You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Beer Belly: Gịnị na-enye ụmụnwoke 'afọ beer'?
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Ị bụ onye afọ 'beer' ka ị ma onye nwere afọ 'beer'? Akụkọ a bụ maka gị.
Oge agaala mgbe a na-ahụbu afọ ukwu dịka ihe na-egosiputa nwoke nwere ego; ugbua ọtụtụ ụmụnwoke na-atazi igwe 'gym' ịhụ ma afọ ha ọ ga-ata.
Ọtụtụ afọ ukwu ahụ anyị na-ahụ ndị nna anyị na ụmụnne anyị ndị nke nwoke na-ebugharị bụ ihe a ṅụtara na 'beer'.
Mana gịnị mere o ji bụrụ ụmụnwoke na-enwekarị 'afọ beer'?
Mmanya 'beer' na-ebu ihe Bekee na-akpọ 'calorie' bụ ihe mere mmanya ahụ ji ebu mmadụ ibu.
- N'ihi na ụfọdụ ụmụnwoke na-anọ otu ebe aṅụ ihe karịrị otu karama nke ọ na-abụ ha ṅụchaa ha agaghị agbatị ahụ nke Bekee kpọrọ 'exercise', ibu ahụ na-adọ ha n'afọ.
Mana n'ụmụnwaanyị, ibu ahụ na-agazu ha ahụ gaa dọrọ ha n'ukwu na ike ha.
- Ọzọ bụ na afọ beer na-eselite isi bido ihe dịka site n'afọ 35 gbagowe, mgbe ihe na-agbari nri a kpọrọ metabolism na Bekee jizi nwayọ na-agbada.
Mgbe ahụ nri anaghị agbarizi ọsịsọ etu o si emebu mgbe onye ahụ na-etolite etolite, nke bụ na onye na-anaghị emegharị ahụ ga-ahụ ka ya na afọ na-alụ ọgụ.
Ọ bụ naanị 'beer' na-eme ka afọ buo ibu?
Ọ bụghịkwa na ọ bụ naanị beer na-eme ka afọ mmadụ buo ibu, ibu afọ mmadụ na-ebu na-esikwa n'abụba na-ekweghị agbari agbari nke Bekee kpọrọ Visceral fat.
Ndị na-arịa ọrịa dịka ọrịa shuga, ọrịa obi nakwa ọrịa ndị ọzọ na-egbochi ngagharị 'insulin', nwekwara ike inwe afọ ukwu.
Ndị dọkịta na ndị ọkachamara n'ihe gbasara ịta ahụ na-ekwu na 'Visceral fat' a na-agbarinwu ma ọ bụrụ na ị gbanwee ụdịrị nri na-ebu afọ ị na-eri (nri nwere carbohydrates na shuga), wetulata aka na nri ị na-eri (portion control), ma na-agbatịkwa ahụ.
Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri a ga-amasị gị: