Coronavirus in Nigeria: Mmadụ ise ọhụrụ ebutela coronavirus na Naịjirịa

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Mmadụ ise ọhụrụ ebutela ọrịa coronavirus na Naịjirịa.

Ngalaba mgbochi ọrịa bụ 'National Centre for Disease Control' kwupụtara nke a n'ụbọchị Wenezde.

Nke a pụtara na ndị butere ọrịa coronavirus na Naịjirịa eruola asatọ.

Abụọ n'ime asatọ a agbakeela.

Ụlọọrụ NCDC kwuru na mmadụ ise ọhụrụ mere njem gaa mba Briten maọbụ Amerịka.

Ọbụghị n'aka onye mbụ bubatara ọrịa ahụ ka ha si bute ya.

Ha kwukwara na ha na-agba mbọ ugbua ịchọpụta ndị niile ha na ndị ahụ mekọtara ahụ kamgbe ha lọtara.

Nke a na-abịa dịka gọọmentị Naịjirịa machiri ndị si mba ebe coronavirus ka njọ ịbata na Naịjirịa.

N'ọgbakọ 'Federal Executive Council' n'ụbọchị Wenezde ka a nọrọ nwee nkwekọrịta a.