You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abule Ado Explosion: Onye bụ Henrietta Alokha nke Bethlehem Girls?
A na-ekwu na mberede nyiri dike mana ọ bụ mberede ka eji ama dike.
Nke a bụ atụmaatụ ụmụ ụwa hụrụ n'ebe Reverend Sister Alokha Henrietta bụ onyeisi ụlọ akwụkwọ sekọndiri Bethlehem Girls nọ.
Alokha nwụrụ n'ihe n'ọkụ ọgbụgba mere na Abule Ado, dị n'akụkụ Festac ebe ọ na-azọpụta ụmụakwụkwọ ụlọakwụkwọ ahụ ka ọkụ ghara ịgbagbu ha.
Mana lee ihe ndị ọzọ ụmụ ụwa ji eto dike nwaanyị a lara mmụọ.