Kedu ọrụ mmanwụ na-arụ n'omenala Igbo?

    • Onye dere ya, Marvelous Obomanu
    • Ndị mere akụkọ a, Journalist
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Dịka akụkọ mwakpo mmanwụ mere ụfọdụ ndị mmadụ ewu n' ịntanetị, ajụjụ ụfọdụ ndị mmadụ n'ajụ gbasara ihe a mere n'ala Igbo bụ kedụ ihe bụ ọrụ mmanwụ na obodo?

Na nso nso a, ihe onyonyo fegharịrị gosiri ebe otu nwaanyị kpọnyere mmanwụ ọkụ n'ihi na mmanwụ ahu ji okute tiwa nwa ya nwoke isi.

Ihe a mere na obodo Obollo dị na Mbano nọ n'Imo steeti.

N'ebe ọzọ, mmanwụ ji oche kụsara ọgbakọ n'ihi mmemme e mere n'Anambara steeti. ,

Ufọdụ ndị mmadụ katọrọ omume nwannyị ahu, ebe ndị ọzọ jara ya ike maka akparama agwa ya.

Lee ọrụ mmwanụ dịka ọkachamara si kọwaa ya:

Gịnị bụ ọrụ mmanwụ na obodo?

Ọkankụzi Chigozie Nnabuihe kọwara na mmanwụ pụtara "mmụọ ọnwụ maọbụ mmụọ ndị nwụrụ anwụ".

Mmanwụ bụ ejije ọdinala dị nsọ bara uru n'ala Igbo.

Ọ kawara na mgbe ọbụla mmanwụ pụtara, ndị Igbo na-ahụta ya dịka mmụọ ndị nne na nna ha ochie biri n'ala mụọ ma pụta n'ala ndị dị ndụ ka ha na ndị nke ha dị ndụ nwe mmekọrịta.

Ọ kwuru na mmekọrịta ahụ bụ nke bara uru bụrụ nke bara ndị mmadụ ụrụ mana ugbua kedụ ndị na-agba mmanwụ ugbua?

Nnabuihe gara n'ihụ ma kọwa uru mmanwụ bara nke gunyere:

  • Omenala a na-eji azụpụta okorobịa ịbụ ezigbo mmadụ, ma na omumme, mana ịdị ike- ịdị ike nke ọkpụkpụ aka, nke obi, inwe akọnụche, amamihe, nghọta zuru oke nakwa inwe uche e ji eme ihe.

2. "Ndị mmanwụ na-eso achịkwa obodo nakwa na-echekwa omenala"

Ikpe ikpe n' obodo gbasara nsogbụ ọbụla nke ezinaụlọ maọbụ ndị obodo agaghị ekpeli, ọ bụ mmanwụ bụ onye a ga-agbakwuru ka o kpe ikpe ahụ.

3. Tupu okpụpkperechi ụka Kraịst abịa, mmanwụ na-enye aka ka udo dị, agwa ọjọọ beleta nakwa ka ọchịchị

E nwere mmanwụ ndị na-apụta n'ehihe nakwa na-abalị.

Kedụ nsọ dịrị mmanwụ

Ọkammụta Nnabuihe kọwara na mgbe elu bụ ala ọsa tupu efe m Chukwu na ndịụka Kraịst abata, mgbe a na-asọpụrụ mmanwụ, e nwere ọtụtụ nsọ a na-enye mmanwụ mana ugbu a ihe ndị a ahụ adịghi.

A na-enye mmanwụ nsọpụrụ a na-enye mmụọ maka a na-ahụta mmanwụ ka mmụọ. A na-enye mmanwụ nsọpụrụ na ugwu.

"E nwere ezinaụlọ mmanwụ. Tupu mmadụ agba mmanwụ, onye ahụ ga-abụ onye anya ruru ala, a zụrụ ọfụma mana ugbua onye ọbula na-agba mmanwụ."

Mmanwụ ọ na-elu okute ma ọ bụ na-achụ ọsọ?

Mmmanwụ na-achụ ọsọ mana ọ bughị ịchụ ọsọ ịji gbuo mmadụ kama ka udo dị dịka Ọkamụta Nnabuihe si kwuo.

O nyere ọmụmatụ na ndị uweojii na-achụpụ ndị mmadụ bụ iji weta udo n'obodo.

Nnabuihe fufere isi na ndị na-agba mmanwụ ugbua bụ ndị na-amaghị ihe igba mmanwụ pụtara ya mere eji ahụ akparama agwa dị iche iche ndị na-agba mmanwụ na-akpa.

"Mgbe ala bụ ala ọsa, kedụ onye obi siri ike ga-aba mmanwụ ọgụ maọbụ kụọ ya ihe karịsịa, iche echiche ịmụ ya ọkụ?"

"Tupu omenala emebie, kedụ mmanwụ na-atụ mmadụ okute? Mmanwụ n'elụ okute abụghị ezigbo mmanwụ"

Ọ sị na ugbua onye ọbụla na-etị mmanwụ mana mmanwụ ma onye bụ mmanwụ dịka ọ tụrụ ilu sị na ,'onye ọbụla ji ọfọ, mana ọfọ ma onye ji ya."

"Omume ndị mmadụ ugbua emetọla omenaala Igbo nke na-agba anya mmiri."

Nnabuihe sị na mmanwụ ahụ tụrụ mmadụ okute abụghị ezigbo mmanwụ, na ọ bụ nke mmadụ mere.

"Ya bụrụ na mmanwụ ahụ bụ ezigbo mmanwụ, nwaanyị ahụ kpọrọ mmanwụ ọkụ agaghị alafere maka na ọ bụ arụ"

"Mmanwụ ekwesịghị ikụ mmadụ ihe maka mmanwụ anaghị akụ mmadụ ihe"