'etiti abali bọrọ isi ụtụtụ Tuzde.

    Nke a so mwakpo nke mere n'ụbọchị Sọnde n'Ekwu-Ora’Odaba n'obodo Otobi kwa.Ndị obodo gwara ndị ntakụkọ Channels TV na ndị nchekwa obodo na ndị ndu ha bụ Ocheme Jackson mebiri atụmatụ ya bụ ndị omekome.

    Anyị ka na-eche ọsịsa ndị uweojii ga-enye maka mwakpo na ogbugbu ndị a.

  2. Nijel anapụla ndị ọkwọ ụgbọala jụrụ ibuga mmanụ agbịdị na Mali ikike n'ihi mgbochi ndị jihadist

    Mba Nijel akagbuola ikike nke ọtụtụ ndị na-anya ụgbọala mmanụ agbịdị maka ịjụ ibuga mmanụ ụgbọala n’agbata obi ha bụ Mali maka mwakpo ndị otu nnupụisi jihadist.

    Cheta na ndị otu al-Qaeda tinyere mgbochi mmanụ ụgbọala na Mali n’ọnwa Septemba ma malite ịwakpo ụgbọala bu mmanụ agbịdị n'okporoụzọ ukwu.

    Mba Mali enweghị oke osimiri na-adabere n’agbata obi ha maka mbubata mmanụ ụgbọala, n’ọnwa Julaị, ha na Nijel bịanyere aka na nkwekọrịta inye lita mmanụ ruru nde iri asatọ na ise n'ime ọnwa isii nye ogbe ọzara dị na mpaghara ugwu ya, bụ ebe ọtụtụ ndị otu agha nnupụisi na-arụ ọrụ.

    Nijel bụ mba na-emepụta mmanụ ebe mba Mali bụ otu n'ime ndị ha na ya na-emekọrịta ihe - ha abụọ bụ mba ndịagha na-achị nke ndị jihadist na-eme ihe ike na-echere aka mgba.

    N'ọnwa Nọvemba gara aga, Nijel zigara tankị mmanụ ụgbọala iri asatọ na abụọ na Mali, nke mere ka ike nke mgbochi ahụ metụtara n'oge na-adịbeghị anya kwụsị - ebe a wakpokwara ndị njem si Senegal na Ivory Coast.

  3. Onyeisiala Trump amanyela ndị na-azụ mba Ịran ahịa ụtụisi 25%

    Donald Trump bụ Onyeisiala mba Amerịka amanyela ụtụisi 25% na ngwa ahịa a na-ebubata n’Amerịka si mba niile na-azụ mba Iran ahịa.

    Trump mere nke a maka etu mba Iran si egbu ndị na-eme ngagharịiwe.

    A gwara BBC na ndịagha mba Amerịka agwala Trump udiri ọgụ ha ga-anụ na mba Iran nke gunyere ogbunigwe nakwa mwakpo n’igwe ịntanet mba Iran dgz.

    Cheta na Trump adịla na mbụ kwuo na Amerịka ga-ebuso Iran agha ma ha na-egbu ndị na-eme ngagharịiwe.

    Mana n’oge na-adịghị anya ndị isi ngalaba nchekwa dị icheiche na mba Amerịka ga-ezute kpaa maka agha ha ga-anụ n’Iran.

    Opekatampe ndị na-eme ngagharịiwe ruru narị isii anwụọla kemgbe e bidoro na-eme ya na mpaghara dị icheiche n’Iran.

  4. Igbo ndị ọma, ụtụtụ ọma unu

    Anyị ji obi aṅụrị na-anabata unu n'ọgbakọ BBC News Igbo taa.

    Ekpere anyị n’isi gị na-esonyere anyị bụ ka ụbọchị taa mịtara gị na anyị niile mkpụrụ ọma.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ya gazie!

