Akụkọ dị mkpa - Jenụwarị 13, 2026

Akụkọ dị mkpa - Jenụwarị 13, 2026

Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:

  • Donald Trump bụ Onyeisiala mba Amerịka amanyela ụtụisi 25% na ngwa ahịa a na-ebubata n'Amerịka si mba niile na-azụ mba Iran ahịa.
  • Trump mere nke a maka etu mba Iran si egbu ndị na-eme ngagharịiwe, dịka akụkọ na-ekwu na ndịagha mba Amerịka agwala Trump udiri mwakpo ha ga-eme mba Iran.
  • Ọtụtụ ndị bi n'Enugwu steeti etipula mkpu maka ọnọdụ enweghị ezi mmịrị ọnụnụ na steeti ahụ nke mere ha na-ejiri mmiri ala na adịghị ọcha na-eme ihe n'ụlọ ha.
  • Mana onye a maama na Gọọmenti Enugwu steeti gwara BBC Igbo na ha na-agba mbọ imezi ihe mebiri n'ebe e si ekesa mmiri na steeti ahụ.

Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.