You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Naijirịa, Legọs steeti gharịpụrụ ụmụnne m- Fada ụmụnne ya atọ nwụrụ n'ọkụ 'Great Nigeria Insurance'
Nwanne nnukwu nke ụmụnne atọ nwụrụ n'ọkụ gbara ụlọọrụ 'Great Nigeria Insurance' (GNI)bụ Fada William Omatu Eboola Gọọmentị Naijiria, ọkachasị nke Legọs steeti ebubo ịnọ n'ụlọ ewu amụọ n'ọgbụrị dịka ụmụnne ya atọ na ndị ọzọ ha nwụọ na-enweghị enyemaka ọbụla n'ọkụ gbara.
Onyeka Omatụ, gbara afọ 40, Nnabuike Omatu gbara afọ 39 na Kenechukwu Omatu gbara afọ 37, so na ndị nwụrụ n'ọkụ gbara ụlọelu ogogo 22 a na-akpọ GNI n'ịchafụ na mgbede abalị 24 nke ọnwa Disemba afọ 2025.
N'ozi ya n'akwamaozu ụmụnne atọ ahụ, nke e mere n'obodo ha bụ Ihiala n'Anambara steeti, Fada Omatu sịrị, " Ọ bụ ihe mmute na Naijiria gbaghapụrụ anyị."
"Ọ bụ ihe mwute na Naijiria Hapụrụ anyị."
"Gọvanọ Legọs steeti, Ị gbaghapụrụ anyị."
Fada William tụrụ arịrị na ndị ọrụ mmanyụ ọkụ enyeghị aka ka o kwesịrị ma hapụ ọkụ ahụ ka ọ gbaa ọtụtụ ụbọchị na-enyenyụghị ya.
"Ọkụ ahụ malitere n'ụbọchị 24 nke ọnwa Disemba, ọkụ ahụ gbara abalị 25, 26,27,28,29,30, 31, ebe ka gọọmentị nọ?"
Fada boro ebubo na-ewezuga ụmụnne ya atọ, na ndị ọzọ nwụrụ karịrị 100.
Mana oge Gọvanọ Legọs steeti bụ Babajide Sanwo-Olu gara nle ta abalị asatọ gachara ọkụ ahụ ji gbawa, o kwuru na ọ bụ mmadụ asatọ nwụrụ n'ọdachi ahụ.
Cheta na ụmụnne atọ so na ndị ji ekwentị zipụrụ ozi itimkpu enyemaka dịka ha tọrọ n'ime ụlọọrụ ahụ gbara ọkụ ọtụtụ abalị ụlọọrụ ahụ malitechara gbawa ọkụ.
'Mmadụ asatọ nwụrụ n'ọkụ 'Great Nigeria Insurance' - Sanwo-Olu ka ọ gara nleta abalị asatọ ọkụ gbachara
Aka na-achị Legọs steeti-Babajide Sanwo-Olu agaala nleta n'ụlọọrụ 'Great Nigeria Insurance' gbara ọkụ ọ gachara abalị asaa.
Ọ nọrọ ebe ahụ gbaa ama na ọ bụ mmadụ asatọ nwụrụ, ebe a zọtara ndụ mmadu 13.
Ọkụ gbara ụlọọrụ ogogo 22 na Martin Streeti dị na Lagos Island, Legọs n'abalị foro ụbọchị Ekeresimesi(24/12/2025) n'ebe Elekere isii nke mgbede.
Sanwo-Olu onye gbara ama na ezinaụlọ mmadụ ise n'ime ndị nwụrụ kọtanwuru ndị nke ha, nyere ntuziaka ka eme nnyocha DNA iji mata ozu atọ ọkụ gbara nke na amaghịzị ndị ha bụ.
Ndị nwụrụ na ihe mberede ọkụ ọgbụgba ahụ gụnyere ụmụnne atọ si n'otu afọ nakwa onye ojiegoachụego na ndị ọzọ tọrọ n'okpuru ụlọ ahụ abalị ole na ole ka ọkụ ahụ gbachara.
Ọtụtụ ngwahịa dara nde kwuru nde memilakwara n'ụlọọrụ nke e ji ụfọdụ ogogo mere ụlọ nkwasa ngwahịa.