  5. Ihe ruru mmadụ 650 anwụọla na ngagharịiwe n’Ịran - Ka ndị otu ikike mmadụ kwuru

    Ndị otu ikike mmadụekwuola na opekatampe mmadụ narị isii na iri anọ na asatọ na-eme ngagharịiwe anwụọla dịka ha na-aga n’ihu na-eme ngagharị megide gọọmenti na mba Ịran

    Nke a na-abịa dịka onyeisi kachasị elu nke Ịran na-adọ mba Amerịka aka na ntị.

    Otu na-ahụ maka ikike mmadụ n’Iran dị na mba Norway na-adọ aka na ntị na ọnụọgụ ndị nwụrụ anwụ nwereike ịdị elu karịa, mana nsogbu nkwụsị nkwukọrịta okwu na mba ahụ niile na-eme ka o sie ike ịchọpụta ozi.

    Cheta na Donald Trump kwuru na mba Amerịka na-atụle "nhọrọ siri ike" itinye aka na mba ahụ, mgbe ọ dọrọ aka na ntị na mbụ na ya ga-eme ihe ma ọ bụrụ na e gbuo ndị ngagharịiwe.

  6. Etu mmọnwụ si gbaa ọsọ ndụ ya mgbe nwaanyị munyere ya ọkụ n'Imo steeti

    Kemgbe akụkọ pụtara na otu nwaanyị gbara mmọnwụ ọkụ n'obodo Obollo dị n'okpuru ọchịchị Isiala Mbano n'Imo Steeti, ọtụtụ mmadụ na-ajụ ajụjụ dị icheiche.

    Ọtụtụ chọrọ ịma ma mmọnwụ ahụ ọ dịkwa ndụ ka ọkụ ọ gbagburu ya. BBC IGBO zigara onye ntaakụkọ n'obodo ahụ mana nwaanyị ahụ mụnyere mmọnwụ ọkụ ekweghị ekwu okwu n'onyonyoo.

    Ọ gwara BBC Igbo na nsogbu dapụtara oge mmọnwụ na-achụ obere nwa ya ọsọ.

    Ọ sịrị na mmọnwụ chụbara nwa ya n'ime ọhịa ma tụọ ya okwute n'isi ma kwuo na ọ bụ mgbe ahụ ka ya ji mụnye mmọnwụ ahụ ọkụ.

    Mana BBC Igbo chọpụtara na mmọnwụ ahụ yipuru uwe mmọnwụ ma gbaa ọsọ ndụ ya

    N'aka nke ọzọ, nwaeze na-achị obodo ahụ bụ Chijioke Mbaeyi katọrọ ihe mere ma kwuo na ndị o metụtara abịaghị kpesara eze obodo.

    Ọ si "anyị nuru ihe mere mgbe ndị mmadụ na-akọ maka ya, e nweghị onye bịara kpọtụrụ maọbụ kpesara eze" "Ọ dị ka ha ekpeziela, mana ọ bụrụ na ihe anyị nụrụ bụ ihe mere, nke a dị njọ". Ọ kwuru na ịgba mmọnwụ ọkụ bụ ajọ ihe n'omenaala Igbo niile.

  7. A kpụpụla INEC ụlọikpe maka ebubo ijeri N55.9 na-efu efu

    Otu Socio-Economic Rights and Accountability Project (SERAP) kwuru na ha agbaala akwụkwọ n’ụlọikpe megide ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka na Naịjirịa bụ Independent National Electoral Commission (INEC).

    SERAP kwuru na ha kpụpụrụ INEC n’ụlọikpe maka ebubo ijeri naịra iri ise na ise na ụma itoolu (N55.9) na-efu efu, bụ nke INEC na-enweghị ike inye nkọwa maka ya.

    Dịka SERAP siri kwuo, ego ahụ bụ nke a mawapụtara maka ngwa ntuliaka nke afọ 2019.

    Ebubo a dị na ndekọ ọhụrụ sitere n’aka Auditor-General nke Naịjirịa, ma bụrụkwa nke SERAP mapanyere n’akara X ha n’ụbọchị Sọnde 11 Jenụwarị 2026.

