You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu nwoke bụ 'Knight' si jụ ụka Kraistị n'iwe n'ihi Ifeanyị Ubah dịka a gbapere ụlọụka 'Nnewi Catholic Cathedral'
Otu nwoke ajụla nkwenye ya dịka onye otu Kraisti dịka e mere mmemme mgbape Ụlọụka "Our Lady of Assumption Cathederal, Nnewi n' nsonso a.
Sir James Louis Okoye, onye Okpuneze Nnewi dị n'Okpuru Ochichi Nnewi-North, nọrọ n'ogige ụlọụka a ma ama dịka 'Okwuana' kwupụta na ya agbahapụla okpukperechi ụka Kraist n'ihi iwe na a kwanyereghị Senetọ Ifeanyi Ubah ugwu pụrụ iche n'emume ahụ.
Senetọ Ifeanyị Ubah, onye bụbụ Senetọ na-anọchite Anambra-South n'Ụlọọmeiwu Ukwu Naijiria , onye nwụrụ n'afọ 2024 bụ onye a malitere owuwu ụlọụka ahụ ma nye ya nnukwu nkwado ego oge ọ dị ndụ.
N'ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia, Sir Okoye kwuru n'iwe sị, " "Akachala m." "Nke a bụ ụbọchị ikpeazụ dịka onye otu KraistI".
"Ọbụladị ka mkpuru obi Ifeanyi Ubah) zuru ike na ndokwa, ị nụrụ ya?"
Nwoke ahụ a ma ama dịka 'Jalou' ji onu arịrị ga n'ihu sị, "Ka anyị kpọọ ihe ọjọ ihe ọjọọ. Ụkwụ m na-emetụ ala Okwuana dịka m na-ekwu ya, Ifeanyị Ubah , ndo o!."
Ka o kwuru nke , ọ kụchaa akpụkpọ ụkwụ ya aja, kpupụ oku 'knight ya; zọwara pụọ n'ogige ụlọụka ahụ.
Ihe Katọlik Dayosis Nnewi sara n' okwu a
Ụka Katọlik na Nnewi Dayosis ekwuola na ọ bụghị eziokwu na a kwanyereghị Ifeanyi Ubah ugwu n'ofufe nro e mere iji gbapee ụlọụka ọhụrụ ahụ.
Na mkparịtaụka nke BBC na ọnụ na-ekwuru dayosis ahụ bụ Fada Martin Onwudiwe nwere n'ekwentị, o kwuru na " Nke bụ eziokwu bụ na ọ bụrụ na i gee ntị nke ọma oge Bishọpụ Jonas Benson Okoye na-ekwu okwu,ọ kpọrọ aha kpọmkwem na ọ bụ Bishọpụ bu ya ụzọ malitere ịrụ ụlọụka ma kpọkwa aha Ifeanyi Uba lara mmụọ dịka onye nyere nnukwu nkwado."
"Ikekwe, nsogbu onye 'knight nwere bụ na ọ nụghị ka a kpọrọ oku dere ji otu nkeji maọbụ ekpere ka mkpụrụobi ya laa na ndokwa."
Ọ gara n'ihu kwuo na ụka Katọlik agaghị ahapụ nwa amadi ahụ ka o were iwe gbakụta Chukwu azụ.
Fada Onwudiwe sịrị,"Anyị bụ Ụka Katọlik, ọrụ anyị bụ ime ka mmadu nile na Chineke dozie."
"Anyị agaghị ahapụya ka o jefuo n'ihi ihe ahụ ọ tụrụanya mana ọ hụghị ya."
Ndị ma ihe ekwe na-akpụ na Nnewi gwara BBC na ọ bụ Ifeanyi Ubah malitere iwu ụlọụka ahụ oge ọchịchị Bishọpụ Hilary Okeke site na nukwu nkwado ego ma chọọ iwulite ya naanị ya tupu Bishọpụ nọ n'oche ugbua bụ Bishọpụ Jonas Okoye weghara ọkwa.
Etu mmemme mgbape Ụlọụka ahụ si gaa
Ndị ukwu na ndị nta gụnyere Gọvanọ Anambra steeti,bụ Charles Soludo, Onye zọburu ọkwa Onyeisiala Naijiria bụ Peter Obi, Bishhọp ụka Katoli bụ Ezeokafor na ọtụtụ ndị ụkọchukwu tụrụ ka igwurube n'ofufe nro iji hafee ụlọụka 'Our Lady of Assumption, Nnewi n'aka Chineke.