    N’akwụkwọ ahụ otu SERAP gbara n’ụbọchị Fraịde gara aga, ha gwara Ụlọikpe Ukwu Etiti nye iwu nke ga-amanye INEC ịkọwa etu ha siri mefuo ego ahụ e kwuru na ọ bụ maka iji zụta igwe nnyocha ‘card reader’, akwụkwọ ntuliaka, akwụkwọ mpụtara ntuliaka nakwa ngwa ntuliaka ndị ọzọ.

    Ndị tinyere aka n’akwụkwọ ahụ n’aha SERAP bụ ndị Ọkaiwu ha bụ Kolawole Oluwadare, Kehinde Oyewumi, na Andrew Nwankwo.

  8. Meta egbochiela akara 550,000 n'ihi mmachibido mgbasa ozi na soshal midịa n’Ọstralịa

    Meta egbochiela ihe dịka akara soshal midịa ruru narị ise na iri puku ise (550,000) n'ụbọchị mbụ nke mmachibido mgbasa ozi mmekọrịta nke mba Ọstralịa maka ụmụaka na-eto eto.

    Cheta na e wepụtara iwu ọhụrụ nke malitere n’ọnwa Disemba 2025 ka e gbochiri mgbasa ozi ọha kacha ewu ewu n'ụwa na soshal midịa - gụnyere Instagram na Facebook - gbochie ndị Ọstralịa na-erubeghị afọ iri na isii inwe akara na ha.

    Gọọmenti kwadoro mmachibido iwu a, nke a na-enyocha nke ọma na gburugburu ụwa, dịka ọ dị mkpa iji chekwaa ụmụaka n’ozi ndị na-emerụ ahụ.

    Ụlọọrụ dịka Meta ekwuola na ha kwenyere na ọ dị mkpa ichekwa ndị ntoroọbịa n'ịntanetị.

    N’agbanyeghị, ha na-arụ ụka maka ihe ndị ọzọ, ebe ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu maka nchegbu yiri nke ahụ.

  9. Onyeisiala Trump ekwuola na Amerịka nwereike ịwakpo mba Ịran

    Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ndị ọchịchị mba Iran akpọọla oku ka ha nwee mkparịtaụka udo.

    Trump kwuru na ọ bụ eziokwu na mba Amerịka na Iran nwereike inwe mkparịtaụka mana ya nwereike iwakpo ha tupu ha enwee mkparịtaụka ahụ.

    N’okwu ya oge ndị ntaakụkọ juru ya ka mba Ịran emejọrọ ya site n'ogbugbu e gburu ndị na-eme ngagharịiwe, Onyeisiala Trump kwuru na mba Ịran mejọrọ ya site n'etu ha si mee ihe n ngagharịiwe a.

    O kwuru na mba Amerịka na-eme nnyocha ma na-atụle ihe ha nwereike ime.

    Cheta na Onyeisiala Trump yiri mba Iran egwu ma kwuo na mba Amerịka ga-awakpo ha ma ọ bụrụ na ha gbuo ndị na-eme ngagharịiwe.

    O mere ka o doo anya na ọ gwara ndị ọchịchị mba Ịran na Amerịka ga-azaghchi ha ma ọ bụrụ na ha gbaa ndị ngagharịiwe egbe.

  10. Ndị ojiegbe awakpola ma gbuo mmadụ anọ n'obodo dị na Niger Steeti

    Ndị ojiegbe awakpola obodo Damala dị na mpaghara Woko n’okpuru ọchịchị Borgu dị na Niger Steeti ma gbuo mmadụ anọ.

    Mwakpo ahụ na-abịa dịka ndị ojiegbe wakporo ma gbuo mmadụ 42 n’obodo dị iche iche gụnyere ahịa Kasuwan Daji dị na Demo nakwa okpuru ọchịchị Agwara.

    Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Wasiu Abiodun kwuru na ndị ojiegbe ahụ wakporo obodo ahụ, gbara ọtụtụ ụlọahịa ọkụ, gbuo ọtụtụ anụmanụ ma gbuo mmadụ anọ.

    O kwuru na ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ebe ahụ ngwangwa ha nwetara ozi banyere mwakpo ahụ ma kwuo na ha amalitela ime nnyocha dịka ndị ọrụ nchekwa kwụrụ chịm igbochi ụdịrị mwakpo dị etu a ime ọzọ.

    Abiodun kwere ndị obodo ahụ nkwa na a ga-anwụchi ndị ojiegbe ahụ kpara mkpamkpa a ma weta udo zuru oke n’obodo ha.

  11. Ụtụtụ ọma ụmụ Igbo

    Ka chi fotere taa nwetere anyị na unu niile ihe ọma na obi anụrị dịka anyị na-anabata unu n'ọgbakọ BBC News Igbo.

    Anyị ji ọtụtụ akụkọ gbara ọkpụrụkpụ bịa taa bụ Mọnde 12 Jenụwarị, 2026 ma bụrụkwa ahịa Orie.

    Cheta sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ maka akụkọ foto na vidio anyị ji bịa taa.

    Nnọọ.

  12. Iran ekwuola na ha ga-awakpogwara Amerịka dịka ngagharịiwe na-aga n'ihu

    Mba Iran adọọla aka na ntị kwuo na ha ga-emegwara ma ọ bụrụ na Amerịka awakpo ha maka ọnwụ ndị na-eme ngagharịiwe.

    BBC chọpụtara na ndị ngagharịiwe achọghị ịma maka etu gọọmenti mba Iran si na-ejide ọtụtụ n’ime ha.

    A na-eme ngagharịiwe na mpaghara ruru otu narị dị icheiche na mba Iran.

    Ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ kamgbe e bidoro ngagharịiwe ahụ na-arị elu.

    Cheta na gọọmenti mba Amerịka adọọla aka na ntị kwuo na ha ga-awakpo mba Iran maka igbu ndị na-eme ngagharịiwe.

    Ọzọ bụ na e bidoro ngagharịiwe ahụ n’isi obodo Iran bụ Tehran tupu ọ gbasaa ebe ndị ọzọ.

    Ugbua ndị na-eme ngagharịiwe na-akpọ oku ka ọchịchị onyendu okpukpere ha bụ Ayatollah Ali Khamenei kposaa ma kwụsị.

  13. NDLEA jidere nwoke dị afọ 80 si nga pụta, maka ebubo ire ọgwụike

    Ụlọọrụ na-ebu agha megide ire ọgwụike na Naịjirịa bụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) kwuru na ha jidere otu nwoke dị afọ iri asatọ maka ebubo ire ọgwụike.

    NDLEA mere ka a mata nke a n'ozi onyeisi ngaraba mgbasaozi ha bụ Femi Babafemi kesere n'akara mgbasaozi ha n'ụbọchị Sonde, Jenuwari 11, 2026.

    N'ozi ahụ ka ha kwuru na nwoke ahụ na-ezo ọgwụike n’ime ihe a kpụrụakpụ e ji ere uwe nke a na-akpọ ‘mannequin’.

    NDLEA sị na ọ bụ mgbe ndị ọrụ ha wakporo ebe dị icheiche na Naịjirịa bụ ebe a na-ere ọgwụike ka ha jidere nwoke ahụ.

    N'okwu ha “Ọ bụ naanị afọ atọ garaaga ka a tọhapụrụ nwoke aha ya bụ Jeremiah Isaiah Nkanta na mkpọrọ”.

    “Nkanta dị afọ ire asatọ ugbua, mana a tụrụ ya nga n’oge garaaga maka ire ọgwụike, NDLEA ejidekwala ya ọzọ maka iso na-ere ọgwụike”.

    NDLEA jidere Nkanta n’Uyo Akwa Ibom steeti na Desemba 14, 2022, kpụpụ ya ụlọikpe tụrụ ya nga afọ abụọ.

    Mana NDLEA chọpụtara na ọ gara n'obodo ya bụ Mmanta Abak dị n’okpuru ọchịchị Abak n’Akwa Ibom Steeti na-erekwa ọgwụike nke mere e jidekwa ya na ọgwụike ruru 5.7kg n’ụlọ ya.

  14. Ọkụ ọgbụgba egbuola otu onye, meruo mmadụ 300 ahụ na mba Ọstrelịa

    Ọkụ na-agba unukwu ọhịa na mba Ọstrelịa egbuola mmadụ 300 ma gbuo otu onye.

    Ọkụ bidoro ịgba na steeti Victoria nakwa n’ebe New South Wales na-agba oke ala bara ụba.

    Steeti Victoria etinyela ọnọdụ gbatagbata dịta ndị na-agbanyụ ọkụ karịrị otu puku na ụgbọelu na-agbanyụ ọkụ na-agbambọ ka ha kwụsị ọkụ ọgbụgba a.

    Ndị mmadụ bi n’ọtụtụ obodo na steeti ahụ ka e nyere ndụmọdụ ka ha kwapụ ma gbaa ọsọ ndụ.

    Gọọmenti na-atụegwu na ọkụ ahụ nwereike na-agba site n’izuụka ruo izuụka na-akwụsịghị.

  15. Ndị na-eme ngagharịiwe n’Ịran na-aga n’ihu n’agbanyeghị atụmatụ gọọmenti igbochi ha

    Ndị na-eme ngagharịiwe na mba Ịran na-aga n’ihu na-eme ngagharịiwe n’agbanyeghị na gọọmenti na-achọ ịmachi ha. Akụkọ kwuru na ndị ọrụ nchekwa egbuola maọbụ merụọ ọtụtụ narị mmadụ ahụ n’ime abalị abụọ atọ gara aga.

    Vidio BBC nyochara kwuru gosiri ụfọdụ atụmatụ gọọmenti na-agba iji kwụsị ndị ngagharịiwe ahụ nke gụnyere ịmachi ịntanetị.

    Ọkaiwu ukwu Ịran bụ Mohammed Movahedi Azad nọrọ n’ụbọchị Satọde kwuo na a ga-ahụta onye ọbụla na-eme ngagharịiwe a nwụchiri dịka onye iro Chukwu nke ntaramaahụhụ ya bụ ikpe ọnwụ.

    E kwuru na a nwụchiela ọtụtụ ndị ngagharịiwe ahụ kemgbe ọ malitere n’izuụka abụọ gara aga.

    Ngagharịiwe ahụ ọ bụ oke ọnụahịa na ajọ ọnọdụ akụnaụba kpatara ya, efesaala n’obodo 100 na mpaghara Ịran niile. Ndị ngagharịiwe ahụ na-akpọ oku ka onyeisiala mba Ịran bụ Ayatollah Ali Khamenei rituo n’ọchịchị.

  16. Ụtụtụ ọma Igbo ndị be anyị

    Nnọọ n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Sọnde 11 Jenụwarị, 2026 ma bụrụkwa ahịa Nkwọ.

    Anyị ji akụkọ niile gbara ọkpụrụkpụ si Naịjirịa, Afrịka na mbaụwa bịa taa.

    Cheta sonyere anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, iji nweta akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Nnọọ!

  17. Abia 2027: Kalu, Orji ejikọtala aka ịkpa ịchụtu Otti

    Gọvanọ abụọ chịburu Abia steeti bụ Senetọ Orji Kalu na ogbo ya bụ Senetọ Theodore Orji, zutere n'ụmuakpata ịkpa etu ha ga-esi anapụ aka na-achị Abia Steeti bụ Alex Otti dịka ntuliaka afọ 2027.

    N'ọgbakọ ha nwere ụbọchị Fraide, Kalu kwuru na ihe ọgbakọ ahụ nke kpokọtara ndị chịrị na steeti ahụ n'agbata afọ 2009 na afọ 2023 bụ " Isi ihe anyị ji gbakọọ bụ na otu onye ga-adarịrị n'afọ 2027."

    Dịka ọ na-aza ndị ntaakụkọ ajụjụ, Kalu onye bụ Senetọ na-anọchịte 'Abia-North n'Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria kwuru na o nweghị ihe ọhụrụ aka na-achị steeti ahụ bụ Alex Otti meputara.

    " Ihe o merela bụ ịrugharị na itegharị okporoụzọ m rụrụ uhie."

    O kwuru na ego Otti na-enweta n'ọnwa anọ bụ ihe ya nwetara bn'afo asatọ dịka Gọvano.

    Mana Gọvanọ Otti asaala ndị na-akpa nkata ịchụpụ ya si na ụkwa ha na-abị na mkpụrụ adịghị ya.

    Okwuru ndị ka ọ na-agwa igwe ndị mmadụ okwu sị, "Ndị ihe anọghị n'ime na-etikarị mkpụ."

    "Ndị ọbụla gbakọrọ n'ihi m, ha ga-ekụsa."

  18. Gọvanọ Hope Uzodimma ehiwela otu nchekwa obodo n’Imo Steeti

    Aka na-achị Imo Steeti bụ Hope Uzodimma ehiwela otu nchekwa a kpọrọ Imo State Vigilante Organization.

    Nke a dị n’ozi Maazị Uzodimma wepụtara n’akara soshal midịa ya n’abalị Fraịde 9 Jenụwarị, 2026.

    Uzodimma kwuru na “e nwetala udo a chọsiri ike n’Imo Steeti, mana anyị ga-agba mbọ ụbọchị niile ime ka ọ dịgide”.

    Ọ kọwara na udo a abịaghị na mberede, kama ọ bụ mpụtara atụmatụ ndị a kpachapụrụ anya tinyegasịa, nke ebumnobi ya bụ ikepụta gburugburu dị mma maka azụmaahịa nye ụmụafọ na ndị na-agbakọrọ steeti ahụ aka.

    “Iji chịkọta atụmatụ ndị a niile, ehiwere m otu nchekwa Imo State Vigilante Organization, nke e kepụtara site n’iwu, ma nweekwa ndị ọrụ nke ngalaba nchekwa anyị zụrụ nke ọma, nke ebumnobi ya bụ iweta nchekwa n’akụkụ steeti anyị niile,” ka ozi ahụ kwuru.

    N’okwu ya, Uzodimma sịrị na ndị na-akpa arụ megide ụmụ mmadụ na-ebi n’etiti ha oge ụfọdụ, mana ọ gbara ndị ọrụ Imo State Vigilante Organization ume ka ha jiri ezi ọzụzụ e nyere ha mejupụta ebumnobi e jiri hiwe ha.

  19. Igbo ndị ọma, ụnụ abọọla chi

    Anyị ji obi aṅụrị anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọdee 10 Jenụwarị 2026.

    Biko, sonyekwara anyị na Facebook, Instagram nakwa Whatsapp Chanelụ, maka akụkọ gbasara ihe niile na-eme n'ụwa.

    Ya gazie!

  20. Manchester City azụọla Semenyo nde paunds 65

    Manchester City azụọla ọgbabọọlụ Antoine Semenyo n'aka otu egwu bọọụl Bournemouth nde paunds( £65 million).

    Nwaafọ Gana ahụ ga-agbara ha bọọlụ afọ ise na ma.

    Semenyo nyere goolu iri n'asọmpi Premia ligue nke afọ 2025.

    “O teela m ji elele Man.City n'okpuru Pep Guardiola,etu ha si akpa ike na Premia Ligue. O bu nnukwu klọb nwere okpoka ndi egwu, onye nchkọta ka ibe ya, ga-amasi m isonyere ha.”

    Guardiola b onye kwuru n'ezie na Semenyo na-agafeta Man,City kwuru si, "Onye ọbula ma di onye egwu Obu , etu o si agbara Bournemouth bọọlu n'uzọ puru iche n'afọ ole na ole gara aga."